France riots: Nchịkọta ihe merela kamgbe ndị uweojii gbagbuchara otu nwokoroọbịa

Ndị uweojii na-achụ ndị na-eme ngagharịiwe ọsọ

Ebe foto si, Reuters

Kamgbe ndị uweojii gbagbuchara otu nwokorọbịa a kpọro Nahel n’izuụka gara aga, ngagharịiwe na ọgbaghara dapụtara na mba Fransị.

Ngagharịiwe a werela abalị ise alaala ọtụtụ akụnaụba, ụlọọrụ nakwa ihe ndị ọzọ n’iyi ebe ndị uweojii ejichiela mmadụ ruru 719.

Aha onyonyo, What social media videos reveal about Paris teen's death

Obodo ebe ngagharịiwe a kachasị metụta bụ na mpagharan Southern Marseille.

Na mpaghara Paris bụ isiobodo Fransị, ndị na-eme ngagharịiwe nyaara ụgbọala sọnye isi n’ụlọ Mayor L’Hay-les-Roses, merụọ nwunye ya ahụ dịka ọ chọrọ ịkpọrọ ụmụ ya abụọ gbaa ọsọ.

Mayor bụ Vincent Jeanbrun katọrọ agwa ndị kpara ma sị na ha chọrọ ịmụnye ụlọ ya ọkụ ma gbuo ezinaụlọ ya.

Aha onyonyo, Blasts heard as police throw tear gas in Marseille

Ndị uweojii gbagburu Nahel dị afọ 17 maka na o kwesghi akwụsị ụgbọala ọ nya mgbe ha chọrọ inyocha ya n’ụbọchị Tuzde 27 Juun, 2023.

E liri ozu nwamadị a n’ụbọchị Satọde dịka ndị mmadụ pụtara n’igwe kwaa ozu ya.

N’ihi ngagharịiwe a, ndị uweojii ọnụọgụgụ ha ruru 45,000 jupụtara n’ọtụtụ okporoụzọ dị n’obodo dị iche iche na mba Fransị iji gbochie ndị a.

Ndị uweojii a nwuchiri ọtụtụ ndị na-eme ngagharịiwe na mpaghara mba Fransị.

Ihe i kwesịrị ịma maka Nahel ndị uweojii gbagburu

Mounia,nne Nahel

Ebe foto si, EPA

Ogbugbu ndị uweojii gburu nwata gbara afọ 17, aha ya bụ, Nahel M, ebutela ngagharịiwe n'ọtụtụ obodo na mba Fransị nakwa obodo Nanterre bụ ebe a mụrụ nwata ahụ n'Ọdịda Anyanwụ Paris.

Mịnịstrị na-ahụ maka ihe na-eme n'obodo nke mba Fransị kwuru ụbọchị Satode na e zipụla ndị uweoji dị 45,000 maka ibelata ọgbaghara ma nwụchie mmadụ 1,311 ndị ha kwuru so eme ngagharịiwe dịka ọgbaghara ahụ bara abalị anọ.

Ndị uweojii gbara Nahel egbe n'obi ụbọchị Tuzde dịka nwata ahụ kwọpụrụ ụgbọala Mercedes ọ na-anya oge ndị uweojii kwụsịrị ya n'ebe nkwụsị ha.

Na mbụ, ndị uweojii boburu ebubo na Nahel ji ụgbọala ya chọrọ ịkụ ha, mana ihe onyonyo gbara na soshal midia gosiri etu onye uweojii si tụdo ya egbe site na mpio ụgbọala ya ma gbagbuo ya.

Onye bụdị Nahel?

Ndị na-eme ngagharịiwe maka ọnwụ Nahel

Ebe foto si, EPA

Nahel bụ otu mkpụrụ anya ji isi ụgwọ dịka ọ bụ naanị nwa nne ya bụ Mounia mụrụ.

Ọ na-akwọrọ ụlọọrụ na-ere ihe oriri ụgbọala ma bụrụkwa onye egwuregwu 'rugby'.

Ọ bụ onye Algeria/Morocco mana a mụrụ ya na Fransị, ike kwe, nwa ahụ amaghị onye bụ nna ya.

Agụmakwụkwọ ya bụ a gụkata a kwụsị mana ọ na-aga akwụkwọ ebe ọ na-enweta ọzụzụ ịbụ onye 'eletrician'.

Mama nnukwu ya kọwara Nahel dịka "ezigbo nwata anaghị achọ nsogbu".

Nne ya bụ Mounia kwuru na "O susuru m ọnụ ma sị m, 'Ahụrụ m gị n'anya, nne m' n'ụtụtụ Tuzde tupu m gawa ọrụ".

Mana o teghị aka n'ebe Elekere Itoolu n'ụtụtụ, e wetaara ya ozi na a gbagbuola nwa ya nwoke.

Nwa ahụ dị afọ 17 erubeghị ogo inwe akwụkwọ ikike ịkwọ ụgbọala.

Ndị na-eme ngagharịiwe

Ebe foto si, Getty Images

Nne ya nọ na-atụ arịrị sị, "Kedụ ihe m ga-emezi ugbua?

"Ihe niile m na-eme na ndụ bụ maka ya."

"Otu nwa ka m nwere, enweghị m ụmụ iri. Ya bụ ndụ, bụrụ ezigbo enyi m."

Onye ndu otu Socialist Party bụ Olivier Faure, kwuru sị, "Mmadụ ịjụ ịkwụsị ụgbọala ya abụghị ya ga-enye mmadụ ikike igbu mmadụ. Ụmụaka nile nọ n'obodo anyị kwesịrị inweta ikpemnkwụmọtọ."

Kedụ ihe iwu Fransi kwuru maka onye uweojii ịgba egbe n'okporoụzọ?

Ndị uweojii mba Fransị

Ebe foto si, Reuters

Iwu mba Fransi nyere onye uweojii ikike ịgba egba egbe n'okporoụzọ n'ọnọdụ ise gụnyere onye nọ n'ime ụgbọala jụ ịkwụsị oge a gwara ya, ọ bụrụ na onye uweojii na-eche na o nwere ike imerụ ya maọbụ ndị mmadụ nọ nso ahụ.

Ka ọ dị ugbua, a na-enyocha ihe mere,dịka a kpụpụrụ onye uweojii gbara egbe ahụ ụlọikpe.

Ọgbaaghara na mba Fransị abanyela ụbọchị nke anọ, dịka a na-akwado Nahel

Ọgbaaghara dapụtara na mba Fransị n'ihi ogbugbu Nahel, abanyela ụbọchị nke anọ, dịka a na-akwado ili nwata nwoke ahụ n'ụbọchị Satọde, Julaị 12023.

Ya bụ ọgbaaghara malitere kamgbe ụbọchị Tuzde dịka ndị mmadụ ka na-emebi ọtụtụ ihe na mpaghara Nanterres, Marseille nakwa ebe ndị ọzọ.

Gọọmentị Fransị nakwa nke mpaghara Nanterre, ebe Nahel na nne ya bi, akatọọla ogbugbu a, mana ọtụtụ na-ekwu na ọgbaaghara a agafeela naanị maka ngosipụta iwe maka ọnwụ Nahel.

Onye uweojii gbagburu Nahel arịọla ezinụlọ ya mgbaghara dịka a kpụpụkwara ya ụlọikpe maka ebubo igbu ọchụ.

N'abalị Fraịde, ndị ntorobịa na-eme ngagharịiwe na ndị uweojii takọtara isi na mpaghara dị icheiche, dịka ndị na-eme ngagharịiwe na-atụ ndị uweojii ọkụ na-ada ka ogbunigwe, ebe ndị uweojii ji ikuku ose na-achụ ha.

Mounia,

Ebe foto si, EPA/REX

Nkọwa foto, Mounia, nne Nahel kwuru na "O susuru m ọnụ ma sị m, 'Ahụrụ m gị n'anya, nne m" n'ụtụtụ Tuzde tupu m gawa ọrụ" o teghị aka e zitere ya ozi na agbagbuola nwa ya.

Onyeisiala Macron arịọla ndị ntorobịa na-eme ngagharịiwe ka iwe ha dajụọ, n'otu aka ahụ kwa, ndị otu bọọlụ mba Fransị arịọkwaala ka ndị na-eme ngagharịiwe wetuo obi ha ma kwụsị imebi ihe dịịrị onye ọbụla, mana arịrịọ ndị a emebeghị ka udo laghachi.

Mmemme olili nwata nwoke a ndị uweojii gburu ga-adị n'ehihie ụbọchị Satọde, dịka ndị ọkaiwu nke ezinụlọ ya si kwuo.

Ha gwara ndị ntaakụkọ ka ha ghara ịbịa n'olili ahụ, maka na ọ ga-abụ oge iji kwanyere nwata ahụ lara mmụọ ugwu.

N'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ, Mayor nke obodo Nanterre bụ Patrick Jarry kwuru na sonyeere ezinụlọ Nahel nakwa igwe mmadụ niile na-akpọ oku maka ikpe ziri ezi.

Ọ gara n'ihu kwuo na ha ga na-enye nne Nahel nkwado niile dị ya mkpa.