Gịnị mere ụmụ Naijiria na-agbagha ọnụọgụgụ coronavirus NCDC na-ewepụta?

Ebe foto si, Getty Images
Kemgbe abalị ole na ole gara aga, mpụtara ngụkọ 'National Centre for Disease Control (NCDC)' ọnụọgụgụ gbalitere n'ụzọ pụrụ iche, ụmụ Naijiria ji enyo ele ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naijiria.
Nke a bụ n'ihi ngụkọ ha wepụtara n'abalị anọ nke ọnwa Ọgọstụ nke gosiri na mmadụ 11,118 gbakere n'ọrịa coronavirus n'otu abalị dịka o ha kwuru na mmadụ 31851 agbakeela kemgbe ọrịa coronavirus ji bata Naijiria.
N'abalị atọ nke ọnwa Ọgọstụ, NCDC wepụtara mmadụ dị 20663 dịka ndị gbakerela n'ọrịa coronavirus.

Ebe foto si, NCDC
Ya bụ nnukwu mgbanwe gbara ọtụtụ mmadụ baa, ma mee ka ụfọdụ kwuwe na o nwere ike ịbụ ndehie.
Mana ka otu abalị gara NCDC na ndị ọrụ ya ekwughị na o nwere ndehie ọbụla ha mere, ụmụ Naijiria bidoro ntamụ, ụfọdụ na-ajụ ebe akatamkpo ọnụọgụgụ ahụ si.
Ihe kachasị gbagwojuo ndị mmadụ anya maka ngụkọ ahụ bụ na ọtụtụ ndị ahụ a sị gbakere si na Legọs.
Malachy Ani, onye ihe gbasara ngụkọ ego doro anya sị na "ndekọ ahụ ha na-enye anyị abụghị ezi ya, ọ dịka wayo".
Anị gara n'ihu sị , "Ndepụta ngụkọ na-ele ya kwa ụbọchị dị iche n'ụzọ pụrụ iche na nke a na-edepụta kemgbe ọrịa coronavirus batara Naijiria." ka o kwuru
"O nwebeghị ụbọchị iri mmadụ ise gbakere n'otu ụbọchị, kedụ ka mmadụ karịrị puku iri na otu si gbakee n'otu ụbọchị."
"Ihe o gosiri bụ na ndị na-enye anyị ngụkọ a anaghị etinye anya n'ọrụ."
Ani jụrụ ajụjụ sị, "Ọ bụrụ eziokwu na ndị ahụ gbakere n'ezie, a sị ha lawa, kedụ ebe ndị ahụ si were la."
Data kwesịrị inye anya aka n'ịtụ alo, mana ụdị ngụkọ onweghị ihe anyị ga-eji eme."
Ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwukwa otu ahụ na soshal midia.

Ebe foto si, Ademisoye Alawode Awoyemi/Facebook
Ụfodụ na-ebo gọọmenti ebubo ime wuruwuru, o nweghị mgbe ọrịa ji dị na Naijria kama ndị ọrụ gọọmenti ji ụgha a kpara ego.

Ebe foto si, Mar Shal/Facebook

Ebe foto si, Mar Shal/Facebook

Ebe foto si, Mar shal/Facebook
Ndị ọzọ na-ekwu na ọ dịka ego a mapụtara maka ibu agha megide coronavirus agwụla nke mere ka ndị ọrụ gọọmenti ọ dị n'aka ji agwọkọ ngwongwo ha.
NCDC kọwara na ọtụtụ ndị ndị gbakare na Legọs bụ ndị a nọ n'ụlọ ha eleta.
Onyeisi NCDC bụ Chikwe Ihekweazu kwuru na nsonso dịka ndị mmadụ na-adọrịta ụka ebe 11,1888 si na, NCDC nyere steeti ga-ugboro ha ga-agbaso maka ileta ndị bu ọrịa n'ụlọ ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Otu n'ime ọnụ na-ekwuruchitere onyeisi NCDC bụ Emeka Oguanuo gwara BBC na ndị ahụ gbakerela sokwa n'ọnụọgụgụ ndị e kwuburu na ha butere nje coronavirus.
Akụkọ ga-amasị gị:
- Ihe nwaanyị na nwoke kwesịrị ịma maka etu e si agbakọ 'ovulation'
- Angela Nwosu sị ndị Pastor na-eyikwa 'waist beads'
- Tupu ị fepụ mba ofesi, lee iwu Emirates, Etihad, Kenyan Airways na ụgbọelu ndị ọzọ tinyere ọhụrụ
- Uju Onwudiwe ebola omeiwu ibe ya ebubo iji karama lụsa ya ọgụ n'Imo steeti
- Etu Stella Immanuel si kwuo maka Hydroxychloroquine na Zithromax ezighi ezi- Ndị Dọkịta Naijirịa
- Ndị Igbo sị na ha abụghị Igbo na ihe kpatara ya









