Eduola Emmanuel Iwuanyanwu n'iyi ọrụ dịka onyeisi ọhụrụ nke Ohaneze Ndigbo

Emmanuel Iwuanyanwu

Ebe foto si, Ohaneze Ndigbo

Otu ndị okenye nke Ohaneze Ndigbo a na-akpọ 'Imeobi Ohaneze' eduola Emmanuel Iwuanyanwu n'iyi ọrụ dịka onyeisi ọhụrụ nke otu ahụ.

Ndị gọvanọ steeti ise dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, ndị ụkọchukwu a ma ama, ndị eze ọdịnala dị icheiche, nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu, gbakọrọ n'ụlọ gọọmentị nke Enugwu Steeti n'ụbọchị Sọnde, bụ ụbọchị 30 nke ọnwa Eprel 2023, bụ ebe ha nọrọ nye Iwuanyanwu nkwado ha.

Emmanuel Iwuanyanwu na ụfọdụ ndị gọvanọ steeti dị n'Ọwụwa Anyanwụ

Ebe foto si, Ohaneze Ndigbo

Nkọwa foto, Nkwado ndị gọvanọ na ndị okenye Igbo dị mkpa maka onye ọbụla ga-abụ onyeisi otu Ohaneze Ndigbo

Iwuanyanwu ga-anọchi anya George Obiozor bụbu onyeisi otu Ohaneze Ndigbo tupu ọ laa mmụọ n'ọnwa Disemba 2022.

Cheta na ọ bụ ndị okenye Ohaneze nke Imo Steeti bu ụzọ họpụta Iwuanyanwu dịka iwu otu Ohaneze si dị, mana ọ bụzi ndị Imeobi ka ọ dịịrị inye ya nkwado ma kpọpụta aha ya dịka onyeisi ọhụrụ nke Ohaneze Ndigbo n'ụwa niile.

Iwuanyanwu kwuru na ya ji obi ya niile na-anabata ọrụ ịbụ onyeisi Ohaneze, ma kwe nkwa na ọchịchị ya ga-agbado anya n'atụmatụ ga-eweta mwulite ọnọdụ agụmakwụkwọ, nkọpụta ihe oriri, mmepe obodo, mmepụta ọkụ latrik, mwulite ọnọdụ ahụike na ihe ndị ọzọ na mpaghara ala Igbo.

Imeobi ga-enye nkwado tupu Iwuanyanwu amalite ọrụ ka onyeisi Ohaneze - Alex Ogbonnia

Emmanuel Iwuanyanwu

Ebe foto si, Emmanuel Iwuanyanwu

Nkọwa foto, Emmanuel Iwuanyanwu

Ọnụ na-ekwuru otu Ohaneze Ndigbo bu Alex Ogbonnia akọwaala na Emmanuel Iwuanyanwu amalitebeghị ọrụ kpọmkwem dịka onyeisi ọhụrụ nke otu ahụ.

Ogbonnia nyere nkwa n'akwụkwọ ozi o wepụtara gbasara akụkọ pụtara n'ụbọchị Wenezde nke na-ekwu na Emmanuel Iwuanyanwu abụrụla onyeisi ọhụrụ nke otu Ohaneze.

Ọ kọwara na ihe mere bụ na otu 'National Executive Committee' nke Ohaneze gwara ndị okenye Imo steeti ka ha si n'ime onwe ha họpụta onye ga-anọchi anya George Obiozor nwụrụ anwụ, n'ihi na ọ bụ ndị Imo steeti ka o rutere iwepụta onye ga-abụ onyeisi Ohaneze.

"Obi aṅụrị juru ọtụtụ ndị Igbo n'obi oge akụkọ pụtara na ndị okenye Imo Steeti, nke onyeisi ha bụ eze Ilomuanya, gakwuru gọvanọ Imo Steeti bụ Hope Uzodinma iji kwuo na ha ahọpụtala Emmanuel Iwuanyanwu dịka onye ha họpụtara."

Ogbonnia kọwara Iwuanyanwu dịka otu n'ime ndị Igbo ji eme ọnụ n'ụwa niile, ma bụrụkwa nnukwu mmadụ onye okwu ya na-ada ụda n'ihe niile

"Ma n'azụmahịa, ma na nhibe ụlọọrụ dị icheiche iji nye ọtụtụ mmadụ ọrụ, ma n'ọchịchị obodo, ma n'ọchịchị Ohaneze, ma na nrite ọtụtụ nturuugo na nkwanyeugwu na Naịjirịa nakwa mba ofesi, Iwuanyanwu zuru ka e mee," Ogbonnia kwuru.

"Anyị na-akpọku ndị otu Imeobi Ohaneze Ndigbo ka ha nye nkwado ha maka nhọpụta a nke bụ mmalite ihe ọhụrụ dị mma maka ndị Igbo," Ogbonnia kwuru.

Ahọpụtala Emmanuel Iwuanyanwu ka ọ bụrụ onyeisi ọhụrụ nke Ohanaeze Ndigbo

Onyeisi ọhụrụ nke Ohanaeze Ndigbo

Ebe foto si, Emmanuel Iwuanyanwu/Facebook

Otu jikọtara ndị Okenye n’Imo Steeti a kpọrọ ‘Imo State Council of Elders’ na ndị ndu Igbo ndị ọzọ ahọpụtala Emmanuel Iwuanyanwu dịka onyeisi Ohanaeze Ndigbo ọhụrụ.

Ndị okenye a kwuru na ha mere mkpebi a site na nzukọ ha mere n’ụbọchị Tọzde 13 Eprelu, 2023.

Ha kwuru na kamgbe George Obiozor jibu ọkwa ahụ nwụchara na oche ahụ tọgbọ na nkịtị na ọ ga-abụ ohere ndị Imo steeti ịhọpụta onye ga-anọchi oche ahụ.

N’ihi nke a ha jiri kpebie ịhọpụta nwafọ Imo steeti ṅụjuru mmiri ara afọ, aha e ji eje mba dị ka Emmanuel Iwuanyanwu dịka onye tozuruoke ịbụ onyeisi Ohanaeze.

N’okwu nnabata ọkwa a, Iwuanyanwu sị na obi juru ya afọ maka mkpebi a ndị okenye Imo mere ma sị na ọ nabatara ọkwa n’obi ọcha.

O kwuru na ọchịchị ya ga-ehiwe kọmitii ndịisi hụrụ kwaa okpu ma bịa n’azụmaahịa iji gosi ụwa na ọ bụ site n’azụmaahịa ka ndị Igbo ga-eji ewere ọnọdụ ha na Naịjirịa.

Iwuanyanwụ gara n’ihu kwuo na ọ ga-ehiwekwa kọmitii na-ahụ maka agụmaakwụkwọ n’Ohanaeze Ndigbo nakwa ọtụtụ ọrụ ndị ọzọ.

Gọvanọ Hope Uzodimma nke Imo Steeti kwuru na Iwuanyanwu arụọrọla ndị Igbo ọrụ kamgbe afọ iri ise gara aga ma kelee ya etu o si nabata ọrụ ọzọ ndị Igbo nyere.

Ihe i kwesịrị ịma maka Iwuanyanwu

Ọ bụbu onyeisioche ndị okenye Ohanaeze Ndigbo

Ebe foto si, Emmanuel Iwuanyanwu/Facebook

  • A mụrụ Iwuanyanwụ onye e ji ‘Ahaejiejemba’ maara n’ụbọchị anọ nke ọnwa Sepụtemba, 1942 n’obodo Atta n’okpuruọchịchị Ikeduru, Imo Steeti.
  • Ọ hụrụ akwụkwọ na mahadu Naịjirịa dị na Nsukka na ngalaba ‘civil engineering’.
  • Ọ rụrụ ọrụ n’ụlọọrụ Hardel na Eric bụ ndị na-arụ ụzọ na ụlọ bụ nke o mechara zụta site n’aka ndị ofesi nwee ụlọọrụ ahụ.
  • Ọ bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa onye oji ego achụnta ego a ma ama na Naịjirịa nakwa mbaụwa.
  • Ọ bụ ya hibere otu egwuregwu bọọlụ Iwuanyanwu Nationale dị n’Owerri, nke a na-akpọzi Heartland FC ugbua.
  • Ọ lụrụ nwunye ya Eudora Ozinyereaku Anyanwu bụ onye nwụrụla anwụ dịka ha mụtara ụmụ asatọ (nwoke atọ na nwaanyị ise).
  • Iwuanyanwu bụbu onyeisioche ndị okenye Ohanaeze Ndigbo tupu a họpụta ya dịka onyeisi Ohanaeze n’ụwa gbaa gburu gburu.