Aspartame, akụrụngwa ọtọbịrịbịrị a na-etinye na mmanya - ọ na-ebute kansa?

Nwaanyị na-aṅụ mmanya ọtọbịrịbịrị

Ebe foto si, Getty Images

Otu ahụike mbaụ bụ 'World Health Organisation' ga-ekwupụta na 'aspartame' - akụrụngwa ọtọ bịrịbịrị a na-etinye na mmanya - nwereike ị na-ebute ọrịa kansa.

Nke a ebutela nghọtahie maka na o dobeghị anya ma ihe na-akpata kansa n'ime 'aspateme' ọ dị ukwu ka ọ dị nta.

Ngalaba 'International Agency for Research on Cancer' (IARC) ga-ekwupụta nke n'ụbọchị 14 nke ọnwa Julaị.

'Aspartame' bụ akụrụngwa a na-eji eme ka ihe oriri dị icheiche tọọ ụtọ kama itinye ya 'sugar'.

Ọ bụ akụrụngwa e ji emepụta mmanya ụtọ dị icheiche bụ nke ndị nwere ọrịa shuga nwereịke ị na-aṅụ.

Ọtụtụ ndị mmadụ na-agbaso ihe oriri ndị nwere ihe ụtọ ndị ọzọ na-abụghị 'sugar' n'ihi na ha na-eche na ọ ka mma n'ahụike karịa ndị nwere sugar.

Gịnị dị n'ime 'Aspatame?

Onye na-aṅụ mmanya

Ebe foto si, Getty Images

Ụtọ dị n'aspartame' ji ugboro 200 karịa nke sugar, nke pụtara na ọ ga-eme ka ihe tọọ ụtọ, na-enyeghị onye na-eri ya 'calories'.

"Calories' bụ ihe na-eme ka mmadụ na-ebu oke ibu.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ọtụtụ ihe e ji 'asapartame' arụpụta gụnyere Diet coke, coke zero, Pepsi Max, na 7Up Free, na ọtụtụ mmanya ọtọ bịrịbịrị ndị ọzọ.

Nnyocha gosiri na ihe oriri maọbụ ihe na-aba n'ọnụ e ji 'aspartame' arụpụta karịrị 6000 n'ọnụọgụgụ.

Otu IARC bụ ngalaba nnyocha nke WHO, ha kwuru na ha tụlere nnyocha karịrị 1300 e merela gbasara akụrụngwa a bụ 'asapartame' nakwa etu o si emetụta ahụike.

E nwere ogogo anọ nke IARC ji etinye akụrụngwa nwereike ịkpata kansa. Ha bụ:

  • Ogogogo mbụ - Ọ na-akpata kansa (Carcinogenic to humans)
  • Ogogo 2A - Ọ dịka ọ na-akpata kansa (Probably carcinogenic to humans)
  • Ogogo 2B - O nwereike ịkpata kansa (Possibly carcinogenic to humans)
  • Ogogo 3 - O soghị n'ihe na-akpata Kansa (Not classifiable)

Asparteme nọ n'ogogo nke 2B.

"Mana ogogo ndị a IARC wepụtara agaghị agwali anyị ole 'aspatarme' ga-adị n'ahụ mmadụ iji dị njọ," Kevin McConway, ọkammụta na ngalaba 'Statistics' n'ụlọakwụkwọ Open University, kọwara.

IARC na-akọwa na e nwere ihe akaebe na akụrụngwa a dị njọ, ọ na-aghị akọwa etu o si jọọ oke njọ n'ahụike.

Ọkammụta McConway kwuru sị, "Ana m eche na akaebe gbasara 'asapartame' ịkpata kansa esichaghị ike, maka na ọ bụrụ na o siri ike, ha gaara etinye ya n'ogogo 1 maọbụ 2B,"

Kamgbe afọ 1981, otu WHO nyere nkọwa ka mmadụ ghara ị na-eri ihe nwere 'aspartame' karịa miligaram 40 maka otu KG ibu mmadu. Nke a pụtara ihe dịka okpokoro mmanya 12 ruo 36 kwa ụbọchị maka onye ibu ahụ ya bụ 60kg.

Otu dị icheiche dịka 'Council of Beverages Associations' (CBA) nakwa 'International Sweetners Association' (ISA) akatọọla akwụkwọ a nke ndị IARC na-akwado iwepụta.

Kate Loatman nke CBA kwuru na "nke a nwereike ime ka ndị mmadụ malite iri ihe nwere sugar, kama ịhọrọ ndị na-enweghị sugar, bụkwa ndị ka mma maka ahụike".

Frances Hunt-Wood nke otu ISA kwuru na emeela ọtụtụ nnyocha gbasara 'asapartame' iji mara ma ọ na-ebute nsogbu n'ahụike, mmana "ihe karịrị otu 90 na mba ụwa dị icheiche ekwuola na ọ dị mma".

Ndị nwere ọrịa a na-akpọ phenylketonuria maọbụ PKU agaghị erinwu ihe nwere 'aspartame' maka na ahụ ha anaghị agbarinwu ya.