Ihe mere onyeisi ndị uweojii ji akpụpụ Andy Uba ụlọikpe

Andy Uba
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ọkaikpe Inyang Ekwo nke ụlọikpe ukwu n'Abuja enyela onyeisi ndị uweojii bụ Kayode Egbetokun ikike ịkpụpụ Andy Uba ụlọikpe maka ebubo ịnapụ otu nwoke a kpọtọ George Uboh ego ruru N400m.

Ubah bụbụ onye omeiwu na-anọchi anya Anambra South n'ụlọikpe ukwu na-eche ebubo mpụ megidere akụkụ s8 mwekwara ntaramahụhụ n'akụkụ s1(3) nke iwu megidere mpụ 2006 nke Naịjirịa.

Ndị ọzọ e denyere aha ha na ya bụ ebubo bụ Crystal Chidinma Uba nakwa onye ọzọ bụ Benjamin Etu.

Isi butere ya bụ ebubo bụ na n'afọ 2022, akụko kwuru na Uba na otu onye akpọrọ Hajiya Fatima gbapụrụ ọsọ jikọrọ aka kwuo na ha nwere ụzọ inye onye ọbụla wetara N400m ọkwa ngalaba Niger Delta Commission n'agbanyeghị na ha ma na ọ bụghị eziokwu.

Ka ihe si kwụrụ ugbua, a ga-anụrụ ikpe mmadụ atọ ndị a n'ụlọikpe ukwu n'ụbọchị 18 nke ọnwa Febụwarị n'afọ 2025 na-abịa.