Benue na Imo steeti ọ n'izu ichutu ndị ọrụ ha
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:
Akụkọ na-efegharị ụgbua bụ na mmadu iri na itoolu ndị ụlọomeiwu Imo steeti achụtuola osote gọvanọ Imo steeti bụ Eze Madumere.

Ebe foto si, Channels TV
BBC Igbo gbara onye ndụ ndị ụlọomeiwu Imo Steeti bụ Lugard Osuji ajụjụọnụ, o kwuru na Onye nọchiri anya ya bụ Calistus Okenze bụ onyeisiọrụ n'Imo Steeti dịka Rochas zigara aha ya.
O kwuru na mmadụ iri na itoolu n'ime mmadụ iri atọ na asaa ndị ụlọomeiwu tinyere aka chụtuo ya.
Naịjirịa
Ndị omeiwu nọ n'otu pati PDP na Benue steeti akwụsịla ndị otu ha mmadụ asaa nọ APC ọrụ n'ike.

Ebe foto si, AFP
Ndị omeiwu PDP ahụ ruru mmadụ iri na itoolu na-akwụsị ndị otu ha ọrụ maka ime omume megide ụlọikpe na ime ọgbakọ megidere iwu.
Ndị PDP ahụ kwuru na ọgbakọ ndị APC mere megidere iwu maka na ha erubeghi isi nye mkpebi ụlọikpe nyere ka ha ghara ịga onye bụbụ onyeisi ha bụ Terkimbi Ikyange nso.
Akụkọ mba ofesi
Igwe mmadụ pụtara na Zimbabwe ịtụ vootu na ntuliaka mbụ ha na-eme kamgbe Mugabe pụrụ n'ọkwa ọchịchị.

Ebe foto si, AFP
Ndị si mba ọzọ bịara ileta ya bụ ntuliaka toro ya na ọ na-aga nkeọma ebe ha na-enwe olileanya na ọ ga-anapụta ndị Zimbabwe n'ọnọdụ ha nọ.
N'egwuregwu,
N'egwuregwu, mba Kameroon na onye na-akụziburu otu egwu bọọlụ mba Ịnglandị bụ Sven Goran Eriksson na-akpa ka Eriksson kuziwe otu egwuregwu bọọlụ ha bụ Indomitable Lions.

Ebe foto si, Getty Images
Ihe niile gaa nke ọma, ị mara na ọ ga-anọchi anya onye nkuzi ha pụrụ apụ bụ Hugo Broos.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa:











