'Ha bu n'obi igbu mmadụ' - BBC achọpụtala ndị ọrụ nchekwa gbara ndị na-eme ngagharịiwe egbe na Kenya

Foto na-egosi ndị na-eme ngagharịiwe na Kenya, ọkọlọtọ Kenya na foto Eric Shieni e gburu n'ihu ụlọomeiwu Kenya na 25 Juun 2024
    • Onye dere ya, Bertram Hill & Tamasin Ford
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Africa Eye
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 9

Ndi ụlọọru mgbasaozị BBC achọputala ndị ọrụ nchekwa Kenya gbagbụrụ ndị na-eme ngagharịiwe maka ụtụisi n'ogige ụlọomeiwu mba ahụ n'ọnwa Juun 2024.

Nnyocha BBC mere na foto ihe karịrị mmadu puku ise (5,000) na-egosi na ndi ngagharịiwe e gbụrụ ebe ahụ bụ ndị na-ejighị ngwá agha maọbụ ndi ha na-eyi egwu.

Iwu mba Kenya kwadoro ngaghariwe nke mere ọnwụ ha ji bụrụ ihe mwute nke ọhanaeze na-akatọ.

N'agbanyeghị na Kọmitii ụlọomeiwu nyere iwu nye otu na-ahu maka ndi uweojii a kpọrọ Kenya's Independent Policing Oversight Authority (IPOA) ka ha nyochaa ihe kpatara ọnwụ ọtụtụ mmadụ n'okporoụzọ ịsị obodo Nairobi ma weputa ihe ha chọputara ka ọha mara, mana kemgbe ahụ enwebeghị ihe e kwụrụ maọbu onye e jidere.

Etu BBC si nweta ozi a bụ site na nnyocha onyonyo na foto ndi ngaghariiwe na ndị ntaakụkọ sere oge a na-eme ngagharịiwe ahụ.

Ha kwụrụ na ha ji ngwa ọru gunyere igwefoto, oge ndụ nke eji ahụ ihe na-eme na mgbe oji eme, elekere ọha na eze nke ahụrụ na onyonyo mgbe ngaghiriiwe ahụ na-eme

Ihe ngwa oru ndi a mere ka ha ji chọpụta na égbè nke agbara ndi na-eme ngaghariiwe ụbochi ahụ bụ nke onye uweojii na onye agha.

Ihe ọzọ ha gosipụtara bụ usoro iheomume mgbe otu ndị omebe iwu nke Kenya banyere na ụlọ nke nzukọ omeiwu iji mme ntuliaka nke ikpeazu banyere akwukwọ ego nke gọvamenti ana-akatọ mgbe ndi ngaghariiwe jiri gbakọ na okporoụzọ na ubọchi Tuezde ọnwa Juun na afọ 2024.

Ịdọ aka na ntị: Foto ozu mmadụ dị n'akụkọ a.

Ndị mere ngaghaịiwe a nke ọtụtụ n'ime ha bụ ndi ntorobịa nke anakpọ Gen Z bụ ndị gbakọtara onwe ha na soshal midia, malitere ịbanye n'etiti Nairobi n'isi ụtụtụ. Ngagharị iwe ahụ ga-abụ nnukwu ngagharị iwe nke atọ nke isi obodo ahụ kemgbe ewebatara ụgwọ ego na 9 Mee.

Otụ onye na-ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ bụ Boniface Mwangi nke nọ oge ana-eme ngagharịiwe kwụrụ na ubọchi ahụ bụ "bụ oriri mara mma"

"Ụmụaka putara jiri ihe ọkà okwu Bluetooth na mmiri ha. Ọdike emume"

Ndí na-eme ngagharịiwe maka mbuli ego ụtụisi na 25 Juun 2024
Nkọwa foto, Ụbọchị Tuzde 25 Juun, 2024, ndị Gen Z na-eme ngagharịiwe maka mbuli ego ụtụisi pụtara n'igwe n'okporoụzọ Nairobi
Boniface Mwangi yi uwe na-acha ọbara ọbara e dere 'I love my country' ma yara ọkọlọtọ mba Kenyan n'onu ya - n'etiti ndị ntorobịa na-eme ngagharịiwe - 25 Juun 2024
Nkọwa foto, Onye na-ekwuchitara ndí a na-akpagbu Boniface Mwangi
Foto ndị na-eme ngagharịiwe maka mbuli ego ụtụisi n'okporoụzọ Nairobi - 25 Juun 2024
Nkọwa foto, Ngaharịiwe a kpọrọ nke ndị Gen Z, nwetara ịdị n'otu n'etiti ndị mba Kenya n'agbanyeghị ọrụ onye na-arụ.
Ademba Allans nọ na ngaharịiwe ahụ e mere na Nairobi - 25 June 2024
Nkọwa foto, Nwata akwụkwọ bụ onye ntaakụkọ Ademba Allans (yi uwe ojii) kwuru na a na-egosi ngagharịiwe ahụ na TikTok na Instagram

Ndị ngagharịịwe nọ na mbido n'izu a, mee ka ndi ụlọomeiwu wepụ mmụba ụtụisi na achịcha, mmanụ eji esi nri na ụgbọala, ya na ụtụisi "Eco Levy" nke nwereike ibuli ọnụ ahịa akwa e ji amachi ụmụaka ọhụrụ ahụ.

E kwụrụ na ihe ụtụịsi ahu ga-eme bụ iji wepụta ego rụrụ $2.7bn (£2bn) nke gọọmenti kwụrụ na ha ga-eji belata ịdabere na mgbazinye ego mpụga, dịka ụtụisi mbubata ihe na Kenya, nakwa ụlọọgwụ.

Boniface Mwangi, onye na-ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ kwụrụ na ngagharịiwe a bụ "oge mbụ ndị Kenya niile ma onye ukwu ma onye nta na-apụta kwuo okwu megide atụmatụ ndị na-achị obodo"

Ndị ngagharịịwe a nwere otu ihe n'uche – nke bụ nzukọ ụlọomeiwu, ebe a na-eme ntụliaka nke ikpeazu.

Oge o ji nkeji iri atọ gafee elekere itoolu nke ụtụtụ (09:30) ndị omeiwu batara n'ụlọomeiwu.

Mana ọtụtụ mmadụ si mpaghara dị iche iche na-abịa n'ụlọomeiwu ahụ.

Mapụ na-egosi ụlọomeiwu Kenya na ebe atọ e kwuru na ndị uweojii nwere ọnọdụ. To request:
1. Complete the translations here: https://tinyurl.com/526hk3zm
2. Fill-in the commissioning form https://bit.ly/ws_design_form and this Title in English: Kenya blood parliament - 2025042404

Onye ntaakụkọ nwa akwụkwọ Ademba Allans kwụrụ na "ụbọchị ahu dika ụbọchi niile,"

O kwuru na ọtutu mmadu nọ na-ekiri ngagharịịwe ahu na Tiktok, Instagram na Tv..

Na mbụ, e gbochiri ndi ngagharịịwe ibanye n'ụzọ site na-igba ha anwụrụ anya mmiri, ebe ndị uweojii malitere iji mgbọ mmiri na mgbọ roba gbochie ha.

Allans kwụrụ na "Ndị mmadu bidoro ịbịa n'gwe mana ndi uweojii nọ na anwuchi ọtụtụ n'ime ha.

Ọsi na "ndị uweoji jụrụ ebe niile, ha nọ na-akwa ndi mmadu aka mana ndi mmadu siri ọnwu na erigo n'elu mgbọ mmiri"

N'agbanye ihe niile a nọ na-eme n'ezi, ndi ome iwu ka nọ n'ime ụlọ ọmeiwu na eme ntụliaka mana oge na adigi anya, ndi na-eme ngagharịịwe mere ka ndị uwe ojii laghachi n'akụkụ ugwu ọwụwa anyanwụ nke ụlọ nzuko omeiwu.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

N'oge na adigi anya ndi omeiwu mechara ntụliaka iwu ụtụisi gọvamenti nke mmadu di 195 kwadoro ma 106 megidere ya, ndi omeiwu nke nọ na pati nke na achọ ichụpụ ndi nọ na ọchịchị were iwe na-apu na ụlọ omeiwụ

Onye nta akụkọ nwa akwụkwọ Allans kwụrụ na mgbe ndi mmadu matara ihe mere na ụlọ omeiwu, ndi ngagharịịwe were iwe na-ekwu na "ihe ọbula mere, ha ga abata n'ụlọ omeiwụ ma zi ha na ha kwenyeresiri ike na ihe mere ha ji eme ngagharịịwe"

Oge na adigi anya, ndi igwe mmadu ahu gafere mgbochi ndị uweojii ma bata na okporo ụzọ nke tinyere isi n'ụlọ omeiwụ

Site na iwe na ọnuma ndi ngagharịịwe ji bata, ha gbara ụgbọala ndị uweojii gbahapụrụ agbahapụ n'okporo ụzọ ọkụ ma kwatuo ihe ogige (fence) were bata na mpaghara ụlọ ndi omeiwu, oge na adigi anya, ndị ọrụ nchekwa na-ekpuchite ndi omeiwu kpochapụrụ ha ngwa ngwa

Mgbe ihe a na-eme, ndi nta akụkọ ji ngwa ọrụ ha ji ese foto na akọ akụkọ ihe na-eme, ka osi eme ebe ahụ.

Otu n'ime onyonyo nke ahụrụ na-egosi onye uweoji nọ n'eti mkpu na okwu asụsụ ire nke putara "Gbuo" n'asụsụ Swahili. Oge na adigi anya otichara mkpu a, otụ onye uweoji tinyere ikpere na ala, anụrụ mgbọ egbe, nke mere ìgwè ndi ngagharịịwe si da n'ala – asaa na ọnụ

David Chege, onye di afọ 39-na-eme ihe gbasara software injinia na akuzi kwa ụmụaka n'ụlọ ụka na Ericsson Mutisya, onye gbara afọ 25 years nke na ere anụ ka agbagbụrụ. Ihe dika mmadu ise merụrụ ahụ, otu n'ime ha kpọnwụrụ akpọnwụ site n'úkwù ruo n'ụkwụ

Nwata akwụkwọ bụ onye ntaakụkọ Ademba Allans weliri ọkọlọtọ elu dịka ọ na-abịa nso ebe ndị a gbara egbe n'akụkụ ụlọomeiwu Kenya - 25 Juun 2024
Nkọwa foto, Ademba Allans na-agba mbọ inyere David Chege na ndị ọzọ meruru ahụ aka oge a gbara ha egbe

Onyonyo na egosi ka Allans, nwa akwụkwọ nke n'arụ ọrụ ndị nta akụkọ siri jiri ọkọlọtọ Kenya (Kenyan Flag) na-achọ iru ebe ozụ Chege onye nke agbagbụrụ tọgbọrọ n'ala otụ onye nke agbakwara egbe ọbara nọ na-apụta n'ahụ ya. Mana kedụ onye gbara egbe ahụ gburu ndi mmadụ?

N'ime onyonyo nke BBC n'enyocha, onye uweoji nọ na eti mkpu, azu onye gbara egbe ahụ n'egosi mana BBC jiri ngwa agha ya (Body armour), ọta ọgba aghara ya (Riot shield) na ihe oji emechi isi ya tụnyere ndi uweojii ọ bụla nọ ebe ihe ahụ n'akpọtụ.

Nyocha ndị ọzọ gosiri na obere ihe di iche nọ na efe onye uweoji ahụ yi dika ihe oji mechie isi ya kputere ihụ n'ala. BBC kwụrụ na ha tụnyere uwe oyi na ahụ na nke onye ọzọ mana onye uweoji ahụ zoro ihu tupu ya agbapụ mgbọ egbe n'ime ìgwè mmadụ ahụ

Mgbe ogbachara egbe ahụ, a ka nwere ike ịnụ mgbe ọ na-agwa ndị uweoji ibe ya ka ha ga n'ihu n'agba egbe n'etiti igwe mmadu ahụ putara mana ọ kpacha anya iji zoo njirimara ya, egosiri n'aha ya bụ John Kaboi.

Ọtụtụ ndi mmadu gwara BBC na onye uweojii ahụ na arụ n'ụlọ ọrụ ndị uwe ojii nọ na mpaghara etiti Nairobi

Mgbe BBC were ebụbo ahụ ga na ụlọ n'ahụ maka ụlọ ọrụ ndị uweojii, ha kwụrụ na ha agahi enwe ike inyocha onwe ha, na-aga n'ihu na-ekwu na IPOA bụ ndi ọ nọ n'aka inyocha ihe gbasara akparamagwa ọjọọ

Ha gara n'ihu igba onye uweojii ahụ bụ Kaboi ajụjụ mana onwegi ihe okwụrụ, onwebegi onye ejidere maka ọnwu Chege ma ọbu Mutisya ndi egbụrụ oge ngaghariiwe. BBC chọpụtara na o nweghị onye n'ime ha nwere ngwá agha.

John Kaboi na ndị uweojii ndị ọzọ nọ n'ihu ụlọomeiwu Kenya.
Nkọwa foto, John Kaboi, bụ onye uweojii ahụ yi uwe nkịtị a nụrụ ka ọ na-agwa ndị otu ya 'gbuo' n'ihu ụlọomeiwu Kenya.
Onye uweojii BBC chọpụtara na ọ bụ ya gburu David Chege na Ericsson Mutisya nọ n'etiti ndị uweojii ndị ọzọ.
Nkọwa foto, Lee onye uweojii ahụ BBC chọpụtara na ọ bụ ya gbagburu David Chege na Ericsson Mutisya

Mana ha abugi sọsọ ndi nwụrụ. Kama ọnwu ha ga eme ka mmụọ ndi ngaghariiwe ahụ da mba, omere ka obi sie ha ike nke mere ha ji banye na ụlọ ndi omeiwu.

Mgbe ha batara, onyonyo na-egosi ka ha mebiri ogige eji kwado ụlọ omeiwu. Tupu nke a gasiri, ahụrụ na ụfọdu ha welitere aka ha elu, ndi nke ọzọ ji akara ngosi ma ọ bụ ọkọlọtọ Kenya.

Ozugbo ndi uweojii hụrụ ihe na-eme, ha gbara mgbọ ịdọ aka ná ntị nke mere ndị ngaghariiwe jiri tinye isi ha n'ala oge ntakiri ma ha mechara tinye isi n'ulo ndi omeiwu .

Aka ha batara, ihe niile agbanwe, nsogbu edebiri ọku, ha jiri ukwu gbatuo ọnụ ụzọ, ha munyekwa akụkụ ebe mgbakọ ndi omeiwu ọkụ, nke mere ka ụfọdu ndi omeiwu nọ ebe ahụ ji gbaa ọsọ ndụ ha

Ihe ha mebiri bụrụ ibụ mana oge na adigi anya, ndi ngaghariiwe a jiri kwa otu ha si bata wee pụọ

Oge na adigi anya mgbe ha pụrụ ebe ahu, anụrụ uda egbe, ndị ngaghariiwe were daa n'ala. Mgbe anwụrụ ọkụ ahụ na-ekpochapụ, ihe onyonyo igwefoto gosipụtara ozu atọ di n'ala. Mmadụ abụọ merụrụ ahụ, otu onye weliri aka ya mana o nweghị ike ibili ọtọ.

Nke atọ, Eric Shieni onye gbara afọ 27 so na onye nke agbagbụrụ, agbara ya egbe na isi mgbe ọchọrọ ibilite n'ala. BBC chọputarakwa na dika Ikpe Chege and Mutisya, ha ejigi ngwa aha.

BBC Africa Eye nyochara ihe karịrị onyonyo 150 e sere n'ime nkeji tupu mgbe a gbagbụrụ Shieni mana enwegi ike ịmata aha onye agha ọgu gbara ya egbe n'azụ isi ya.

Onyeisioche nke na ahu maka iwu ọha mmadụ nke Kenya bụ Faith Odhiambo kwụrụ na "onyonyo igwe foto nke gosiri onye gbara egbe ahụ doro anya"

Ogara n'ihu na-ekwu na "Ihe ndị agha bụ n'obi bụ igbu ndi ngaghariiwe. Ha nwere ike ijide ya mana ha emegi nke ahu, na ha gbara ya egbe n'isi na-egosipụta na ha chọro igbu ya"

Odhiambo kwuru na onye gba gburu Eric "abụrụla onye ikpe, onye nchịkọta, na onye na-eme iwu"

Ndị agha Kenya (KDF) gwara BBC na IPOA enyebeghị arịrịọ ọ bụla iji lelee onye ọ bụla n'ime ndị ọrụ ha jikọrọ aka na ọrụ dị na nzukọ omeiwu mgbe ndi mmadụ mere ngagharịịwe

Ha gara n'ihu kwuo na "KDF na-agbasi mbọ ike ịkwado iwu ma na-aga n'ihu na-arụ ọrụ site ihe akwụkwọ iwu nyere ha ike iru

Mgbe agbapụ ahụ gasịrị, a hụrụ Allans ọzọ, na-eduga nwoke merụrụ ahụ nke ọbara na esi n'ukwu ya na agbapụta

Allas kwụrụ na"Ezigbo ụjọ nọ n'atu ya, ochere na ọgagi ahụ ndi nwe ya ọzọ"

"Ihe ọzọ mere ụjọ ji n'atu m bụ ihapụ ka ndị mmadụ nwụọ n'ihu m nge nwere ike inyere ha aka"

Mgbe ihe niile gasiri, na ọnwa Juun 25, Kọmitii Na-ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ na Kenya kwụrụ na mmadụ rụrụ 39 nwụrụ, mmadụ rukwara 361 merụrụ ahu

Oge mgbede, onyeisiala William Ruto kelere ndi nchekwa obodo ya maka nchebe nke ọbụbụenyi mba na-aka ndi omekome ndị biara tinye ọgbahara n'eititi ndi na-eme ngagharịịwe mana nke a gachara, a kwụsịrị ụgwọ ego ahụ.

Onyeisiala Kenya kwuru na"Ogela nti ihe ndi ọna achi kwụrụ na ha achọgi ihe gbasara utu isi gọvamenti, ekwenyere m n'ihe ha kwụrụ, agaghi ebinye ya aka ka ọburu iwu"

Rụọ ugbu a, enwebeghi onye ndi gọvamenti jidere maka ọnwu ndị ahụ, enwebegi kwa nyocha e biputara