Anyị na-enyocha onye otu anyị 'wakporo' nwatakịrị na mkpọrọ - Uweojii Enugwu steeti

Kọmishọna uweojii Enugwu steeti bụ Ahmed Ammani, ekwuola na ha na-enyocha otu onye uweojii a na-ebo ebubo idina nwatakịrị a nwụchiri n'ụlọọrụ ha.

Ebe foto si, Enugwu Police Command
N'ozi o si n'ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Daniel Ndukwe ziputere, Ammani kwuru na ya bụ onye uweojii wakporo nwatakịrị ahụ, na-arụ n'ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Awgu.
Ammani nyere iwu ka e mee ya bụ nnyocha ngwa ngwa, ma kwuo na a ga-ata onye uweojii ahụ ezigbo ahụhụ kwesịrị ya ma ọ bụrụ na ikpe maa ya.
Ọ gara n'ihu kpọọ oku ka onye ọbụla nwere ozi nwere ike inyere aka na ya bụ nnyocha, wete ozi inye aka ahụ.
Akụkọ ka na-abịa.





