Otu oyiegwu: IPOB agala ụlọikpe mkpegharị

IPOB members

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Gọọment etiti mapụrụ IPOB ddịka otu ndị na-eyi egwu

Ipob agaala ụlọikpe mkpegharị dị n'Abuja ịrịọ ka ụlọikpe a nyocha mkpebi kwuru na otu ha bụ otu na-eyi egwu nke a kpọrọ 'terrorist group' na bekee.

Dịka akụkọ siri kwuo, ụlọikpe mkpegharị enyebeghị ụbọchị a ga-ege nti na ikpe ahụ.

Cheta na oge gara aga, nnukwu ụlọ-ikpe nọ n'Abuja jụrụ ịkagbu ngụnye gọọmenti etiti gụnyere IPOB dịka ọtụ na-eyi egwu.

Onye okaikpe nke ụlọikpe ukwu dị n'Abuja bụ Jọstis Abdul Abdu-Kafarati, kụpụrụ akwụkwo otu IPOB tinyere iji rịọ ụlọikpe ahụ ka ọ kagbue iwu ahụ gọọmenti mara n'ụbọchị ịrị abụọ n'ọnwa Septemba nke afọ 2017, iji machie otu Ipob.