Nelson Mandela Day Quiz: Kedụ ihe ị ma gbasara onyeisiala mbụ nke South Africa?

Ebe foto si, Getty Images
Ụbọchị 18 Jụlaị 2009 ka UN General Assembly hibere Nelson Mandela International Day iji cheta ụbọchị ọmụmụ Mandela.
Ihe kwalitere ya bụ oku Nelson Mandela kpọrọ n'afọ 2008, ka ndị ọgbara na-abịa n'ihu ibu nsogbu gbasara ọchịchị n'isi site n'ileba anya n'ikpe na-ezighị ezi na mba ụwa. O kwuru sị 'ọ dịzị n'aka unu ugbua'.
Ụbọchị a abụghị maka sọsọ ịcheta ọmụmụ ya, a na-asọpụrụ mbọ niile ọ gbara mgbe ọ dị ndụ ịhụ na e mere ka ụwa bakwuoro mmadụ uru.
Maka nke a, nwalee ihe ị mara maka nwoke ụwa ji eme ọnụ.





