Komla Dumor Award 2018: Ị chọ onye na-awapụta dịka ọpụrụiche na ntaakụkọ n'Afrịka

Ụlọọrụ BBC na-achọ ọpụrụiche na-awapụta ma na-eto eto n'ọrụ ntaakụkọ maka nturuugo mbaụwa nke Komla Dumor BBC na-eme nke afọ 2018.
A na-akpọku ndị ọrụ ntaakụkọ na mpaghara Afrịka niile ka ha tinye akwụkwọ maka nturuugo ahụ nke na-achọpụta ma na-akwalite ndị ọpụrụiche na Afrịka.
Onye meriri ga-arụ n'isi ụlọọrụ BBC na London ka wee mụọ maka ọrụ ntaakụkọ.
Idenye akwụkwọ maka nturuugo a ga-akwụsị ụbọchị 23 nke ọnwa Maachị afọ a bụ 2018 ma ọ kụọ 12:59 nke ime abalị.
A malitere nturuugo ahụ iji kwanyere Komla Dumor ugwu. Ọ bụbu onye ntaakụkọ pụrụiche si mba Ghana na-arụbu n'igwe TV nke akụkọụwa BBC. Ọ nwụrụ na mberede oge ọ gbara afọ 41 n'afọ 2014.
Nturuugo nke afọ a na-amalite n'isiobodo mba Ghana bụ Accra.


Nke a bụ maka onye ọpụrụiche na-arụ ọrụ ma biri n'Afrịka, onye maara eji ọrụ ntaakụkọ site n'ịgbasaozi n'ikuku nakwa ịkọ akụkọ pụrụiche gbasara mpaghara Afrịka ma chọọ ị bụ onye ama ama n'ọdịnihu
Tinyere ịnọ n'isi ụlọọrụ BBC na London, onye meriri ga-emekwa njem gaa mba Afrịka maka ịkọ akụkọ a ga-ekesa na mpaghara mba ụwa niile.

Ndị meriburu na nturuugo ahụ bụ Nancy Kacugira bụ onye mba Uganda, Didi Akinyelure onye ala Naịjirịa na Amina Yuguda bụkwa onye Naịjirịa.
Maka isiọrụ o mepụtara, Amina dere akụkọ maka ihe imaka n'ihu na-eche iyi Lake Victoria na mba Uganda, iyi kachasị ibu na mpaghara Afrịka nke ndị nyocha sayensi kwuru na o nwereike ịnwụ.
Amina kwuru,"Ị bụ onye meriri nturuugo Komla Dumor nke BBC afọ 2017 dị m ka ọ bụ mbido ọrụ m. I nweta ohere na mba ụwa nakwa ndị mbaụwa ịmata maka m dịka ka m erutela."
"Oge m nọ na BBC, amụtara m mkpa eziokwu, inye mmadụ niile ohere nakwa ige olu mmadụ niile dị. Amụtakwara m ụzọ pụrụiche iji mee ka akụkọ gbasara Afrịka masị ụwa niile.
"Obi dị anyị ụtọ dịka Komla si gosipụta ụwa niile, ọ masịkwara m na-eso m na-eme ka ụkpụrụ ya na-aga n'ihu."
Amina ga-esonye na mmalite nuturuugo nke afọ 2018 ya na Jamie Angus bụ onyeisi BBC otu mba ụwa.
Dịka o kwuru tupu a malite ya:
"Ọ bụ ihe dị ugwu ị nọ ebe a na Ghana na be Komla n'etiti ezinaụlọ ya na ndị enyi ya icheta ụkpụrụ ya nakwa ịchọta onye ọzọ na-awapụta na ntaakụkọ na mpaghara Afrịka.
"Mmadụ atọ ndị meriburu - Nancy, Didi na Amina - ha niile egosipụtala na ha nwere onyinye pụrụiche n'ihe gbasara ọrụ ntaakụkọ ma gbakwa mgborogwu siri ike na nghọta ihe gbasara mpaghara Afrịka na etu a ga-esi jikọta ndị ime obodo Afrịka maka mgbasaozi.
"Anyị na-ele anya ịhụ onye ntaakụkọ ọzọ pụrụiche si mpaghara Afrịka anyị ga-anabata dịka ndị meriri nuturuugo ọhụrụ nke Komla Dumor BBC."
- Maka ịhụ ka i ruru isonye nakwa idenye akwụkwọ, pịa ebe a
- I nwekwara ike ikesa ozi a n'igwe mgbasaozi ọgbara ọhụrụ bụ social media site n'akara #BBCKomlaAwards.















