Ivory Coast vs Algeria: Algeria na Nigeria ga-agba egwu onye ike ga-agwụ

Ebe foto si, Reuters
Ka ọ dị ugbua, Ọljiria na Naịjirịa ga-alụ ọgụ isi ekwe ọnwụ mgbe otu abụọ a ga-ezute n'ọkara-ikpeazụ nke Africa Cup of Nations (AFCON).
Ọljiria ji goolu anọ ha nyere na penariti ji merie Aịvọrị kost nyere naanị atọ n'ime ise ise ha gbara.
N'ime nkeji iri itoolu e ji gbaa bọọlụ, otu abụọ a gbara bọọlụ ka ndị ji ibe ha ụgwọ akwụcha akwụcha.
Nke mere ka Sofiane Feghouli nke Ọljiria buru ụzọ nye goolu na nkeji 20.
Baghdad Bounedjah mechara goolu ọzọ na nkeji 48 mana a gụfuru ya agufu.
N'ọkara nke abụọ, Jonathan Kodjia gbaara Aịvọrị kost aka ahịa na nkeji 62.

Ebe foto si, AFP
Na ha nyere goolu abụọ a egboghi ọgụ a, makana ha mechara gbaa nkeji iri atọ ọzọ nke Bekee kpọrọ "extra time", iji zọọ isi onwe ha.
Ka isi apụtaghị, ọ banyere na "gbaa ka anyị laa", bụ penariti, ebe mba abụọ a zọrọ isi onwe ha.
Etu e si gbaa penariti
AỊVỌRỊ KOST ỌLJIRIA
Franck Kessie - nyere Ramy Bensebaini - nyere
Maxwel Cornet - nyere Islam Slimani - nyere
Wilfried Bony - riri Andy Delort - nyere
Max-Alain Gradel - nyere Adam Ounas - nyere
Geoffroy Serey Die - riri Mohamed Youcef Belaili - riri











