New Artisan Market: Ọgbaghara ọhụrụ amalitela n'ogige ndị na-ere anụmamụ n'Enugwu

Dịka onye ntaakụko BBC nọ agba ndị na-ere anụmanụ n'Enugwu ajụju ọnụ maka ihe mere na New Artisan ụnyaahụ, ọgbaghara dakwara ebe ahụ ọzọ.
Amabeghị ndị kpatar okwu a mana ọ bu n'ogige ndị Hausa na-ere anụmamụ ka onye ntaakụkọ BBC Igbo nọ tupu ọ hụ ka ndị mmadụ na-agba ọsọ.
Ka ọ jụrụ ajụjụ, otu onyeisi ndị ugwu ahụ na-ere anụmanụ gwara ya na o nwere ndị na-awakpo ndị otu ha.
Nwoke ahu kwuru na ndị a na-eme mwakpo ahụ ji mma ma nọdụ n'okporo ụzọ.
Onye ntaakụkọ BBC gbara mbọ ka ọ hụta ihe na-eme mana ndị ahụ wara ọgụ abịa bịasiwere ike nke mere o jiri si ebe ahu pụọ.
Lee ihe onyonyo ya nwetere tupu ọ kwụsị igosi ihe na-eme n'ogige ahụ:
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 1
Ebe niila adaala juu n'ogige ahịa New Artisan di n'Enugwu dịka ndị na-ere anụmanụ na ndị bịara ikutu ahịa ahụ nwechara esemokwu butere ọgbaghara.
Dịka ndị hụru oge o mere gwara BBC Igbo na ọ bu oge ndị amabeghi ndi ha bụ bịara imalite ịkụrịsị ụlọ ahịa n'ahịa ahụ ka ndị na-azụ ahụ ka ndị na-azụ ahịa ebe ahụ - nke ọkankụ ha bu ndi ugwu - malitere nyenwe nsogbu.
Ndị agha Naịjirịa mechara soro ndị uweojii bata n'ahịa Artisan dị n'Enugwu ma na-agbali egbe elu ịchụsasị ndị na-eme ọgbaghara ebe ahụ.
Cheta na BBC Igbo nụrụ na ndị na-azụ ahịa ehi achụọla ndị gọọmentị Enugwu ọsọ n'ahịa Artisan.
Ndị ahụ nọchikwara okporoụzọ e si abanye ahịa ahụ ugbua ma gbaa ọtụtụ ihe ọkụ ebe ahụ.
BBC Igbo nọ ebe ihe ahụ na-eme, kirie ya ebe a n'uju
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 2
Ihe Gọọmentị Enugwu na ndi uwojii kwuru mala ọgbaghara a
N'akwụkwọ ozi Onye ndụmọdụ maka Mgbasaozi nke gọvanọ Enugwui steeti bụ Steve Oruruo binyere aka, gọọmentị steetị ahụ kwuru n'aka ha adịghị n'ọgbaghara a dara n'ahịa Artisan.
Gọọmentị Enugwu sị na nke bụ eziokwu bụ na ha gwara ndị isi ahị a New Artisan maka njem ndị bịara mezu ikpe ulọikpe nyere banyere ala ahụ ha sị bụ nke Igwe Gabriel Nnaji - nke e ji Nwajanja mara.
Ha si na ha gbara mbọ site n'ịchọrọ ndị ahịa New Artisan ebe ọzọ ha ga-anọ were zụwa ahịa mana ụfọdụ n'ime ha ekweghị ịpụ.
Akwụkwọ ozi ahụ mechara kwuo na obi adịghị gọọmentị mma maka mmebi ihe ndi mmadụ ọgbaghara ahu dara na New Artisan butere ma kwuo na ha ga-aga n'ihu n'ịgba mbọ hụ na ndị niile bi Enugwu bi n'udo n'agbanyeghị ebe ha si.
Daniel Ndukwe bu ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu kwukwara na ha nwụchịrị mmadụ ise aka ha dị ọgbaghara a.
Ọ sịkwa na ha na-aga n'ihu ime nnyocha mata ndi ọzọ aka ha dị na ya bu mkpa mkpa butere imeru ndị mmadụ ahụ nakwa imebi akụnaụba, nke gunyere ụgbọla n'ụzọ si Enugwu gawa Pọt Hakọt.
Maazị Ndukwe kwenyere n'ihe gọọmentị kwuru, na ọ bụ ndị bịara imezu mkpebi ụlọikpe na ọ bụ ezinaụlọ Nwajanja nke Akpugo dị n'okpuru ọchịchi Nkanu East ka ndi nọ n'ahịa bara ọgụ malitere ọgbaghara a.
Lee foto ndị si n'ogige ahụ pụta:



























