Etu ụmụakwụkwọ sekọndịrị atọ si gbakọ aka wakpoo ma dinaa ogbo ha nwaanyị n'ike

Nwoke na-awakpo nwaanyi

Ebe foto si, Others

Ụmụakwụkwọ Sekọndrị atọ edinala nwa klaasị ha dị afọ 14 n'ike na nsonso a.

Akụkọ kwuru na ụmụaka ụmụnwoke a bụ ụmụakwụkwọ Akure High School Akure dị n'Ondo steeti. E kwuru na oteela aka ha ji arịọ nwata nwaanyị ahụ ka ha na ya yịa na nzuzo mana o kweghị.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Mana nnu ghara ofe na nsonso a dịka nwata nwaanyị ahụ si klaasi banye ọhịa ugbo ụlọakwụkwọ ha ịnyụ nsi, ụmụakwụkwọ ụmụnwoke atọ ahụ bagidere ya, dinaa ya n'ike.

Akụkọ kwuru na ọ bụ ka nwata nwaanyị ahụ laghachiri klass, ụmụakwụkwọ ibe ya hụrụ ọbara n'akwa ya were tiwe.

Njirmara Akure High School

Ebe foto si, Akure High School/Facebook

Akụkọ ọzọ ga-amasị gị

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ondo steeti bụ SP Funmi Tulllami kwuru na ya bụ ihe mere n'ezie.

O kwukwara na anwụchiela ụmụakwụkwọ ahụ, ebe nnyocha na-aga n'ihu na ya bu okwu.