Monkeypox virus: Gịnị bụ Monkeypox?

Monkeypox virus

Achọtala ọrịa monkeypox n'ahụ onye ọzọ na mba Briten, Ka anyị lebanye ọrịa pụrụiche anya.

Monkeypox o juru ebe nille?

Ọ bụ nje Monkeypox na-ebute ọrịa monkeypox, ya na ọrịa kịtịkpa nwere otu nje na-ebute ha kama monkeypox anaghị enye nsogbu ka kịtịkpa ebe ndị sayensi na-ekwu na anaghị enweta ya kwadaa.

Ọ bụ n'ime obodo dị na mpaghara etiti na ọdịda anyanwụ Afrịka, ebe ndị nọ ọhịa nso.

Nje a nwere agba abụọ nke bụ 'West African' na 'Central African'.

Mmadụ abụo a si Naijirịa bata Briten, ọ dịka ha a na-arịa nke agba West Africa nke echere anaghị enye oke nsogbu kama amatachabeghị nke bụ eziokwu.

Onye nke atọ bụ onye ọrụ gbata gbata butere ya n'aka onye na-arịa ọrị a.

Kama mmadụ anọ butere ya nsonso a enweghị etu ha na ndị butere ya na mbụ siri nwee mmekọ.

UKHSA na-ekwu na onye ọbụla chere na obutela ya gaa ahụ onye ọrụ ahụike ma kpọọ ụịloọgwụ tupu ha agawa.

Njirimara ọrịa a?

Ụkwụ na aka nwata gbara afọ anọ Monkeypox mere

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Njirimara Monkeypox bụ ọka na-ebido n'ihu mmadụ gbasawa n'ahụ ebe ndị ọzọ.

Njirimara mbụ ọrịa a gụnyere ahụ ọkụ, isi ọwụwa, ahụ ozịza, azụ mgbu, ahụ mgbu na ịchere ụkwụ na mmadụ anọkwuteghị otu ebe.

Mgbe ahụ ọkụ bidoro, ọkọ ahụ nwereike ipụta, ọ na-ebidokarị n'ihu, site ebe ahụị gbasaa akụkụ ahụ ndị ọzọ, kachasị aka na ichere ụkwụ.

Ọ na-akọ oke ọkọ.

O na-ejikarị aka ya ala n'ime ụbọchị 14 na 21.

Kedụ etu esi ebute ya?

Mmadụ nwereike ibute Monkeypox ma ya na onye nwe ya nwee mmekọ.

Ọrịa nwereike isite n'ọnya ahụ, ebe esi eku ume, anya, imi maọbụ ọnụ banya ahụ onye ọzọ.

Mmadụ nwereike ibute ya site na mmetụ oge mmekọ nwoke na nwaanyị.

Anụmanụ dịka enwe, oke na ụsa maọbụ ihe ọbụla nje a metụtara nwereike ịbunye mmadụ ọrịa a.

Monkeypox virus particle

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Monkeypox virus particle

Kedụ etu ọrịa siri dị njọ maka ahụike?

Ọtụtu mgbe, ọrịa a anaghị adị njọ ọ na-eji aka ya ala n'ime izuụka olemaole.

Monkeypox a nwereike ịkanwanye njọ dịka akụkọ na-ekwu na ogbuola ụfọdụ ndị mmadụ na mpaghhara ọdịda anyanwụ Afrịka.

Ugboro ole ka ọ na-etiwapụta?

Ọ bụ n'ahụ enweka ebu ụzọ hụ ya, mana kamgbe afọ 1970, anụla maka ya na mba iri dị n'afrịka.

Ọ bụ na mba Amerịka n'afọ 2003 ka ahụtara ọrịa na mbụ na mba na-anọghị n'Afrịka.

Ọ bụ ndị ha na anụmanụ ndị bu ọrịa nwere mmekọ butere ọrịa a dịka mmadụ 81 butere ya na mba Amerịka.

Ọ bụ n'afọ 2017 ka mmadụ 172 butere ya na Naijirịa ebe 75% n'ime ha dị site afọ 21-40.

Ọgwụgwọ Monkeypox?

Ọrịa a enweghị ọgwụgwọ, kama enwereike ịkwụsị mfesa ya.

Ọgwụ mgbochi monkeypox nwereike iji 85% gbochie ya.

Obi ekwesịrị ịmapụ anyị?

Ndị ọkaibe na-ekwu na orubeghị ọnọdụ ozurumbaọnụ.

Prof Jonathan Ball, bụ ọkaibe na molecular virology, nke mhadum Nottingham kwuru sị, : " Ebe ọ bụ naanị otu onye n'ime mmadụ 50 ha na ọrịa nwere mmekọ butere ha na-egosi na ya bụ ọrịa anaghị efesa n'ike" .

Dr Nick Phin, bụ osote onyeisi, National Infection Service nke Public Health England (PHE), kwuru sị: " Ọ dị mkpa ka ndị mmadụ mata na ọrịa mpnkeypox anaghị eji ike efesa n'etiti ndị mmadụ ma etu ọ ga-esi emetụta ahụike ndị ọha ebughị ịbụ".

PHE na ndị ha na onye nwere ọrịa nwere mmekọ na-akparịta ụka iji nye ha ezigbo ndụmọdụ na ihe ndị ọzọ dị mkpa".

Ebe akụkọ a si: PHE England and World Health Organization.