World Population Day: Onye ka ọ dị n'aka ikwu ụmụ ole a ga-amụ n'ezinaụlọ?

Chidi Lemchi na Comfort Ogu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndọrịtaụka na-apụtakarị okwu n'etiti di na nwunye bụ nwa ole ha ga-amụ nakwa afọ ole kwesịrị idị n'etiti nwoke na nwaanyị.

Mana na mkparịtaụka BBC Igbo na ndị okwu gbasara ezinaụlọ nwere, ha kwuru na ya bụ okwu bụ ụka ọ ga abụ di na nwunye kpaa, ha ewere isi ha kwee ya.

Comfort Obi bụ'Programm Officer' n'ụlọọrụ 'Planned Parenthood Federation of Nigeria (PPFN), ngalaba nke Abia Steeti na Chidi Lemchi, onye nna ma bụrụ onye ọrụ nchọcpụta doro anya bụ ndị tụnyere ọnụ n'okwu ahụ.

Chidi Lemchi, Uche Akolisa na Comfort Obi

Ebe foto si, Uche Akolisa

Lee ọkpụrụkpụ okwu ndị ọzọ ha kwuru :

  • Oge ugbua abụghị oge di na nwunye na-ahapụ nwa ole ha ga-amụta ka ọ bụrụ etu ọ dapụtara; nwoke na nwaanyị kwesịrị ịkpa nwa ole ha ga-amụ tupu ha alụụọ di na nwunye.
  • Ikpa nwa ole a-ga-amụ na-emetụta nna, dịka onye na-akpata ego (ụmụnwaanyị na-emetụta ahụike nne nakwa nwa a ga-amụ).
  • Itu ime na-ebute mgbanwe ahụ nye nne, ọdị mkpa inye ya ohere ka oionweta onwe ya tupu ọ tụọ ime ọzọ, nye aka kpatụ ihe iji kwado di yaA mụọ nwaa, enyeghị ohere tupu a mụọ ọzọ, ọ ga-eme ka nwata tọrọ nwa ka ahụ ghara dị ya mma.
  • E nwere ọtụtụ usoro nhazi ezinaụlọ di na nwunye kwesịrị isi họrọ nke ga-adị ha mma iji hazie nwa ole ha ga-amụ gụnyere ; okpubụenyi, mkpụrụ ọkwụ, nkeọgwụ a na-agba agba nakwa eriri igwe a na-etinye n'ahụ.
  • Usoro nhazi ndị a, i nwere ohere ịmụ nwa ma ọ bụrụ na ị chọọ. ị chọọ ịmụ ọzọ, ị kwụsị ya.
  • Onye okwukwe ya anabataghị usoro ndị a nwere usoro osinachi di na nwunye nwere ike igbaso site na ịgụkọ oge nso ha ka ha ghara ịmụta nwa oge ha achọghị.
  • Chi na-enye nwa, mana Chukwu agaghị esi n'elu gbatuo haziere gị nwa ole ị ga-amụ ọ bụ ọrụ dịrị di na nwaanyị ya ịmụ ole ha ga-azụnwu.
  • O nweghị ihe o mere ma nwoke ịgbaso usoro ndị e nwere ike ịhazi ahụ ya ka ọ ghara ịtunyeli nwaanyị ya ime.
  • E nwere ụlọrụ ndị i nwere ike ịgbakwuru maka ịnata ndụmọdụ maọbụ ntuziaka maka nhazi ezinaụlọ gị n'ọnụ ego agaghị agbawa gị aka.

Kirie mkparịtaụka ahụ n'uju n'ebe a:

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Akụkọ ndị ga-amasị gị: