'Onweghị ebe nchekwa dị' - Mba Kameruun tọrọ n'etiti ndị nnupuisi na ndị agha

Nwaanyị bọrọ isi ya na-ele anya n'ala
Nkọwa foto, Afọ anọ ka e gburu di ya, Ngabi Dora Tue na-enwe nsogbu
    • Onye dere ya, Nick Ericsson
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Africa Eye
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 8

Akụkọ a bidoro na anya otu nwanyị anakpọ Ngabi Dora Tue, nke Iru újú na ọnụma jụrụ ahụ site ọnwụ di ya nke dị Otu ndị na-akpa ike gburu mgbe ha nwuchiri ya na ndị ọrụ ibe ya mmadụ ise mgbe ha na alọta ọrụ.

Mgbe anwuchiri di Ngabi Dora bụ Johnson afọ anọ gara aga, ndị toọrụ ya si ka ezinụlọ ya weta ego mgbapụta nke ruru 55,000 dollars, otu aka nwaanyị ya na agbahari otu osi agbaputa di ya, otu nwanne dị ya kpọrọ ya na akara ekwentị na di ya anwụọla.

Na ọnụ okwu ya: "Tupu ha egbu ọ dị m, ha ji mma dabu ya isi ma hapụ ozu ya na okporo ụzọ"

Igbu ndị mmadụ ma hapụ ozu ha na ụzọ, ọlili ozu ndị mmadu, ntoori mmadụ abụghị ihe ọhụrụ nyere ndị bi na mpaghara ndịda anyanwụ Kameruun dịka mgbe ọbụla chi bọrọ, ndị mmadụ nọ na ụjọ maka ha amaghị onye abata obi ha ga ahụ ozu ha na okporo ụzọ.

Mana kedụ ihe kpatara nsogbu a nke riri ọtụtụ isi mmadụ?

Kamerrun bi mba nwere ọnụ asụsụ abụọ, ụfọdụ na asụ bekee mana ụfọdụ na asụ French, nke a bụ n'ihi French and Britain bu ndị ọchịchị nkuchi ha.

Aha onyonyo, Di m pụrụ n'ụbọchị Tuzde, n'ụbọchị Fraịde, ọ nwụọla

Na Septemba 22, afọ 2017 ndị mmadụ mere nghariiwe na mpaghara Bemenda maka ịkpa oke megide ndị mpaghara Kameruun na asụ asụsụ bekee dịka ha kwenyere na ndị na asụ asụsụ French na aka enweta oke kara ha na ihe gbasara gọọmenti etiti.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ụfọdụ okwu gbara ọkpụrụkpụ mgbe ana eme ngahariwe ahụ nke ndị ọkaiwu na ọtụtụ ndị Kameruun na asụsụ asụsụ bekee mere, bụ na ana eji usoro iwu nke ndị mpaghara na asu asụsụ French n'ime ụlọ ikpe nke. Tupu nke a ebido, ndi na asụ asụsụ bekee na French nwere usoro ikpe dị iche iche ha na agbakwasi ụkwụ.

Ka ngahariwe ahụ malitere n'agbawanye, ndị nchekwa jụrụ imechi anya ha, nke kpatara ọtụtụ mmadụ wee nwụọ n'ihi ọdika aka ike eji megide ndị na eme ngagharịwe

Nke a kpatara otu ndịagha ji malite mwakpo dịka ndị isi ndọrọndọrọ ọchịchị mpaghara na asu asụsụ bekee ji kwuputa nnwere onwe nke ihe ha kpọrọ mba Ambazonia

Ruo ugbua, adọkpụrụla ọtụtụ ndị kameruun ruru mmadụ 5 million n'ime ọgwụ a.

Dịka ọgwụ a na abawanye, ọtụtụ ndị mmadụ na akọwa ihe ha ma gbasara ihe na-eme

Blaise Eyong onye ntaakụkọ mere akwụkwọ akụkọ a na nnọchiteanya BBC Africa Eye kwụrụ na ọtụtụ mmadụ anwuola ulo emebiala dika ozu ndị mmadụ na anochi na okporo ụzọ kemgbe ọgwụ a bidoro na n'agbanyeghị mbọ nile ndị mba ọzọ gbara ihe n'ogwu kwụsịrị.

Onye ọzọ tinyere ọnụ na okwu a bụ Felix Agbor Nkongho onye ọkaiwu so ná ndị kwalitere ngagharịwe nke emere na afọ 2016 kwuru na ọnọdụ ndị mpaghara na asụ asụsụ bekee na Kameruun bụ ihe jọrọ ezigbo njọọ.

Ndị na-akwado ikike mmadụ si na ndị nchekwa gọọmenti etiti mejọrọ ọtụtụ ndi mpaghara Kameruun na asụ asụsụ bekee dịka ha gara n'ihu kwuo na ha nọ na anwuchi ndị mmadụ n'ike.

Otu onye anakpọ John na abụghị ezigbo aha ya gwara BBC na ndị agha Kameruun nwuhciri ya na enyi ya ma tinye ha n'ụlọ mkpọrọ ebe atara ha ahụhụ do iche iche ka ha nwere ike ji ụjọ bịanye aka n'akwụkwọ a na-ekweghị ka ha gụọ.

Otu ihe ndi otu nkewa mere iji mee ka mmụọ ndị gọọmenti na ndị agha da mba bụ ikwụsị agụ ma akwụkwọ nke kpatara eji mee mwakpo na otu ụlọ akwụkwọ nọ na Kumba nke mere eji mechie ụlọ akwụkwọ nile nọ na ebe ahụ.

Demonstrators march during a protest against perceived discrimination in favour of the country's francophone majority on September 22, 2017 in Bamenda

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, What began as demonstrations in 2016 and 2017 then escalated into a conflict

Ruo ugbua, adọkpụrụla ọtụtụ ndị kameruun ruru mmadụ 5 million n'ime ọgwụ a.

Dịka ọgwụ a na abawanye, ọtụtụ ndị mmadụ na akọwa ihe ha ma gbasara ihe na-eme

Blaise Eyong onye ntaakụkọ mere akwụkwọ akụkọ a na nnọchiteanya BBC Africa Eye kwụrụ na ọtụtụ mmadụ anwuola ulo emebiala dika ozu ndị mmadụ na anochi na okporo ụzọ kemgbe ọgwụ a bidoro na n'agbanyeghị mbọ nile ndị mba ọzọ gbara ihe n'ogwu kwụsịrị.

Onye ọzọ tinyere ọnụ na okwu a bụ Felix Agbor Nkongho onye ọkaiwu so ná ndị kwalitere ngagharịwe nke emere na afọ 2016 kwuru na ọnọdụ ndị mpaghara na asụ asụsụ bekee na Kameruun bụ ihe jọrọ ezigbo njọọ.

Ndị na-akwado ikike mmadụ si na ndị nchekwa gọọmenti etiti mejọrọ ọtụtụ ndi mpaghara Kameruun na asụ asụsụ bekee dịka ha gara n'ihu kwuo na ha nọ na anwuchi ndị mmadụ n'ike.

Foto Maazị John ebe o mechiri aka ya, mana anyị egosighị ihu ya
Nkọwa foto, John, onye gwara BBC Africa Eye si ka a kpọla ya aha ya, si na ha tiri ya ihe ma mee ka o binye aka n'akwụkwọ na-ekweghị ka ọ gụọ ya bụ ihe o binyere aka

Otu onye anakpọ John na abụghị ezigbo aha ya gwara BBC na ndị agha kameruun nwuhciri ya na enyi ya ma tinye ha n'ụlọ mkpọrọ ebe atara ha ahụhụ do iche iche ka ha nwere ike ji ụjọ bịanye aka n'akwụkwọ a na-ekweghị ka ha gụọ.

Otu ihe ndi otu nkewa mere iji mee ka mmụọ ndị gọọmenti na ndị agha da mba bụ ikwụsị agụ ma akwụkwọ nke kpatara eji mee mwakpo na otu ụlọ akwụkwọ nọ na Kumba nke mere eji mechie ụlọ akwụkwọ nile nọ na ebe ahụ.

Nwoke yi uwe nkenke ụkwụ na-uwe mkpuchi na-ehe mgbo na-agagharị achọ n'ụzọ, ji ọkọlọtọ Kameruun flag n'azụ ya. Ya na ndị ọzọ jikere ka ya so n'asụ.
Nkọwa foto, John Ewome (n;aka nri) ebe ọ na-agagharị achọ ndị nnupụisi na-achọ nnwereonwe na-asụ Bekee

Dịka a ga-asị na ihe ike dị n'etiti ndị agha gọọmentị na ndị otu dị iche iche na-achó nkewapụ onwe ha ezughi oke, agha amalitela ọzọ. Otu ndị agha na mpaghara nkewa apụtala ịlụso ndị Ambazonị ọgụ na mbọ iji mee ka Kamerun dịrị n'otu.

Onye ndu otu n'ime otu ndị a, John Ewome (nke a maara dị ka Moja Moja), na-edu ndị nche mgbe niile n'obodo Buea na-achọ ndị nkewa ruo mgbe e jidere ya na Mee 2024.

E bokwara ya ebubo maka mmebi iwu ndị ruuru mmadụ, na ọ na-eweda ọha na eze ahụhụ na ịta ndị nkịtị na-ejighị ngwa ọgụ e chere na ha bụ ndị na-akwado nkewa. Ọ gọrọ agọ ebubo ahụ. "Enwebeghị m aka m n'ahụ onye nkịtị ọ bụla. Naanị ndị Ambazonians. Ekwenyere m na chi nke ala a nọnyeere m," ọ gwara BBC.

Ka ọ dị ugbu a, usoro ịtọrọ mmadụ na igbu ọchụ na-aga n'ihu.

John (ọ bụghị ezigbo aha ya) bụ - dị ka Johnson - ndị otu ndị na-ekewapụ onwe ha nwụchiri, na-achọsi ike ijide njikwa site na ụjọ - yana itinye ego.

"M banyere n'ime ụlọ ahụ, wee hụ ụmụ m na nwunye m n'ala mgbe ọchịagha nọ ọdụ na kichin m na egbe ya dị nso. N'akụkụ m niile, a kpọgara onye agbata obi m, a kpọgara onye nwe ụlọ m. Ya mere, mgbe m hụrụ ha, m maara na ọ bụ oge m, "ka Joe na-ekwu

Eserese ala mba Kameruun na-egosi ebe a na-asụ asụsụ Bekee nakwa asụsụ Fụrenchi.
Nkọwa foto, Eserese ala mba Kameruun na-egosi ebe a na-asụ asụsụ Bekee nakwa asụsụ Fụrenchi.

A kpọbatara ya na mmadụ iri na ise ndị ọzọ n'ime ọhịa ebe ọ hụrụ ogbugbu e gburu mmadụ abụọ n'ime ndị ibe ya. Ma n'ikpeazụ, a tọhapụrụ ya mgbe ndị agha chọtara ogige ahụ.

Johnson enweghí ihuọma, maka na ka ihe dịka afọ abụọ gara ka elichara ozu ya, a nụrụ na a hụrụ ozu ndị ọrụ ya na ha so mgbe a tọọrọ ya. A hụtara ozu ha.

Ezinụlọ ndị ọzọ ga-agbambọ ugbua ịghọta ihe mgbaagwojuanya a mere ha. Mana Ngabi Dora Tue na nke ya, ya na ụmụ ntakịrị ya, otu nọ ọdụ n'apata ụkwụ ya, ọdịnihu ha ka na-agbagwoju ya anya.

Ọ sị: "Enwere m ụgwọ m ga-akwụ ụgwọ, amaghịkwa m otu m ga-esi hazie onwe m."

"Echere m ihe ọ ga-abụ ma m gba n'ezi maka ihi ego. Mana m chechara ihere ga-eso ya m wee hapụ ụdị uche ahụ. A ka dị m obere ịbụ nwanyị onye di ya nwụrụ."

Akara ntụ na-ekewa ahịrị akụkọ a.

Mgbe BBC na ewepụta akụkọ a, ha nyere ohere ka Ambazonia Defense Forces tinye ọnụ, ha kwuru na enwela ọtụtụ ndị agha nkewa dị iche iche na arụ ọrụ na mpaghara ndị na asụsụ bekee na Kamerrun.

Ha kwuru na Ambazonia Defense na-arụ ọrụ n'ime iwu mba ụwa, na ha adịghị awakpo ndị ọrụ gọọmentị, ụlọ akwụkwọ, ndị nta akụkọ maọbụ ndị nkịtị.

Ọ zara na enwere ọtụtụ ndị agha nkewa na-arụ ọrụ ugbua na mpaghara ebe a na-asụ Bekee bụ Anglophone.

ADF kwuru na ọ na-arụ ọrụ n'ime iwu mba ụwa na ọ naghị awakpo ndị ọrụ gọọmentị, ụlọ akwụkwọ, ndị nta akụkọ ma ọ bụ ndị nkịtị.

Kama ọ tarala ndị mmadụ n'otu n'otu na ụlọ ọrụ dịpụrụ adịpụ na-eme ihe n'onwe ha na-abụghị ndị otu ADF maka mwakpo ndị a.

Otu a na-ebokwa ndị na-abata gọọmentị ebubo na ha na-eme arụrụala ebe ha na-ekwu na ha bụ ndị agha Ambazonian iji tụgharịa ndị obodo megide mgba nnwere onwe.