Ihe ị ga-amara maka onye bụbu Onyeisiala Naịjirịa, Muhammadu Buhari nwụrụ anwụ

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Muhammadu Buhari
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Onye bụbu Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari nwụrụ n'afọ iri asatọ na abụọ achịala Naịjirịa ugboro abụọ, dịka onye agha nakwa onye nkịtị.

Amaara Buhari dịka onye na-ekwu eziokwu n'agbanyeghị na a na-ahụ ya dịka onye aka ike.

Buhari zọrọ ọchịchị ị bụ Onyeisiala Naịjirịa ugboro atọ ma daa tupuu o merie n'afọ 2015 nke mere ya onye mbụ na-anọghị n'ọchịchị meriri gọọmenti nọ n'ọchịchị na Naịjirịa.

N'afọ 2019 ka ọ zọkwara ọchịchị ma merie nke nyere ịchị Naịjirịa afọ asatọ dịka onye nkịtị.

Ndị ogbenye na mpaghara ugwu Naịjirịa ma ya amaa mana n'afọ 2015 ka o ji ohere njịkọ patị ndị na-anọghị n'ọchịchị jikọrọ ọnụ nwere merie.

Ọtụ ndị kwadoro ya n'oge ahụ chere na dịka onye agha na ọ bụ ihe Naịjirịa chọrọ n'oge ahụ maka na ndị na-enyi ọha egwu dịka Boko haram na ndị ọzọ na-akpa mkpa mkpa na mpaghare ugwu.

Buhari kwekwere nkwa ibuso mpụ na nrụrụ aka agha ma nye ndị ntorobia ọrụ.

Mana ọchịchị ya dabara mgbe ụwa na-enwe nsogbu akụnụba nakwa ọnụ ahịa mmanụ agbịdị daraada nke mere Naịjirịa jiri baa na nsogbu akụnụba.

A katọkwara ọchịchị ya maka etu o si eme ihe gbasara nchekwa na ndị na-enyi ọha egwu.

Mgbe ọ na-azọ ọkwa ka ọ sịrị na ya ga-emeri ndị Boko Haram mana nke ahụ emeghị.

Ihe ọzọ bụ na ndị ọrụ ugbo na ndị Fulani na-achị ehi wekere nnukwu ọgbaaghara mgbe ọ na-achị nke mere ndị mmadụ ji na-ata Buhari ụta maka na ọ bụ onye Fulani ma sị na-adịghị eme ihe o kwesiri ime ka nke ahụ kwụsị.

Ndị omekome na mpaghara ugwu na-atọrọ ọtụtụ ụmụakwụkwọ n'ọchịchị ya.

Ndịagha gọọmenti ya ka a na-ebo ebubo imegide ikike dịaara mmadụ ọkọchasị mgbe ndịgha wakporo ndị na-eme ngagharịiwe na Lekki Tollgate dị na Legos steeti n'ọktoba , 2020.

Aha onyonyo, Ihe e ji echeta ndụ Onyeisiala Buharị ka ọ nwụrụ

Onye bụ Muhammadu Buhari?

Muhammadu Buhari bụ onye a mụrụ Desemba 1942 n'obodo a na-akpọ Daura dị na Katsina steet, na mpaghara ugwu Naịjirịa.

Obodo ya dị nso n'agbata oke Naịjirịa na mba Niger.

Mana nna Buharị bụ onye Fulani. Ọ nwụrụ mgbe Buharị dị naanị afọ anọ mana nne Buhari bụ onye zụrụ bụ onye Kanuri.

N'afọ 2012 ka Buhari kwuru na ya bụ nwa nke atọ n'afọ nna ya ma bụrụ nwa nke iri na atọ nne ya mụrụ.

Ọ sị na naanị ihe ya na-eche maka nna ya bụ mgbe o bu ha n'azụ nyịya.

Buhari

Ebe foto si, AFP

Mgbe Buhari na nwatakịrị ka ọ gụrụ akwụkwọ na ụlọakwụkwọ Praịmarị dị na Daura, Katsina steeti.

Ọ mechere banyere ndịagha Naịjirịa ka mba ahụ wetere nwere onwe n'aka briten.

Bụharị gara ọzụzụ ndịagha n'UK site na 1962 ruo 1963 ma site n'ọkwa banye n'ọkwa ọzọ.

Mgbe ndịagha weere ọchịchị na Naịjirịa n'afọ 1966 nakwa ịkwatu gọọmenti dị icheiche mere n'oge ahụ ka Buhari kwuru na ọkwa ya dị obere ị soro na-eme ihe mere n'oge ahụ.

Mana ihe dịka afọ iri ka Buhari rigoro n'ọkwa nke mere ya Gọvanọ nke 'North east' bụ nke steeti isii si n'ime ya pụta.

E mechere nye Buhari ọkwa kọmịshịọna na-ahụ maka mmanụ agbịdị (bụ mịnịsta) n'ọchịchị Olusegun Obasanjo n'afọ 1976.

Ịhazị ihe na nrụrụ aka

Buhari bụ ọchịagha n'afọ 1978 dịka kọnel mana ihe e ji echete ya bụ etu o si chụpụ ndịagha Chad nweere ala Naịjirịa bụ nke ọ ji ndị agha chụpụ ha n'afọ 1983.

N'afọ 1983 ka ndịagha wepụrụ Onyeisiala Shehu Shagari n'ọkwa nke mere Buharị jiri banye n'ọchịchị. N'oge ahụ ọ bụzị ọchịagha Majọ.

Buhari si na ya esoghi wepụ gọọmenti na ọ bụ ndị wepụrụ Shehu Shagari n'ọkwa tinyere ya ma mechaa wepụkwa ya onwe ya.

Mana a na-ekwu na o so wepụ gọọmentị Shehu Shagari bụ nke ọ kweghị na ya so.

Buharị chịrị naanị ọnwa iri abụọ tupuu a kwatuo gọọmenti.

Mana a maara oge ahụ dịka mgbe a na-ebu agha emegide mpụ, mkpagbu mmadụ na ịhazị ihe n'usoro n'usoro.

A tụrụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ruru 500, ndị ọrụ gọọmenti na ndị ji ego achụ ego nga.

Ka ọtụtụ na-ahụ ya dịka ọchịchị aka ike ndị ọzọ na-ekwu na ọchịchị ya buru agha megide mpụ na nrụrụ aka.

Nke a mere e ji ahụ ya dịka onye na-ekwu eziokwu n'etiti ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Naịjirịa.

Mmeri Buhari wetere na ntuliaka

N'afọ 2005 ka Buhari kwuru na "ndịagha kwaturu gọọmenti na 1983 mere mgbe ọ dị mkpa".

Ọ gọrọ na etu ya si kpasa ndị ntaakụkọ na ndị ọzọ agwa mgbe ọ nọ n'ọchịchị abụghị nke aka ike kama na ọ bụ n'usoro iwu.

Muhammadu Buhari na nwunye ya bụ Aisha Halilu

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Nwunye Buhari, Aisha, na Buhari

Buhari Banyere n'ọkwa dịka Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2015 dịka onye mbụ meriri gọọmenti na-achị kemgbe Naịjirịa bidoro ọchịchị onye kwuo ushe ya n'afọ 1999.

Dịka Onyeisiala, a na-ahụ Buhari dịka mmadụ a gaghị arafunwu ime nrụrụ aka. Buhari kwuru na ya ekweghị eme ihe

'Akpa osikapa'

N'oge Buhari na-apụ n'ọchịchị ka a juru ndị mmadụ ọ bụ gịnị ka ha ga-eji cheta ya, ọtụtụ n'ime ha kwuru na ọ bụ nnukwu akpa osikapa. Ihe onyonyo emere maka ya fesere ebe niile na Naịjirịa.

Mana ihe kpatara ya bụ na akpa osikapa ndị nnukwu 50kg bụ N7,500 ka a ba-ere ya n'ọchịchị Goodluck Jonatham mana ọ rịrị ruo N60,000 n'ọchịchị Buhari.

Nke a butere agụụ na ihe ụkọ na Naịjirịa.

Buhari machiri mbubata osikapa na mba ofesi i ji kwado ndị ọrụ ugbo na-akọpụta ya na Naịjirịa mana nke ahụ mere ọnụ ahịa ya ji rịa.

Ismail Danyaro bi na Kano steeti kwuru na ya kwadoro Buhari kemgbe afọ 2003 mana mgbe Jonathan na-achị na ya na-azuwu akpa osikapa 50kg mana kemgbe Buhari banyere n'ọchịchị na ya enweghịzị ego ịzụ ọkara ya bụ 25kg.

O were mgbe ihe meketere n'ọchịchị Buhari nwunye ya sị na ya agaghị akwado ọchịchị ọzọ ma ọ chọrọ ịzọ ọkwa nke abụọ.

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Buhari

Mgbe e turu ya aha 'Baba go slow'

Ụmụ amala Naịjirịa turu Buhari aha kpọọ ya 'Baba Go Slow' maka etu ọchịchị si ghara ime ihe ọbụla doro anya n'oge.

Ihe karịrị ọnwa ole ma ole kemgbe ọ banyere n'ọchịchị.

Ịma atụ, a ka na-akpọ onye agha chiburu Naịjirịa bụ Ibrahim Badamasi Babangida "Maradona" maka etu o si akpa agwa dịka onye ọchịchị.

Mana 'Baba Go Slow' a kpọrọ Buhari bụ maka na ọchịchị enweghị ike ịhọpụta mịnịsta na ndị ga-eso ya chịa ruo ihe ruru ọnwa isii mgbe ọ banyechere n'ọchịchị n'afọ 2025.

N'oge o kwuru okwu maka Baba go slow kla ọ sị na "ọ bụ eziokwu na-anyị ji nwanyọọ (slow).

Ọ bụghị baba na-aga nwaanyọọ mana ọ bụ etu ọnọdụ ọchịchị si dị ugbua.

Etu Buhari si dowe ahụ n'oge ọ chọrọ inyefe ọchịchị

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Mana n'afọ 2022 ruo 2023 bụ oge a kpụ n'ọnụ banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Naịjirịa.

Ọ bịara dịka na mgbe mbụ Onyeisiala Naịjirịa achọghị ịma onye ga-anọchịta anya ya ma ọ pụọ n'ọkwa.

Buhari pụtara sị na ya ga-akwado onye ọbụla meriri ntuliaka praịmarị patị ya mana ndị mmadụ kwuru na o were onye ọ na-akwado.

Nke a mere mmadụ ise na-azọ ọkwa onye ga-anọchị anya ya.

Ọzọ bụ na e nwere mgbe o ruru ọdị ka ọ dịghị akwado Bola Tinubu.

Ihe mere bụ na Buhari wepụtara atụmatụ a kpọrọ 'Naịra swap' bụ atụmatụ o chere ga-ebelatara etu e si eji ego eme ihe na ntuliaka 2023.

Ọtụtụ ndị Naịjirịa kwetere na ọ bụ maka Tinubu ka e jiri tinye iwu ahụ.

Iwu ahụ mere gọọmenti emebie ọtụtụ ego ochee ma bipụta ego ọhụrụ.

Ndị mmadụ takwara ahụhụ maka na ego ọhụrụ ahụ ezughị oke nke mere e ji na-azụ ego azụ.

Ọ bụ ụlọikpe kacha na Naịjirịa wezugara iwu ahụ ka ọ fọrọ naanị abalị ole ma ole ka e mee ntụlịaka Onyeisiala.

Tinubu ji naani Pasenti iri atọ na asa (37%) merie maka na ndị na-anọghị n'ọchịchị ejikọghi onwe ha ọnụ.

Ọchịchị Buhari metutakwara ahụike ya nke mere o jiri pụọ gaa ụlọọgwụ na mbido ọchịchị nke mbụ.

Buhari nwereike ime ka a na-ahụ ya dịka onye nabatara ọchịchị onye kwuo uche ya mana o kpuchiri ihe gbasara ahụike ya, ụmụ amaala Naịjirịa amaghị ihe ọbụla gbasara ahụike onye na-achị ha.

Buhari lụrụ nwaanyị ugboro abụọ, nke mbụ bụ Safinatu Yusuf site na 1971 ruo1988, ọzọ bụ n'afọ 1989 mgbe ọ lụrụ Aisha Halilu bụ onye ọ lụrụ ruo mgbe ọ nwụrụ. Buhari mụrụ ụmụ iri.