Etu e si gbagbuo ndị uweojii asaa n'Abuja

Ebe foto si, AFP
Ndị ji egbe gbagburu ndị uweojii asaa na Galadimawa Junction nke dị nso n'ọdụụgbọelu dị n'Abuja.
Onyeisi ndị uweojii n'Abuja bụ Sadiq Bello, kwuputara nke a n'ehihie Tuusde tiri ezịnaụlọ ndị otu ha ọdachie metụtara aka n'obi ma kwee ọha mmadụ nkwa na e ezipụla ndị uweojii iji chekwa ndụ na ihe ndị mmadụ nwere n'Abụja.
Akụkọ kwuru na ndị omekome ji ụgbọala wakporo ndị uweojii nọ n'okporoụzọ gara ọdụụgbọelu n'Abuja na ntụmadị gbagbua asaa ma gbafukwa ngwangwa ha mechara nke a.
Dịka otu onye bi na mpaghara ebe ihe ahụ mere nke achọghị ka a kpọọ aha ya siri kọwa, ndị uweojii kwụsiri ndị ahụ iji nyocha ụgbọala mana tupu ha nwee ohere mee nke a, ha bido gbawa ha egbe, ma gbagbuo asaa n'ime ha.
Onyeisi Ogige ndị uweojii Lugbe bụ CSP Tunde Kabiru kwuru n'ihe ahụ mere bụ eziokwu.
O kwuru na ndị mere ihe ahụ abụghị ndị otu nzuzo dịka ọtụtụ ndị mmadụ siri chee.
Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abuja bụ Manzah Anjuguri, sịrị kwuo n'akwụkwọ ozi o wepụtara, ndị uweojii ebidola nyocha itinyela imi n'ala ma sipụta ndị mere mpụ ahụ.
Mkpamkpa a na-eme abalị atọ e gbuchara ndị uweojii abụọ n'Akwa-Ibom nakwa ọnwa atọ e gbuchara ndị uweojii iri na Benue steeti.










