Africa Eye: Ndụ n'ogo 50°C na nsogbu idemmiri na mba Saụt Sudan

Ebe foto si, Getty Images
Nnyocha ngalaba BBC Africa Eye gosiri nnukwu idemmiri na mmetụta mgbanwe ihu igwe mere na Saụt Sudan. A na-ekwu na ọtụtụ puku ezịnaụlọ enweghịzi ebe obibi n'ihi na idemmiri buru ụlọ ha.
Mgbanwe ihu igwe nke iji mmanụ ụgbọala, emeela ka e nwee nnukwu idemmiri na mba gbaa gburugburu. Na Saụt Sudan, mmanụ agbidi na-agbapụ na-eme ka mmetụta kawanye njọ.
E kwuru na mmanụ dị na mpaghara ahụ nwee mmetụta na ahụ mmadụ, bụ ihe na-egbu egbu. Idemmiri a emeela ka ọ bụrụ ihe egwu nye ndị Saụt Sudan.
N'afọ 2019, nnukwu idemmiri malitere na Unity steeti nka mba Saụt Sudan. Dịka idemmiri ahụ bidoro na-abawanye n'afọ 2022, ihe ruru pasenti 70 steeti ahụ lara n'iyi site n'idemmiri ahụ.
Idemmiri a metutara mmadụ ruru puku narị asaa (700,000) na mba Saụt Sudan niile ebe ọtụtụ puku mmadụ kwagara na ogige ndị gbaraọsọ bụ Bentiu Camp

Ebe foto si, Getty Images
Otu onye obodo ahụ bụ Nyakuma gwara BBC na idemmiri ahụ machibidoro ha dịka ha na-achịkọta ihe ha kụrụ n'ugbo ha. N'okwu ya "Anyị gbagara n'ogige nchekwa anyị mana nnukwu mmiri ahụ buuru ihe niile."
Ọ gwara anyị na idemmiri ahụ buuru ihe niile o nwere ma gbuo ehi ya niile ma nwetara ya na ezinaụlọ ya oke agụụ.
Idemmiri abụghị ihe ọhụrụ hye mba Saụt Sudan mana ihe dị ịtụ n'anya bụ na ọ na-akawanye njọ kwa afọ ọbụla.
Di Nyakuma gwara anyị na ihe niile dị mma na mbụ tupu idemmiri ahụ e mee.
"Anyị na-enwe ọgbakọ dị iche iche iji nwee obi ụtọ, ụmụaka na-egwu egwu ma na-enwe aṅụrị, mana ụgbụa, ihe niile agbanweela," ka di Nyakuma kwuru.
Mmadụ niiile bi ebe malitere ịgbapụ iji zọọ ndụ ha na ndụ ezinaụlọ ha dị iche iche.
Nyakuma gara n'ihu kwuo na enyemaka gọọmenti nyere ezughị oke n'ihi oke agụụ na ihe isi ika ha na-agabiga.
BBC chopụtara na ọ bụ maka oke agụụ mere ọtụtụ mmadụ jiri gbaga na Bentiu Camp nke otu United Nations hibere iji nyere ndị idemmiri ahụ na agha metụtara aka.
Ihe ruru mmadụ 140,000 nọ n'ogige Bentiu Camp.

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Na Bentiu Camp, otu nwaanyị aha bụ Nyayida jiri ego niile o nwere hibe ebe ọ na-ere ihe oriri. O kwuru na inweta mmiri ọṅụṅụ siri ike maka na idemmiri ahụ metụtara ha oge ha na-atụghị anya.
E hibere mba Saụt Sudan naanị afọ iri na atọ (13) gara aga. Ka ọtụtụ afọ agha gasịrị, a na-atụanya na udo ga-alaghachita na mpaghara ahụ mana ọgụ ka na-aga n'ihu n'ọtụtụ ebe.
Saụt Sudan bụ maba dara ogbenye. Ọ bụ naanị ego mmanụ ụgbọala ka ji enwe olileanya.
David Bojo Leju rụburu ọrụ n'ụlọọrụ mmanụ agbidi Gpoc dị na Unity steeti.
GPOC bụ ụlọọrụ na-ahụ maka mmepụta mmanụ agbidi na Unity steeti oilfield. Ọ bụ mba India, Maleshịa na Chaịna ebe gọọmenti Saụt Sudan na-erite naanị pasenti 5 n'ọrụ ha.
David gwara anyị na ụlọọrụ GPOC mebiri mba Saụt Sudan n'ihi na ha hapụrụ mmanụ agbidi ka ofesasia ebe niile nke metụtara ala mba ahụ.
O kwuru na akụrụngwa GPOC ji arụ ọrụ bụ nke ochie ma bụrụ nke na-adịghị mma iji rụrụ ọrụ.
Ọ gwara na idemmiri a emeela ka ihe niile kawanye njọ.

Ebe foto si, Getty Images
Mmetụta mmanụ agbidi nwere na mmiri mere ka e nwee ọtụtụ ụmụaka a mụrụ na-enweghị anya, aka maọbụ ụkwụ.

Ụlọọgwụ dị na mpaghara Bentiu na Ruweng enweghị akụrụngwa e ji eme nnyocha iji chọpụta ihe nwereike ibute ọmụmụ ụmụaka na-enweghị aka, ụkwụ maọbụ anya.
Dọkita gwara BBC na ọ bụ maka mmetụta mmanụ agbidi metụtara mmiri ọṅụṅụ ha nwereike ibute ajọ ọnọdụ a maka na ha enweghị mmiri ọnụnụ dị ọcha.









