Ụlọụka enyela ụfọdụ ụmụagbọghọ 'Certificate of virginity' ka e mechara ha nnyocha

Bu Si Eh Facebook page

Ebe foto si, Bu Si Eh Facebook Page

Foto ebe ụmụagbọghọ ji asambodo gosiri na ha gafere nyocha maka ịmata ma nwaanyị amatala nwoke nke ụlọụka ha mere ha , na-efegharị na soshal midia.

Otu n'ime ụmụagbọghọ ahụ depụtara n'akara facebook ya na ụlọụka ha dị na South Afrịca enyela ụfọdụ ụmụagbọghọ nọ n'ụlọụka ahụ asambodo gosiri na ha amabeghị nwoke.

Ha mere nke a iji kwado ụmụnwaanyị na-akwabeghị iko n'obodo.

Ụlọụka ahụ akpọrọ 'Nazareth Baptist Church' dị n'Ebuhleni , dị na Durban na South Afrịka.

Akụkọ kwuru na ya bụ ụlọụka mere nyocha ime ahụ n'efu nye ụmụnwaanyị dị afọ iri na asatọ wee gbagowe.

Ụlọụka ahụ na-eme emume a kwa afọ , emecha ya , e nye ndị a chọpụtara na ha amabeghị nwoke asambodo ma ka ha uhie ọcha n'isi.

Ụmụagbọghọ ndị ahụ na-echebiri ya bụ emume.

Asambodo ndị agbọghọ na-amabeghị nwoke

Ebe foto si, Bu Si Eh Facebook page

Nkọwa foto, Akụkọ kwuru na ya bụ ụlọụka mere nyocha ime ahụ n'efu nye ụmụnwaanyị dị afọ iri na asatọ wee gbagowe.

A na-emekarị ya bụ emume kwa etiti afọ ọbụla nke bụ ya bụ asambodo agaghị adịzị ire ma etiti afọ ọzọ ruo.

Emere emume nyocha maka ịma ma nwaanyị amatala nwoke nke afọ 2022/2023 ma nye ọtụtụ ụmụagbọghọ mere ọfụma asambodo.

Ọ bụ onyeisi ụlọụka ahụ binyere aka n'akwụkwọ asambodo ahụ na-efegharị.

Anyị ka na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ ụlọụka ahụ ugbua.

Akụkọ na-abịa