Anyị na-enyocha onye otu anyị 'wakporo' nwatakịrị na mkpọrọ - Uweojii Enugwu steeti

A na-enyocha otu onye uweojii a na-ebo ebubo idina nwatakịrị a nwụchiri n'ụlọọrụ ha
Nkọwa foto, A na-enyocha otu onye uweojii a na-ebo ebubo idina nwatakịrị a nwụchiri n'ụlọọrụ ha

Kọmishọna uweojii Enugwu steeti bụ Ahmed Ammani, ekwuola na ha na-enyocha otu onye uweojii a na-ebo ebubo idina nwatakịrị a nwụchiri n'ụlọọrụ ha.

Ahmed Amani kọmịshọna ndị uweojii Enugwụ steeti

Ebe foto si, Enugwu Police Command

Nkọwa foto, Ahmed Amani kọmịshọna ndị uweojii Enugwụ steeti

N'ozi o si n'ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Daniel Ndukwe ziputere, Ammani kwuru na ya bụ onye uweojii wakporo nwatakịrị ahụ, na-arụ n'ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Awgu.

Ammani nyere iwu ka e mee ya bụ nnyocha ngwa ngwa, ma kwuo na a ga-ata onye uweojii ahụ ezigbo ahụhụ kwesịrị ya ma ọ bụrụ na ikpe maa ya.

Ọ gara n'ihu kpọọ oku ka onye ọbụla nwere ozi nwere ike inyere aka na ya bụ nnyocha, wete ozi inye aka ahụ.

Akụkọ ka na-abịa.