Etu Labour Party si nweta ndị omeiwu etiti karịrị 20 n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa

Ebe foto si, Abaribe/Umeh/Izunaso/Facebook
Ntuliaka maka ndị ga-ewere oche n'ụlọ omeiwu etiti Naịjirịa - House of Representatives na Senate - abịala ma gafee, mpụtara ha apụtakwala.
Otu ihe tụrụ ndị mmadụ n'anya na mpụtara ntuliaka a nke Inec kpọpụtara bụ na Labour Pati, otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-enwebụghị otu onye omeiwu ma na steeti ma n'Abuja, ugbua nweziri ndị omeiwu nta 20 na ndị sinetị ise, naanị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.
Nke a bụ maka nnukwu nkwado nke ọtụtụ ndị Naịjirịa malitere inye Labour Pati dịka Peter Obi, bụbu Gọvanọ Anambra Steeti, pụtara ịzọ ọkwa onyeisiala na pati ahụ.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Enugwu, Abia na Anambra Steeti bụ ebe ọtụtụ ndị Labour Pati meriri ntuliaka ndị omeiwu etiti dịka ha nwetara oche asaa, isii, na ise na steeti atọ a n'otu n'otu, ma nwetakwa otu otu steeti n'Ebonyi nakwa Imo steeti.
All Progressives Congress bụ pati nke abụọ kacha nweta mmeri n'ụlọ omeiwu nta na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ; mmadụ asaa na pati ahụ meriri nke gụnyere mmadụ atọ n'Ebonyi, mmadụ atọ n'Imo na otu onye n'Abia steeti.
N'aka nke ọzọ, otu Peoples Democratic Party', bụbu pati a kacha mara na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, meriri naanị oche ise n'ụlọ omeowu nta: otu n'Abia, otu n'Ebonyi, na atọ n'Imo steeti.
Naanị n'Anambra steeti ka otu 'All Progressives Grand Alliance' (APGA) meriri oche anọ, ebe otu 'Young Progressives Party' merikwara otu oche na steeti ahụ.
N'ụlọomeiwu ukwu bụ sineti, APC nwetara oche isii - otu n'Abia, atọ n'Ebonyi, na abụọ n'Imo steeti.
LP nwetara oche ise: otu n'Abia, abụọ n'Anambra, otu n'Enugwu, na otu n'Imo.
PDP, bụbu pati ka nwee ọnụọgụgụ ndị omeiwu na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, nwetara naanị otu oche n'Enugwu. YPP na APGA nwekwara otu oche n'Anambra na Abia n'otu n'otu.
Lee aha na pati ndị niile meriri oche ụlọomeiwu n'Ọwụwa Anyanwụ
'ABIA'

Ebe foto si, Abaribe/Orji Kalu/Nwokeocha/Facebook
'HOUSE OF REPS'
Aba North/South - Emeka Sunday Nnamani - LP
Arochukwu/Ohafia - Ibe Okwara Osonwa - LP
Bende - Benjamin Okezie Kalu - APC
Ikwuano/Umuahia North/South Aguocha Obinna - LP
Isiala Ngwa North/South - Onwusibe Ginger Obinna - LP
Isuikwuato/Umunneochi - Ogah Amobi Godwin - LP
Obingwa/Osisioma/Ugwunagbo - Alozie Munachim Ikechi - LP
Ukwa East/West - Nkwonta Chris - PDP
SINETI
North - Orji Uzor Kalu - APC
Central - Darlington Nwokeocha - LP
South - Enyinnaya Abaribe .H. - APGA
ANAMBRA

Ebe foto si, Nwoye/Umeh/Ubah/Facebook
'HOUSE OF REPS'
Aguata - Okafor Dominic Ifeanyi - APGA
Anambra East/West - Aniekwe Peter Udogalanya - LP
Awka North/South - Orogbu Obiageli - LP
Idemili North/South - Okonkwo Uchenna Harris - LP
Ihiala Agbodike Paschal A - APGA
Njikoka/Dunukofia/Anaocha - Ozodinobi George Ibezimako - LP
Nnewi North/South/Ekwusigo - Eleodimmuo Uchenna Nwachukwu - APGA
Onitsha North/South - Emeka Godwin Obiajulu - LP
Orumba North/South - Nnabuife Chinwe Clara - LP
Oyi/Ayamelum - Gwacham Maureen Chinwe - APGA
Ogbaru - Emechabeghị ya
SINETI - ANAMBRA
North - Tony Nwoye - LP
Central - Victor Umeh .C. - LP
South - Ifeanyi Uba .P. - YPP
EBONYI

Ebe foto si, Nwebonyi/Umahi/Eze/Facebook
'HOUSE OF REPS'
Abakiliki/Izzi - Uguru Emmanuel - APC
Afikpo North/South Igariwey Iduma Enwo - PDP
Ebonyi/Ohaukwu - Eze Nwachukwu Eze - APC
Ezza South/Ikwo - Ogah Chinedu - APC
Ezza North/Ishielu - Emechabeghị ya
Ivo/Ohaozara/Onicha - Osikama Nkemkanma - LP
SINETI
North - Nwebonyi Onyeka Peter - APC
Central - Eze Kenneth Emeka - APC
South - Nweze David Umahi - APC
ENUGWU

Ebe foto si, Ezea, Ngwu/Facebook
'HOUSE OF REPS'
Aninri/Awgu/Oji River - Chijioke Okereke - LP
Enugu East/Isi-Uzo - Nnamchi Paul Sunday - LP
Enugu North/South - Atu Chimaobi Sam - LP
Ezeagu/Udi - Sunday Cyriacus Umeha - LP
Igbo-Etiti/Uzo-Uwani - Nwodo Chijioke - LP
Igbo-Eze North/Udenu - Dennis Nnamdi Agbo - LP
Nkanu East/West - Nnaji Nnolim John - PDP
Nsukka/Igbo-Eze South - Obetta Mark Chidi - LP
SINETI
East - Emebeghị ya
West - Ngwu Osita - PDP
North - Ezea Okechukwu - LP
IMO

Ebe foto si, Izunaso/Onyewuchi/Chiwuba/Facebook
'HOUSE OF REPS'
Abo-Mbaise/Ngor-Okpala - Nwogu Mathew - LP
Ahiazu Mbaise/Ezinihitte - Chinedu Emeka - PDP
Ehime Mbano/Ihite-Uboma/Obowo - Okeke Onwuegbuchulam - PDP
Ideato North/South - Ikeagwuonu Ugochinyere
Ikeduru/Mbaitoli - Emechabeghị ya
Isiala Mbano/Okigwe/Onuimo - Onuoha Miriam Odinaka - APC
Isunjaba/Nkwere/Nwangele - Emechabeghị ya
Oguta/Ohaji-Egbema/Oru West - Dibiagwu Eugene Okechukwu - APC
Oru East/Orsu/Orlu - Nwachukwu Chukwugozie - APC
Owerri Municipal/North/West - Okere Tochukwu - LP
SINETI
East - Onyewuchi Ezenwa Francis - LP
West - Osita Izunaso .B. - APC
North - Ndubueze Patrick Chiwuba - APC














