Ihe mere anyị ji mechie okporoụzọ si 'four corner' gawa Udi - Udi Neighbourhood watch

Okporoụzọ si 'four corner' gawa Udi

Ebe foto si, Screen shot

Ndị nchekwa ọdịnala obodo Udi dị n'Enugwu Steeti a kpọrọ 'Neighbourhood watch' ekwuola na ọ bụ ha tinyere mgbochi n'okporoụzọ si 'four corner' gawa Udi.

Onyeisi ndị nchekwa a bụ Ajaegbu Ikechukwu gwara BBC Igbo nke a n'ekwentị ma kọwaa na ọ bụ otu n'ime ihe ha mere iji belata nsogbu enweghi nchekwa n'obodo ha.

O kwuru na ha rụrụ mgbochi ahụ a kpọrọ 'baricade' oge ọnọdụ nchekwa dị ọjọọ n'ogige ahụ ebe a tọọrọ ọtụtụ mmadụ, gbuo ha ma zuo ihe ha.

N'okwu ya "mgbe anyị rụchara ihe mgbochi ụzọ ahụ, onyeisioche okpuruọchịchị Udi gwara anyị ka ha ghara iji ya agbachi ụzụ".

"Mana ugbua ezigbo nchekwa adịla n'okporoụzọ ahụ ugbua, e nwere ọdọ nyocha ndị nchekwa dị iche iche ruru ise n'ụzọ ahụ"

Ikechukwu kwuru na ha emepeela okporoụzọ ugbua, na ndị njem nwereike ime njem mgbe ọbụla ha chọrọ n'ụzọ ahụ.

"Ndị nchekwa ọdịnala, ndịagha na ndị uweojii na-anọ na nche n'ụzọ ahụ site n'ụtụtụ ruo n'abalị nakwa mgbe chi bọro."

Ihe mere e ji mechie okporoụzọ ‘Four Corner’ gawara Udi n’Enugwu

Okporoụzọ si 'four corner' gawa Udi

Ebe foto si, Screenshot

Okporoụzọ awara si ebe a kpọrọ 'Four corner' Enugwu gawa obodo Udi dịkwa n’Enugu Steetrị abụrụla ihe e mechiri emechi.

Nke a bụ dịka otu ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gosiri ka e ji ụzọ igwe dochie ya bụ okporoụzọ.

Ụfọdụ ndị ntoroọbịa yicha uwe ojii ma dị ka ndị nchekwa obodo nọcha ebe ahụ.

Ihe e dere ma mapanye n’ahụ n’ọnụ ụzọ ahụ na-akọwa na ọ bụ n’ihi nchekwa ka e jiri mechie okporoụzọ ahụ.

Na nso nso e nweela ọtụtụ mwakpo ndị ojiegbe n’ụzọ a dị n’elu ugwu nakwa obodo ndị dị ya n’akụkọ.

Ndị ojiegbe a tọrọla ma gbuo ọtụtụ ndị gụnyere ndị ọrụ nchekwa n’okporoụzọ a nakwa obodo ndị dịka Agbani.

Skip Facebook post
Hapụ Facebook ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Facebook. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Facebook iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of Facebook post

Otu onye sere ihe onyonyo ahụ na-akọwa na e mecheghi ụzọ ahụ kpam kpam, na mmechi a bụ malite n’elekere isii nke mgbede ruo elekere asaa nke ụtụtụ.

Mgbe BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Enugwu bụ Daniel Ndukwe, ọ sị na ọ maghị maka ya, na ọ ga-eme nyocha banyere ya.

A kpọtụkwara Louis Amoke bụ onye enyemaka Gọvanọ Enugwu steeti, ọ zaghị ozi ahụ ruo mgbe akụkọ a pụtara.

Ihe i kwesịrị ịma maka ụzọ ‘Four Corner’

  • Ụzọ 'four corner' dị mkpa maka na ọ na-enyere ndị njem aka ịgbapụta okporoụzọ si Enugwu gawa Pọtakọt na-erughi ime Enugwu.
  • Onye rụrụ ụzọ a bụ aka chiburu Enugwu Steetị bụ Sullivan Chime bụ otu n’ime ihe e ji echeta ya.
  • Ugbua okporoụzọ si Enugwu gawa Onitsha dịzi ka ajụ ọnwụ, ọ bụ okporoụzọ ‘four corner’ ka ọtụtụ ndị njem na-agba aga Awka, Onitsha.
  • Okporoụzọ a dị n’elu ukwu ọhịa gbara gburu gburu ikekwa ọ bụ ya mere mwakpo ndị ojiegbe ji arụ elu na ya.
  • Nke a kawanyere njọ ugbua ọnọdụ nchekwa na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ dakpọrọ afọ n’ala.