‘Ịdị ime’ ruo ọnwa iri na ise: Akụkọ ndị ji afọ ime 'ịrịbaama' aghọgbu ndị mmadụ
- Onye dere ya, Yemisi Adegoke, Chiagozie Nwonwu, and Lina Shaikhouni
- Ndị mere akụkọ a, BBC World Service
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 7
Chioma gbara isi akwara na nwa nwoke o ku n’aka bụ Hope bụ nwa ya nwoke. Dịka mbọ ọ gbara afọ asatọ ịmụta nwa kụrụ afọ n’ala, ọ hụtara nwa ahụ dịka ọrụ ebube.
‘Ọ bụ m nwe nwa a,” ka kwuru hoohaa.
Ọ nọdụrụ ala n’akụkụ di ya bụ Ike n’ụlọọrụ otu onye nnọchiteanya Naịjirịa, bụ onye weere ọtụtụ oge ya na-agba di na nwunye ahụ ajụjụ.
Dịka kọmịshọna na-ahụ maka ụmụnwaanyị na ọdịmma obodo n’Anambra steeti, Ify Obinabo enweela ọtụtụ ohere idozi nsogbu ezinaụlọ, mana nke ugbua abụghị nghọtahie nkịtị.
Mmadụ ise sitere n’ezinaụlọ Ike nọkwa n’ime ụlọ ahụ ekwenyeghị na ọ bụ nwanne ha nwoke na nwunye ya mụtara Hope.
Chioma na-ekwu na ya buru nwa ahụ ọnwa iri na ise (15). Kọmịshọna ahụ na ezinaụlọ Ike ekwenyeghị.
Chioma kwuru na ndị ezinaụlọ Ike kwanyere ya ọkụ n’ahụ ka ọ tụrụ ime. Ha gwakwara Ike ka ọ lụọ nwaanyị ọzọ.
N’ihi nkwanyeọkụ ahụ, ọ gara “n’ụlọọgwụ” nke na-arọpụta usoro “ọgwụgwọ” dị iche – ndị nghọrị na-aghọgbu ụmụnwaanyị ọ dị ọkụ ọkụ ị bụ ndị nne nke gụnyere ire ụmụaka.
Anyị agbanweela aha Chioma, Ike na ndị ọzọ dị n’akụkọ a iji chekwaa ha na mbuso agha ga-esite n’aka ndị obodo ha.

‘Ọgwụgwọ ihe ịrịbaama'

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Naịjirịa bụ otu n’ime mba ndị nwere ọnụọgụ ọmụmụ kachasị n’ụwa, dịka ụfọdụ ụmụnwaanyị na-agabiga nkwanyeọkụ ndị obodo ka ha tụrụ ime tinyekwara ịmapụ ha n’iwu nakwa mmetọ ọ bụrụ ma ha enwelighị ike.
N’ihi nkwanye ọkụ ahụ, ụfọdụ ụmụnwaanyị na-eme ihe ekwesịghị ekwesị iji nwee ike nwetazuo ọchịchọ obi ha ịbụ ndị nne.
N’ihe karịrị otu afọ, BBC Africa Eye nọọrọ na-eme nnyocha gbasara nghọrị ‘afọ ime kriptik’.
Ndị nghọrị na-eme ka aga-asị na ha bụ ndị dọkịta na nọọsụ na-emegheri ụmụnwaanyị anya na ha nwere “ọgwụgwọ ọrụ ebube maka ndị na-achọ nwa” nke ga-eme ka ha tụrụ ime. Mmalite ọgwụgwọ ahụ na-ewekarị ihe karịrị ọtụtụ dọla ma gụnye ọgwụ ndụ, ihe ọṅụṅụ maọbụ ihe a na-etinye ha n’ime ọtụ.
Enweghị nwaanyị maọbụ ndị ọrụ anyị gbara ajụjụ oge anyị na-eme nnyocha maara ihe dị n’ime ọgwụ ndị ahụ. Mana ụfọdụ ụmụnwaanyị agwala anyị na ha wetere mgbanwe n’ahụ ha – dịka afọ iko eko – nke meghariri ha anya na ha dị ime.
Ụmụnwaanyị ndị na-anara ọgwụ ndị ahụ ka a na-agwa ka ha ghara ịga ụlọọgwụ ọzọ maọbụ hụ dọkịta ọzọ n’ihi na e nweghị nnyocha ọbụla ga-egosinwu ebe nwa ha nọ, bụ nke ndị nghọrị ahụ kwuru na ọ nọghị n’akpa nwa.
Oge ọmụmụ nwa ruo, a na-agwa ụmụnwaanyị ndị ahụ na ihe mgbu ọmụmụ nwa ha bụ nke a ga-eji ọgwụ dị ụkọ ma dịkwa ezigbo ọnụ kpalite, nke ga-eme ka ha kwụọ ụgwọ ọzọ.
Akụkọ gbasara etu ha si amụ ụmụ ha dị iche iche mana ha niile na-amapụ obi. Ụfọdụ ka a na-agba ọgwụ ụra, ha eteta ma hụ na awaala ha afọ. Ụfọdụ ndị ọzọ sịrị na a na-agba ha ọgwụ na-atụ ụra nke na-eme ka ha kwenye na ha na-amụ nwa.
N’ụzọ ọbụla, a na-ekunye ụmụnwaanyị ndị ahụ nwa a sị ha mụrụ.
Chioma gwara kọmịshọna Ify na mgbe oge ọmụmụ nwa ya ruru, onye ahụ kpọrọ onwe ya dọkịta gbara ya ọgwụ n’ukwu ma gwa ya ka ọ nyịpụta nwa. Ọ kọwaghị etu o siri nweta Hope mana o kwuru na ọmụmụ nwa ya dị ezigbo ụfụ.

Ndị otu anyị gbalịrị banye n’otu ụlọọgwụ nzuzo ahụ - gakwuru nwaanyị a maara dịka Dr Ruth rute na ndị na-akpọtụrụ ya – site n’ime ka a ga-asị na ha bụ di na nwunye na-achọ nwa kemgbe afọ asatọ.
Onye ahụ kpọrọ onwe ya Dr Ruth nwere ụlọogwụ ọ na-emepe naanị n’ụbọchị Satọde n’ọnwa ọbụla n’otu ụlọọgwụ dakpọrọ adakpọ n’Ihiala dị n’Anambra steeti. Na mpụta imeụlọ ya, ọtụtụ ụmụnwaayị na-eche ya n’ọnụụzọ mbata ụlọ oriri ahụ, ụfọdụ ka afọ ha koro eko.
Onye ọbụla na-enwe nchekwube ebe ahụ. Ka o ruru otu mgbe, mkpu ọṅụ dara n’imeụlọ ahụ oge a gewara otu nwaanyị na ọ dịla ime.
Mgbe oge ruru ka ndị ntaakụkọ anyị na-eme nnyocha gaa hụ ya, Dr Ruth gwara ha na ọgwụ ya ga-arụrụ ha ọrụ.
O wepụtaara nke nwaanyị ọgwụ ndụdụ, kwuo na nke ahụ ga-enyere ya aka ị họrọ ụdị nwa ọ chọrọ ịmụ n’ọdịnihu – nke na-ekweghị omume na ngalaba ahụike.
Mgbe ha jụrụ ọgwụ ndụdụ ahụ, Dr Ruth nyere ha ọgwụ akwọpịara akwọpịa ma tinye n’ime akpa tinyekwara mkpụrụ ọgwụ ndị ọzọ ha ga-eji laa, nakwa ndụmọdụ gbasara mgbe ha ga-enwe aramara.
Mmalite ọgwụgwọ ahụ ga-ewe narị puku naịra atọ na iri ise (350,000), nke ji obere ihe karịa dọla narị abụọ ($200).
Onye ntaakụkọ anyị na-eme nnyocha anaraghị ọgwụ ndị ahụ maọbụ soro ndụmọdụ Dr Ruth ma lọghachi ịhụ ya ka izuụka anọ gasịrị.
Oge o jichara ihe dịka ihe nnyochaahụ ‘ultrasound’ nyochaa ya afọ, a nụrụ ihe dịka ụda obi dịka Dr Ruth kelere ya maka ịdị ime.
Ha abụọ ṅụrịrị ọnụ.
Oge o nyechara ha ozi ọma ahụ, Dr Ruth kọwara etu ha ga-esi kwụọ ụgwọ maka ọgwụ dị ụka ma dịkwa ọnụahịa bụ nke a chọrọ maka ọmụmụ nwa ahụ, nke ọnụego ya dị n’agbata 1.5 na nde naịra abụọ ($1,000).
Ewezuga ọgwụ a, afọ ime ahụ nwereike gafee ọnwa itolu, ka Dr Ruth kwuru dịka o leghaara nchọpụta sayensị anya, gbakwunye: “Nri ga-akọ nwata ahụ n’ahụ - anyị ga-achọkwa iwulite ya ọzọ.”
“Dr Ruth” azaghachibeghị ebubo BBC tọgbọọrọ ya.

Ogogo ụmụnwaanyị ọnọdụ a metụtara ji ewere obi ha niile ekwenye nke a edoghị anya.
Mana ihe mere ha ji ekwenye akụkọ ụgha dị etu ahụ nwereike bụrụ nke a ga-ahụta n’otu ịntaneetị ebe a na-ebugharị akụkọ ụgha gbasara afọ ime.
Otu ndị na-efesa akụkọ ụgha
Afọ ime kriptik bụ ọnọdụ ahụike anabatara ebe nwaanyị amaghị na ya dị ime ruo oge afọ ime ya gamiri.
Mana oge anyị na-eme nnyocha, BBC chọpụtara mfesa akụkọ ụgha gbasara ụdị afọ ime dị etu a n’otu Facebook dị iche iche.
Otu nwaanyị si mba Amerịka, onye nyepụrụ ọbaozi ya niile gbasara “afọ ime kriptik” kwuru na ya dị ime kemgbe ọtụtụ afọ mana nke ahụ bụ ihe sayensị apụghị ịkọwa.
N’otu ndị a kpọchiri akpọchi na Facebook, ọtụtụ ozi dị na ha bụ gbasara okpukperechi iji jaa ọgwụgwọ ahụ dịka ọrụ ebube maka ndị enweghị ike ịtụ ime.
Ozi ụgha ndị aniile na-enyere ụmụnwaanyị aka ikwenyesị ike na nghọrị ahụ.
Ndị nọ n’otu ndị a esiteghị naanị na Naịjirịa, kama ụfọdụ sitere Saụt Afrịka, Karibian nakwa ọbụnadị Amerịka.
Ndị nghọrị ahụ na-ejikwa ha adọbata ndị ọzọ.
Ọ bụrụ na onye ọbụla egosi njikere ịmalite usoro nghọrị ahụ, a na-anabata ha n’otu Whatsapp ndị nwere ezigbo nchekwa. Ebe ahụ, ndị nlekọta na-ezisa ozi gbasara “ụlọọgwụ kriptik” nakwa ihe ndị usoro ahụ ga-ewe.
‘Aka nọ m na mgbagwojuanya’
Ndị ọchịchị gwara anyị na iji natachaa ọgwụgwọ ahụ, ndị nghọrị ahụ chọrọ ụmụ a mụrụ ọhụrụ, n’ihi ya, ha na-agakwuru ụmụnwaanyị enweghị ka ọ dị ha, ọtụtụ n’ime ha na-eto eto ma bụrụkwa ndị dị ime n’obodo ite ime bụ nke megidere iwu.
Na Febụwarị 2024, mịnịstrị ahụike Anambra steeti gara wakpoo ebe ahụ Chioma “mụrụ” Hope.
BBC setere ihe onyonyoo mwakpo ahụ nke gosiri ụlọ ukwu abụọ dị n’ime otu ụlọ.
N’ime otu ụlọ ka a kwajuru ngwongwo nlekọta ahụike – maka ndị chọrọ enyemaka – ebe ihe dị na nke ọzọ bụ ọtụtụ ụmụnwaanyị dị ime a manyere ka ha nọrọ ebe ahụ. Ụfọdụ n’ime ha dị obere dịka afọ iri na asaa (17).
Ụfọdụ na-agwa anyị na a ghọgburu ha ịga ebe ahụ, na-amaghị na a ga-erenye ụmụ ha n’aka ndị na-abịakwute ndị nghọrị ahụ.
Ndị ọzọ dịka Uju nke na-abụghị ezigbo aha ya, nwere nnukwu ụjọ ịgwa ndị ezinaụlọ ha na ha dị ime ma chọ ụzọ ha ga-esi gbapụ. Ọ sịrị na e nyere ya narị puku naịra asatọ (800,000) nke ruru ihe dịka narị dọla ise ($500).
Oge a jụrụ ya ma mkpebi ire nwa ya a na-ewute ya, ọ sịrị: “A ka nọ m na mgbagwojuanya.”
Kọmịshọna Obinabo, onye so na mbọ steeti ya na-agba iwakpo ndị nghọrị ahụ, kwuru na ndị nghọrị na-aghọgbu ụmụnwaanyị enweghị ka ọ dị ha dịka Uju iji chọta ụmụaka.

Oge ọ gbachara ya ajụjụ ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ, kọmịshọna Obinabo yiri egwu ịnapụ Chioma obere nwa ahụ.
Mana Chioma rịrọrọ arịrịọ ma gbaa isi akwara na ya bụ onye a ghọgburu ma kwuo na ya aghọtabeghị ihe na-eme.
Kọmịshọna mechara nabata nkọwa ya.
Ka ọ dị ugbua, Chioma na Ike ga-ejide nwa ha – ewezuga ma ndị mụrụ ya ha ga-abịa ịkụrụ nwa ha.
Mana ndị ọkachamara dọrọ aka na ntị na ụdị nghọrị dị etu a ga na-aga n’ihu ruo mgbe a gbanwere omume n’ebe ụmụnwaanyị, amụghị nwa, ikikere ịmụ nwa na iku nwa nọ.









