Etu ụmụakwụkwọ sekọndịrị atọ si gbakọ aka wakpoo ma dinaa ogbo ha nwaanyị n'ike

Ebe foto si, Others
Ụmụakwụkwọ Sekọndrị atọ edinala nwa klaasị ha dị afọ 14 n'ike na nsonso a.
Akụkọ kwuru na ụmụaka ụmụnwoke a bụ ụmụakwụkwọ Akure High School Akure dị n'Ondo steeti. E kwuru na oteela aka ha ji arịọ nwata nwaanyị ahụ ka ha na ya yịa na nzuzo mana o kweghị.
Mana nnu ghara ofe na nsonso a dịka nwata nwaanyị ahụ si klaasi banye ọhịa ugbo ụlọakwụkwọ ha ịnyụ nsi, ụmụakwụkwọ ụmụnwoke atọ ahụ bagidere ya, dinaa ya n'ike.
Akụkọ kwuru na ọ bụ ka nwata nwaanyị ahụ laghachiri klass, ụmụakwụkwọ ibe ya hụrụ ọbara n'akwa ya were tiwe.

Ebe foto si, Akure High School/Facebook
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ondo steeti bụ SP Funmi Tulllami kwuru na ya bụ ihe mere n'ezie.
O kwukwara na anwụchiela ụmụakwụkwọ ahụ, ebe nnyocha na-aga n'ihu na ya bu okwu.







