Akụkọ dị mkpa na mgbede a: Amerịka na Iran a ga-aga agha?
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ụmụakwụkwọ mahadum Nnamdi Azikiwe na-eme ngagharị iwe maka ọnwụ otu onye n'ime ha bụ Francis Mmadubuobi.
Iwe ha bụ na ụlọọgwụ nke ụlọakwụkwọ ha agbataghịrị Francis ọsọ enyemaka oge ha bugara ya ebe ahụ mgbe ọ tụbọrọ.
Francis kwesiri ide ule ikpeazụ ya taa wee nwụọ ụnyaahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi ndị agha ụgbọelu Naịjirịa bụ Sadique Abubakar ekwuola na ha bụ ndị agha na-eme ihe niile dị n'ike ha ịhụ na e meriri agha ha na ndị Boko Haram.
Cheta na ndị n'eyi ndụ egwu bụ Boko Haram wakporo ụlọ okpukpe ndị alakụba n'ụzụ ụtụtụ taa mgbe ha na-ekpe ekepere.

Ebe foto si, Reuters/AFP
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na onyeisiala ibe ya nke Iran bụ Hassan Rouhani na-ama aka.
Rouhani kwuru na Amerịka chọọ ilụso Iran ọgụ na ọ ga-abụ agha ọkaibe mana Trump sara ya sị na ha ga-ata ahụhụ dịka ibe ha tara ma ọ majaa Amerịka ọzọ.

Ebe foto si, Enyimba FC
Akụkọ na-eru anyị ntị n'egwuregwu ugbua na-ekwu na onyenkuzi otu egwuregwu bọọlụ Enyimba esila n'ọkwa ya ritue.
Paul Aigbogun bụkwa onyenkuzi otu Naịjiria bụ Flying Eagles kwuru na ọ bụ ihe masiri ya ka o ji kpebie ya bụ ihe.
Gee nkeji nke mgbede a:










