Ebola in DR Congo: Ebola arịpụtala isi ọzọ ebe ahụ abalị abụọ WHO chọrọ ịnye ha nturu ugo maka imeri ya bụ ọrịa

DR Congo na Ebola

Ebe foto si, Reuters

N'Afrịka, ụbọchị abụo ka ọ fọrọ ka World Health Organisation (WHO) welie mba DR Congo aka elu dịka mba nwegooro onwe ha n'aka ọrịa Ebola, ya bụ ọrịa esepụtala isi ọzọ na mba ahụ.

Echi bụ Sụnde ka WHO na-akwado inye ha ntụrụ ugo dịka mba chụrụla ọrịa Ebola ọsọ ụkị̀ụ eruala.

Mmadụ puku atọ, na narị anọ bu ya bụ ọrịa ebe mmadụ puku abụọ na narị abụọ nwugoro na ya kemgbe ọ pụtara afọ abụọ gara aga na mba ahụ.

Aubameyang na-agba ọnyụpa

Pierre-Emerick Aubameyang

Ebe foto si, Getty Images

" Pierre-Emerick Aubameyang kwesiri ịba n'otu bọọlụ ga-ebuli ya elu"

Onye kwuru nke a bụ onyeisi egwuregwu futboolụ nke mba Gabon na-agwa ndị ntakụko were sị na kamgbe Aubameyang gara arsenal na onwetabeghị ihe nturu ụgo obụla n'ihi na dịka arsenal na-agba ọnyụpa, Aubameyang so kwa ha agba ọnyụpa.

Gee akụkọ ndị na na ndị ọzọ ebe a

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile