Buhari: Ekwughị m ihe ọjọọ maka Biafra

Ebe foto si, Getty Images
E wepụtala ihe nkiri na-egosi ihe onyeisiala bụ Muhammadu Buhari kwuru mak agha Biafra n'igwe okwu twita.
Ndị ụlọọrụ Buhari gwara ndị mmadụ ha eji na ihe ọ bụla ndị mgbasa ozi na-emegharị mmadụ anya kpọrọ ihe.
Lee ya ebe a:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Otu''Indigenous People of Biafra'' Ipob n'ịchafu nakwa ''Movement for the Actualisation of Sovereign State of Biafra'' (Massob) n'ichafu a katọọla okwu onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru maka agha Biafra.
Onyeisala Buharị kwuru na Yakubu Gowon bụ onye amị chịrị Naịjirịa mgbe agha Biafra rịọrịọ ndị agha ha mgbe ahụ ha emesikwala ndị Igbo ike.
Onye nkwuchite ọnụ Ipob bụ Emma Powerful na onyeisiala ekwughị nke bụ eziokwu mgbe o kwuru na ndị agha Naịjirịa mere ụmụ biafra ebere.
Powerful kwuru na ndị agha Naịjirịa gburu ọtutụ ụmụ Biafra mgbe alụrụ agha Baifra na eleghị anya n'azụ.
Onyeisiala Naịjirịa kwuru okwu a na mmụmmụ ndị Red cross mere n'obi ya n'Abuja.
N'aka ọzọ, nwafọ Igbo bubu minista ahụike bụ Prof. Alphonsus Nwosu agwala onyeisiala Buhari ya gbara ogwu ya nụọ.
Ọ gwara Buhari na okwu nkasiobi a ọ na-agwa ndị Igbo ugbua enweghị isi.
O kwukwara na ya bụ agha ji agụụ kpọgbuo ụmụ Biafra ruru nde atọ nke mere na Steve Jobs bụ onyeisi ụlọọrụ ''Apple'' jụrụ okwukwe Kristi.
Ndị otu Massob tinyere ọnu na ya bụ nkatọ.
Onye nkwuchite ọnụ Massob bụ Maazị Uchenna Madu kwuru na ya bụ okwu onyeisiala kwuru agaghị medali ndị Igbo obi.










