Enugu LGA Elections: Ihe mere PDP ji zakọrọcha ọkwa na ntuliaka e mere n'Enugwu Steeti

Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka n'Enugwu steeti bụ Enugu State Independent Electorial Commission (ENSIEC) ekwuola na ọ bụ pati People's Democratic Party (PDP) meriri na ntuliaka niile e mere na Satọde bụ ụbọchị 29 nke ọnwa Febụwarị.
Agbanyeghi na ntuliaka a gara n'udo dịka BBC hụrụ n'anya, otu n'ime mmadụ abụọ n'azọ ọkwa onyeisi pati All Progressives Congress (APC) na steeti ahụ bụ Okey Ogbodo gwara BBC na pati ha esoghi na ntuliaka ahụ.
N'iza ajụjụ maka ndị APC aha ha dị n'akwụkwọ ntuliaka, Maazị Ogbonna sị na ndị a abughị ndị APC.
Ọ sị; "Ndị ahụ bụ ndị APC n'ehihe ma bụrụ PDP n'abalị."
Ogbonna gara n'ihu kwuo na ntuliaka ahụ adabaghị makana ọ bụghị oge e kwesiri ime ya ka e mere ya.
N'okwu ya, Ogbonna sị na ọ bụ mgbe oge ndị ọchịchị gwụrụ n'afọ 2019 ka ndi ọhụrụ kwesịrị irigoro n'ọkwa.
"Ndị PDP were ndị ha kpọrọ "Transition Commitee Chairmen" tinye n'ọkwa. Iwu obodo megidere nke a"
Ọ sị na ọ bụ nke a mere pati ya jiri gbajụọ isonye mee ntuliaka.

Ihe ndị PDP na-ekwu
Dọkịnta Uche Uzochukwu so na ndị isi PDP n'okpuru ọchịchi Ọgwụ gwara BBC na ya amaghi ihe onye APC na-ekwu makana etu ya si hụ ntuliaka ahụ, o gara nke ọma.
Ọ sị, "Na Nkwe be anyị, ebe m nọ tụọ vootu, ndị mmadu pụtara n'igwe bịa kwado PDP. Ndị APC pụtara enweteghi otu vootu."
Dọkịnta Uzochukwu sị na ọ bụ makana PDP na-eme ọfụma mere ndị mmadụ ji akwado ha nke ukwuu n'Enugwu.
Onye na-anọchite mpaghara Ọgwụ n'ụlọomeiwu nke Enugwu steeti bụ Johnson Chukwuobasi kwenyekwara n'ihi Dọkịnta Uzochukwu kwuru.
Omeiwu Chukwuobasi sị, "O nwere onye be anyị, onye Mmaku, so zọọ ọchịchị n'aha APC, ọ chịtaghị aja maka na ọ bụ PDP ka ndị ebe anyị na-akwado."

Ebe foto si, Nwabueze Nwonwu
'Ihe mere PDP ji merie ebe niile'
Dọkịnta Uzochukwu sị na aka na-achị Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi na-eme ọfụma nke mere ndị mmadụ ji sị ka PDP chịrị gawa.
Ọ sị, "Agaghị m asị na ọ bụ makana APC anaghị achịta na gọọmentị etiti mere ka ndị mmadụ na-akwado PDP, makana steeti dị iche iche. Nke bu eziokwu bụ na PDP na-eme ọfụma n'Enugwu site na gọọmenti Ifeanyi Ugwuanyi."
Omeiwu Chukwuobasi rụtụrụ aka n'usoro Bekee kpọrọ zoning, bụ atụmatụ PDP na-eso n'Enugwu, dịka otu ihe mere ndị mmadụ jiri akwado patị ahụ.
Ọ sị, "Zoning na-enye aka. Dịka ugbua, onye meriri ịbụ onyeisi ọchịchị ime obodo bụ onye Ọgwụ, onye rituru n'ọkwa bụkwa onye mpaghara ọzọ. Etu a ka e si eme ya."
Atụmatụ "zoning" a malitere n'Enugwu kamgbe Chimaroke Nnamani bụ gọvanọ steeti ahụ.
Ya bụ atụmatụ metụtakwara etu e si a họpụta ndị ọchịchi Bekee kpọrọ "Councillor"
Ebe APC kwụ
Okey Ogbonna na-ekwusi ike na aka pati ya adịghị na ntuliaka ahụ, ma na-ekwukwa na ya nwere olileanya na ndịisi pati ha no n'Abuja ga-aghọta na ọ bụ ya ka "ụlọikpe kpebiri dịka onyeisi APC n'Enugwu kpọmkwem."










