Myth Buster: Ọ bụ eziokwu na e nwere ihe dịka "ịgha mmadụ pin"?

Ebe foto si, Screen grab
N'ọdị nso a ka onye na-eme ejije Nollywood a ma ama bụ Chiwetalu Agu pụtara kwuo na ndị iro ya chọrọ iji ọgwụ gbuo ya.
O kwuru na onye amụma si n'ime ahụ ya wepụta ọtụtụ kịrịkịrị ntụtụ, okwute, ego ayoro, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ, bụ nke o kwuru na ndị iro ya tinyere n'ahụ ya.
Chiwetalu kwuru na ọ bụ n'akụkụ ahụ ya dị icheiche - obi ya, ubu ya, afọ ya - ka onye amụma ahụ si wepụta ihe ndị a.
Nke a mere ka nrụrịtaụka malite na soshal midia, dịka ọtụtụ na-ajụ ma ọ bụ eziokwu na ụdị ihe dị otu a nwere ike ime.
Dịka Chiwetalu si kwuo "ndị iro m niile mere m ihe a, kamgbe ewepụtachara ihe ndị a n'ahụ m, onyeisi ha anwụọla, ndị ọzọ nọzị ọdị ndụ ọnwụ ka mma."
Mana ọ bụ eziokwu na e nwere ihe dịka ịgha mmadụ pin?
Ihe dibia ọdịnala kwuru maka nke a

Otu dibia ọdịnala aha ya bụ Duruagwu Ukaejuoha gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na e nwere ike iji ọgwụ tinye mmadụ ihe dị icheiche n'ime ahụ ya.
"Ọ bụ ajọ ọgwu, a na-agwọ ya agwọ. Ihe e ji agwọ ya bụ ede rere ere," Duruagwu kwuru.
Mgbe BBC jụrụ Duruagwu etu o si bụrụ ihe kwere omume na a ga-eji ọgwụ tinye ntụtụ na ihe ndị ozọ n'ahụ mmadụ, o kwuru na "ọbụghị ihe niile ka anya na-ahụ".
Duruagwu kwukwara na ọbụghị dibia niile nwere ike iwepụta 'pin' a ghanyere n'ime ahụ mmadụ.
"Ị ma na e kere ọrụ eke, mụ onwe m nwere ọrịa ndị m na-agwọ, anaghị m agwọ onye a ghara 'pin' mana a ma m ndị dibịa nwere ike ịgwọ ya."
Ihe dibia bekee kwuru gbasara ịgha 'pin'

Ebe foto si, Mcginger Ibeneme/Facebook
N'aka nke ọzọ dibia bekee aha ya bụ Mcginger Ibeneme kwuru na enweghị ihe dịka ịgha mmadụ pin.
Dkt Ibeneme bụ ọkachamara n'ihe gbasara ọrịa na-efe efe; ọ bụkwa onye kwenyere n'okpukperechi omenala Igbo.
O kwuru sị: "Ọ bụ eziokwu na m kwenyere n'omenala, ekwenyere m na ịgwọ ọgwụ dị, mana enweghị ihe dịka ịgha mmadụ 'pin'."
"Nke mbụ bụ na a bịa na mmụta ọgwụ oyibo, o kweghị omume na mmadụ ga-etinye ihe dịka ntụtụ n'ime ahụ mmadụ, na-emerụghị onye ahụ ahụ."
"Ihe a ndị mmadụ na-akpọ ịgha 'pin' bụ magomago ndị dibịa na-eme iji rie ndị mmadụ ego."
"Ụfọdụ na-arịa ọrịa, ha agaa ụlọọgwụ ma ha enwetaghị ọgwụgwọ, ha agakwuru ndị dibịa adigboroja ndị ga-asị ha na a ghara ha pin."
"Dibia ahụ ga-akpụrụ ntụtụ kpụjuo ọnụ ya, ọ bịa mezie ka ọ bụ n'ahụ onye ọrịa ahụ ka o si ewepụta ntụtụ ndị ahụ."
Dkt Ibeneme kwuru na onye ọbụla na-arịa ọrịa na-achọ ihe ọ ga-eme ka o nweta ọgwụgwọ, ọ bụ nke a na-eme ka ha kweta ihe ọbụla ndị dibịa adịgboroja a na-ekwu, mana n'ezie, onweghị ihe dịka ịgha mmadụ 'pin'.
Gịnị bụ ịgwọ ọgwụ?

Bekee na-akpọ ya 'black magic' maọbụ 'vodoo'.
Nke a bụ ngalaba okpukperechi ọdịnala ebe e nwere nkewenye n'ike amosuu maọbụ mmụọ ọjọọ.
Mana nkwenye a na nkwenye sayensị anaghị agakọ chaachaa maka na sayensị kwenyere n'ihe anya na-ahụ.














