Ihe anyị ma maka onye nlekọta Damgrete Hotel ndịagha gburu n’Umuahia

Ụlọoriri Damgrete Hotel dị n'Umuahia

Ihe anyị ma maka onye nlekọta Damgrete Hotel ndịagha Naịjirịa gburu n’Umuahịa

Ndị uweojii Abia Steeti ekwuola na ha na-enyocha ozu Achimugwu James Etubi bụ onye nlekọta ụlọ ọriri Damgrete Hotel dị n’Umuahia bụ onye nwụrụ dịka ndịagha Naịjirịa tichara ya na ndị ọrụ ibe ya ihe.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Maureen Chinaka onye dịrektọ ụlọ oriri ahụ kpọtụụrụ ụloọrụ ha n’ụbọchị 12 Eprel, 2024 na ndịagha bịara nwuchie ndị ọrụ ha mmadụ anọ, tie ha ihe nke butere ọnwụ James Etubi.

Ndịagha nwuchiri ndị a maka ọnwụ onye otu ha bụ Emmanuel Onyeomereneche, nwụrụ n’ọdọmmiri ụlọ oriri ahụ mgbe ọ gara igwu mmiri n’ụbọchị 9 Eprel, 2024.

Kedụ ka ihe a si mee?

Akụkọ kwuru na Emmanuel Onyeomereneche bụ onye na-anata ọzụzụ na ngalaba ndịagha mmiri Naịjirịa gara n’ụlọ oriri ahụ n’ụbọchị 9 Eprel, 2024 izuru ike.

O kpebiri ịga gwuo mmiri n’ọdọmmiri ‘swimming pool’ dị n’ụlọoriri ahụ n’abalị mana otu ihe maọbụ nke ọzo mere, mmiri eriela nwamadị a, nke butere ọnwụ ya.

Mgbe akụkọ ọnwụ ya ruru ndịagha ibe ya ntị, ha gara n’ụlọoriri ahụ, buru mmadụ anọ na-arụ ebe ahụ nke gụnyere onye nlekọta ya bụ Achimugwu James Ebitu.

Ha malitere iti ndị a ihe nke butere ezigbo mmerụ ahụ nye Ebitu bụ onye mechara nwụọ mgbe e bu ya gaa n’ụlọọgwụ.

“Anyị na-enyo maka ndị otu anyị a sị tigburu mmadụ”

Taoreed Lagbaja, onyeisi ndịagha Naịjirịa

Ebe foto si, Nigerian Army

Onyeisi ndịagha Naịjirịa bụ Taoreed Lagbaja enyela iwu ka e nyochaa ọnwụ onye nlekọta ụlọoriri Damgrete ahụ.

N’ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Onyema Nwachukwu wepụtara, Lagbaja kwuru na “ọ na-ewute m etu ụfọdụ ndị otu anyị si kpaa agwa nke butere ọnwụ onye nlekọta ụlọoriri ahụ.”

Ọ gara n’ihu tie ezinaụlọ ndị nwa ha nwụrụ aka n’obi ma kwee nkwa na a ga-eme nyocha banyere nke a.

Biko chọpụtanụ ihe gburu nwa anyị - Ndị Okwuta Ibeku

Ndị obodo Okwuta Ibeku na-eme ngagharịiwe maka ọnwụ Onyeomereneche

Ndị obodo Okwuta Ibeku dị n’Umuahia buuru nagharịiwe gaa n’obi ọchịchi gọọmentị Abia Steeti maka ọnwụ Emmanuel Onyeomereneche bụ onye agha Naịjirịa nwụrụ n’ọdọmmiri ụlọoriri Damgrete.

Ha kwuru na odochaghị anya etu obere ọdọmmiri ụlọoriri ahụ ga-esi rie Onyeomereneche bụ onye agha mmiri Naịjirịa ma kwuo ka a chọpụta ndị aka ha dị n’ọnwụ ya.

Ndị ngagharịiwe a karịchara n’ụmụnwaanyị yicha akwa ojii nọ na-abụ abụ akwa na-etikwa mkpu.

Na nzaghachị, onye ndụmọdụ gọvanọ Alex Otti n’okwu nchekwa bụ Macdonald Uba kwere ha nkwa na gọọmentị ga-eme ezi nyocha iji chọpụta ihe gburu nwamadị a.