African Eye: Nwoke Chaịna na-akpa ego site n'ime ụmụaka Afrịka akaja
E nwere mgbere ihe onyonyo na-ewu n'ụfọdụ ebe n'ụwa ọkachasị na mba Chaịna.
Ọtụtụ ya bụ ihe onyonyo na-egosikarị ụmụaka eji ezi ozi mgbe ndị mmadụ na-eme emume pụrụiche dịka ụbọchị ncheta ọmụmụ ha.

A na-ere ihe onynyo ndị a ihe dịka dọla iri asaa.
Kama enwere nke kpaliri iwe ndị mmadụ mgbe ihe onyonyo gosiri ụmụaka na-ekwu na ha bụ ajọ anụ dị ojii ma kwuo na ha enweghị ọgụgụ isi.
Nke a mere ka BBC African Eye zọpụ njem iji mata ndị na-eme ihe onyonyo a na ihe ha bu n'obi were eme ya.
Akụkọ a bụ maka ihe ha chọpụtara.






