Kedụ ndị na-azọ ọkwa Onyeisiala Taiwan na ihe anya ụwa ji dị na onye ga-emeri?

Lai Ching-te nke DPP, Hou Yu-ih nke KMT na Ko Wen-je TPP

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-azọ onyeisiala na mba Taiwan: Site n'aka ekpe gaa n'aka nri: Lai Ching-te, nke otu DPP, Hou Yu-ih nke KMT, na Ko Wen-je nọ nke otu TPP.

Ndị mba Taiwan ga-eme ntuliaka ga-eme ntuliaka ịhọpụta onyeisiala ọhụrụ n' ụbọchị nke ịrị na atọ nke ọnwa Jenụwarị, afọ 2024.

Mana mba Amerịka na Chaịna na-etinye anya ịma onye ga-emeri na ntụlịaka ahụ maka ọdịmma ha, na ime ihe ga-abara ha.

Ntụlịaka ahụ ga-egosị ọnọdụ mmekọrịta Taiwan na Chaina.

O nwere ike ịbụte ọnọdụ ọgbaghara nwere ike imetụta ọnọdụ akụnaụba ụwa nile.

Onyeisiala na-achị ugbua bụ Tsai Ing-wen sitere n' ọtu ndọrọndọrọ ọchịchị Democratic Progressive Party (DPP) - otu nke Chaina na-ahụta dịka ndị na-akwado nkewapụ onwe ndị Taiwan.

Onye na-achị ugbua achịala ugboro abụọ dịka iwu mba ahu siri kwado.

Mana mmadụ atọ na-azọ ọkwa ọchịchị ka ha nọchie ya.

Ndị DPP bu na obi ka ha nwee ọtụtụ ndị omeiwu nke rụrụ 113 maka ịkwadọ mmefu ego, ime iwu, na idozi nsogbu ndị ọzọ nke mba ahu.

Ole ndị bụ ndị a na-eme ntuli aka?

Ndị na-azọ onyeisiala na mba Taiwan: Site n'aka ekpe gaa n'aka nri: Lai Ching-te, nke otu DPP, Hou Yu-ih nke KMT, na Ko Wen-je nọ nke otu TPP

Ebe foto si, Getty Images

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Lai Ching-te nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Democratic Progressive Party' (DPP)

Lai bụbu dọkịta ma nwee ohere ịjị ọtụtụ ọkwa ndọrọndọrọ dị elu na Taiwan.

Ọ bụ Osote Onyeisiala kemgbe afọ 2020.

Ọ bụ onye ndu nke njikọta a kpọrọ, 'Pan-Green', ma na-akwado njirimara Taiwanese siri ike, na-emegide ịjịkọkọ Taiwan na Chaina.

Ọ na- akwado mmekọrịta Taịwan na Amerịka.

Chaịna na-ahụ ya dịka onye siri ike ma kara onyeisisala Taiwan, Tsai, na-achị ugbua.

Hou You-yi, Kuomintang (KMT):

Hou bubu onye uwe ojii. Ọ dịri ya mfe ịweta mmerị na afọ 2022 mgbe ọzọrọ ọchịchị ịbụ onye ịsị obodo New Taipei dị na mpaghara nke isi obodo Taiwan.

Ndị otu ya na akwado njịkọ Taiwan na China, ma ịme ka ha abuo dịrị na otu.

N'oge na-adịbeghị anya, o kwuru na adịm na ọbị ya ịkwadọ etu ịhe sịrị dị ugbu a, nke bụ na ọ bụghị ikwupụta nnwere onwe ma ọ bụ na-achọ njikọ Taiwan na China.

Ko Wen-je, sọ na otu ndọrọndọrọ ọchịchị Taiwan People Party (TPP):

Ko bụ dọkịta ruo mgbe ọ zọrọ ọchịchị maka onyeisi obodo Taipei, isi obodo Taiwan, dịka onye nweere onwe ya n' afọ 2014.

O hibere ndị otu ndị Taiwan n'afọ 2019, nwere mee ya dị ka otu ndọrondọrọ ọchịchị nke atọ maka ndị ntuliaka enweghị obi ụtọ na ebe ndị DPP na KMT nọ.

Otu ndị TPP kwenyere na njikọ Taiwan na Chaina ka bụ ihe mgbagwoju anya.

Mkparịtaụka dị n'etiti KMT na TPP ijikọ aka ọnụ weta otu onye ga-anochite ha na ntụlịaka onyeisiala ahụ kpụrụ afọ n'ala na Nọvemba.

E nwere ngagharịiwe gọọmentị n'afọ 2023 maka okwu ndị dị ka ụkọ ụlọ na ọnụ ahịa obibi dị elu.

Kedu ihe ndị Taiwan chọrọ?

Ndị Taiwan

Ebe foto si, Getty Images

N'agbanyeghị esemokwu dị n'etiti Chaịna na Taiwan, nchọpụta na-egosi na ọtụtụ ndị Taiwan na-eche na mmepe akụnaụba bụ okwu dị mkpa karịa.

Nnyocha ọmụmụ 2023 sitere na 'National Science and Technology Council' kwadoro na 34.2% nke ndị mmadu zaghachiri ajuju ajuru ha kwuru na aku na ụba kachasị mkpa ha chọrọ ka onye isi ala ha na-abia-abia kwuo okwu maka ya.

Mmekọrịta China-Taiwan bịara nke abụọ na 18.1%.

Obi adịghị ndị mmadụ mma maka okwu ndị dị ka ụgwọ ọnwa dị ntakịrị nke na emetuta ndị ntorobịa na ndị ọrụ, ọnụ ahịa obibi dị elu na ịrị elu ọnụ ahịa ụlọ ọbịbị.

Onyeisiala na-achị ugbu, Tsai Ing-wen kwere nkwa "obodo ga dịrị ndị na-eto eto mma" n'oge ọ na azọ ọchịchị na 2015, mana ọtụtụ ndị ntuliaka na-eche na omezughi nkwa ahu.

Onye ka China na US chọro ịhụ ka onye ịsị ala mba Taiwan?

Joe Biden na Xi Jinping

Ebe foto si, Getty Images

Àgwàetiti Taiwan dị ihe dị ka 161km site n'ụsọ oké osimiri ndịda-ọwụwa anyanwụ China.

Taiwan na-achị onwe ha kemgbe Ọchịchị Kuomintang (KMT, Nationalist Party), mgbe e merịsịrị ha na agha obodo ha na ndị ndọrondọrọ ọchịchị Kọmunist, ka ha laghachi na afọ 1949.

Afọ iri ka nke ahụ gasịrị, Taiwan esiwo n'ọchịchị aka ike gaa n'ọchịchị onye kwuo uche ya nwere usoro iwu nke ya. Ọtụtụ ndị mmadụ na-ahụ àgwàetiti (Taiwan ) dị ka ihe dị iche na ala ndị China.

Mana ndị Kọmunist nke China na-ebu na ọbị na ha ga ejịkọta ọnwe ha na Taiwan na-emecha maka okwu nchekwa obodo ha.

Onyeisiala Xi Jinping ekwuola na ihe karịrị otu ugboro "ịchịkọta Taiwan na China ọnụ" ga-emezurịrị. Ma na o nwepughị iji ọgụ nweta nke a.

Ndị US eweputala onwe ha ma dị njikere ịkwụsị agha ọbụla na Taiwan.

Taiwan na-anọdụ na nke a na-akpọ "agbụ agwaetiti mbụ" - mba ndị ha na Amerịka na-emekọ dịka Japan, South Korea, Philippines - nke dị oke mkpa na amụma mba Amerika.

Ọ bụrụ na Chaịna ga-eweghara Taiwan, ụfọdụ ndị ọkachamara n' ebe Ọdịda Anyanwụ na-atụ aro na ọ ga-enyere ha aka ichekwa onwe ha ọfụma n' aka ndị agbata obi ha na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Pacific; ma nwee ike iyi ndịagha Amerịka egwu ruo na Guam nakwa Hawaii.

Mana Chaịna na-ekwusi ike na ebumnuche ya bụ naanị udo.

Ka ọ dị ugbu a, ntuliaka na-egosi na onye otu ndorondoro ọchịchị DPP bụ Lai Ching-te dị nso n'ihu KMT Hou Yu-ih, na onye nke atọ Ko Wen-je nke Taiwan People's Party (TPP) na-eso ya.

China nọ na-akwalite nrụgide ndị Taiwan, na-eziga ụgbọmmiri na ụgbọelu ndịagha na Taiwan ugboro ugboro n'afọ gara aga, na-agafe n'ahịrị etiti nke na-ebute esemokwu n'etiti ha kwa ụbọchị.

Taiwan nwere ike chebe onwe ya?

Ndịagha Taiwan

Ebe foto si, Getty Images

Ndị Chaịna tinyere anya n'ihe ndị ọzọ , mana ọ bụrụ na e tinye anya n' ọnọdụ na ike ndịagha n' etịtị Chaịna na Taiwan, ndị Chaịna karịrị Taiwan.

Ọ bụrụ na o nwee ihe dịka ọgụ, Chaịna ga-egosi Taiwan nkarị.

Mana nke ahụ apụtaghị na Taiwan enweghị ngwaọgụ nke ọma, maọbụ na ha agaghị aguzoro naanị onwe ha.

N'ọnwa Julaị 2023, Amerịka kpughere ngwugwu enyemaka ngwaagha nye Taiwan nke ruru nde $345.

Tupu ngwụcha afọ, Ngalaba Steeti Amerịka kwadoro ire akụrụngwa ruru $300m iji nyere aka idowe usoro ozi oha puru iche nke mba Taiwan.

N' afọ 2022, a jụrụ Onyeisiala Amerịka bụ Joe Biden ma Amerịka ọ ga-agbachitere Taiwan ọgụ n'agha, ọ zara: "Ee".

Ndị White House mechara kwusie ike na Washington agbanwebeghị 'otu amụma Chaịna' ha kwuru.

Agbanyeghị, Chaịna na-emefu karịa obodo ọbụla ma e wezụga Ameịka maka nchekwa ma nwee ike ịdọta ikike dị ukwuu, site na ike ụgbọmmiri ruo teknụzụ ogbunigwe, ụgbọelu na mwakpo cyber.

Gịnị kpatara Taiwan ji dị mkpa maka ụwa ndị ọzọ?

UN anaghị anabata Taiwan dị ka mba dị iche nwere onwe ha, ma na naanị mba ịrị na abuo dị e tua na gburugburu ụwa (ọ karịsịa na South America, Caribbean na Oceania).

Ọtụtụ ngwa eletrọnịkị nke ụwa na-adị kwa ụbọchị - site na ekwentị ruo na laptọọpụ, elekere na egwuregwu - bụ ibe kọmpụta e mere na Taiwan na-akwado ya.

Otu ụlọọrụ Taiwanese - ụlọọrụ mmepụta ihe 'Semiconductor' Taiwan maọbụ TSMC - nwere ihe karịrị ọkara nke ahịa ụwa.

TSMC bụ ụlọ ọrụ a na-akpọ "foundry" - ụlọ ọrụ na-emepụta ibe ndị ahịa na ndị agha mere. Ọ bụ nnukwu ụlọ ọrụ, ruru ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ijeri $ 100 na 2021.

Washington anọwo na-abawanye mbọ n'afọ ndị na-adịbeghị anya, site na njikwa mbupụ na mgbochi ndị ọzọ, iji gbochie ohere China nweta teknụzụ nke nwere ike ikwe ka ọ dabara na ọganihu microchip nke US na ndị otu ya gụnyere Taiwan.

Mweghara ndị Chaịna na Taiwan nwere ike inye Beijing ikike ịchịkwa otu n'ime ụlọọrụ kacha mkpa n'ụwa.