Ihe anyị ma maka nwuchi Onyeisioche Ogbaru, Anambra Steeti maka ebubo ime mpụ ịntanetị n'Amerịka

Ha kwuru na a nwụchiri ya ka o si na Naịjirịa na-abata na mba Amerịka.

Ebe foto si, Getty/Franklin Nwadialo/Facebook

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Aka akparala Onyeisioche Okpuruọchịchị Ogbaru, Anambra Steeti bụ Franklin Ikechukwu Nwadialo na mba Amerịka maka ebubo iji ime ọyị adịgboroja aghọnarị ndị mmadụ ọtụtụ nde dọla.

Nke a dị n’akwụkwọ ozi ngalaba ụlọọrụ ‘U.S. Attorney’ wepụtara n’ụbọchị 5 nke ọnwa Nọvemba 2024.

Ha kwuru na a malitere inyocha Nwadialo n’ọnwa Disemba afọ 2023 n’ọnụ ebubo ruru iri na anọ (14) metụtara isi ụzọ ime ọyi aghụghọ na-aghọnarị ndị mmadụ ego.

Ha kwuru na a nwụchiri ya ka o si na Naịjirịa na-abata na mba Amerịka.

Nwadialo so n’otu n’ime ndị zọrọ ọkwa onyeisioche okpuruọchịchị Ogbaru n’ụbọchị 28 ọnwa Sepụtemba ma merie, e duru ya n’iyi ọrụ n’ọnwa Ọktoba.

Mmadụ iri abụọ na otu a họpụtara n'ọkwa ndịisi okpuruọchịchị Anambra Steeti n'ọnwa Sepụtemba 2024.

Ebe foto si, Anambra First/Facebook

Mpụ a sị na Nwadialo mere

Dịka akwụkwọ rụrụ Nwadialo aka si kwuo, o ji ụzọ aghụghọ napụta ndị mmadụ ego karịrị nde dọla atọ na ụma ($3.3million).

O ji ọtụtụ aha dịka ‘Giovanno’ zute ọtụtụ mmadụ n’ọbaozi ịntanetị dị iche iche. O ji foto adịgboroja na-abụghị foto ya na-agwa ndị ọ na-aghọrị na ọ bụ onye ọrụ agha e zigara ọrụ na mba ọzọ nke mere na ọ gaghị enwe ike izute ha n’ihu n’ihu.

Nwadialo ji aha adịgboroja ahụ na-anapụta ndị mmadụ ego, n’afọ 2020, o kwuru na ndịagha riri ya iwu maka ịgwa onye ahụ ebe ọ nọ ma rịọ onye ahụ ka o nyetụ ego $150,000 iji kwụọ ụgwọ ahụ, n’ikpeazụ ọ natara otu onye ahụ ego ruru $2.4million.

N’ọnwa 2019, Nwadialo napụtara onye ọzọ ego ruru $310,000 ma tụọ asị na ọ chọrọ iji ya lie ozu nna ya nwụrụ anwụ.

Ọ napụtara otu nwaanyị ọzọ ego ruru $270,000 site n’ịghọ ya aghụghọ na ọ chọrọ itinyere ya ego ahụ n’azụmaahịa ‘ego cryptocurrency’.

Nwadialo gakwara n’ihu n’afọ 2020 zutere onye ọzọ n’ọbaozi ebe a na-achọta ọyi nwoke na nwaanyị ma napụta ya ego ruru $310,000 ma tụọ asị na ọ chọro iji ya lie nna ya nakwa kwụọ ụgwọ akwụkwọ nwa ya nwoke.

Ntaramahụhụ e nwereike inye Nwadialo

Dịka iwu mba Amerịka si kwuo, onye ọbụla ikpe maara n’ebubo ndị e boro Nwadialo, a ga-atụ onye ahụ mkpọro ruru afọ iri abụọ ma kpachie ihe niile o ji ego ahụ ọ ghọtara n'aghụghọ mepụta.

Dịka ọ dị ugbua, ihe niile a ka bụ ebubo e boro Nwadialo, a ga-akpụpụ ya n’ụlọikpe dịka ngalaba nchekwa Federal Bureau of Investigation (FBI) ka na-eme nyocha.

A ga-ebuga Nwadialo na ngalaba ụlọikpe dị na Washington maka ịkpe ya ikpe.

Kedụ ihe gọọmentị Anambra Kwuru?

O dochabeghi anya ma gọọmentị Anambra Steeti ekwuola ihe ọbụla banyere akụkọ nwuchi nwamadị a.

BBC Igbo kpọtụụrụ kọmishọna na-ahụ maka mgbasozi bụ Maazị Law Mefor n'ekwentị mana ọ zabeghi.

N'otu aka ahụ, odeakwụkwọ mgbasaozi gọvanọ Soludo bụ Christain Aburime e zigaara ozi ka ha tinye ọnụ azabeghi.

Mana akụkọ si n'ụlọ ntaakụkọ Punch kwuru na kọmishọna na-ahụ maka Okpuruọchịchị obodo bụ Tonycollins Nwabunwanne sị na gọọmentị na-eme nyocha banyere mpụ ahụ a sị na Nwadialo mere.

Ọ gara n'ihu kwuo na gọọmentị anatabeghi ozi ọbụla banyere ya site n'ala ngalaba nchekwa gọọmentị Amerịka.