Igbo Divination System: Gịnị bụ ịgba afa na uru ọ baara?

Dibia na-agba afa

Ndị Igbo na-atụ ilu sị na ihe okenye nọ ọdụ hụ, na nwata rigoro n'elu osisi na ọ gaghị ahụ ya.

Nke a pụtara na o nwere ihe ndị zoro ezo n'anya mmadụ nkịtị nke naanị ụfọdụ ndị nwere onyinye pụrụiche ga-ahụnwu.

Mana otu ụzọ e ji atụpenye mmadụ nkịtị azụ ihe ndị ahụ zoro ezo bụ site n'ihe a na-akpọ 'ịgba afa'.

Gịnị bụ ịgba afa?

Ụlọ ebe a na-agba afa

Ebe foto si, Getty Images

Otu onye na-eme ejije omenala Igbo doro anya bụ Ugezu J. Ugezu sị na ịgba afa bụ usoro ndị Igbo ji ahụ ihe anya mmadụ na-agaghị ahụnwu, ihe zoro ezo na ihe nke ime mmụọ.

Ọ sị na ọ bụ ụzọ e si ajụpụta ihe nzuzo banyere ndụ mmadụ, ọnọdụ nakwa ihe metụtara ya nke a na-akpọ ịjụ ese.

"Nwafọ Igbo ọbụla, ọkachasị ụmụnwoke kwesịrị na ọ gụrụ oge, ọ gaa jụọ ese.

"Ese ahụ ọ na-ajụ bụ ihe a na-akpọ ịgba afa maọbụ ịwa ugiri dịka ụfọdụ obodo si akpọ ya".

Onye na-agba afa?

Ịgọ ọfọ

Onye na-agba afa bụ onye dibia nwere onyinye pụrụiche ịchọpụta ọtụtụ ihe zoro ezo.

E nwere ike ịkpọ ya dibia afa, dibia ọgbaaja, dibia nyocha dgz.

Ọ na-arụ ọrụ dịka onye mkpesa n'etiti ụwa mmadụ na ụwa mmụọ, a na-ahụta ya ka onye ji igodo ihe nzuzo banyere ndụ mmadụ.

Ugezu bụ onye na-eme ihe nkiri

Ebe foto si, Ugezu/Instagram

Nkọwa foto, Ugezu bụ onye omenala Igbo na-amasị nke ukwuu, ọ na-agbasa ozi banyere ya.

O nwere onyinye amamihe nakwa ikikere ịhụ ihe na-eme n'ime mmụọ maọbụ n'ụwa ọzọ ma kọwaa mpụtara nye ya mmadụ nọ n'ụwa.

Ugezu sị "a naghị amụ ka e si agba afa, ọ bụ onyinye si na chi kama onye na-agba afa nwereike ịmụta otu ihe maọbụ nke ọzọ n'aka dibia karịrị ya n'ịgba afa."

"Ihe ndị o nwere ike ịmụta gụnyere ka o si achịkọta onwe ya nakwa ụdị asụsụ ọ ga-eji na-agba afa."

Kedụ ihe e ji agba afa

Onye bu ite ọgwụ

Na nkọwa ya, Ugezu sị na ihe e ji agba afa bụ osisi a na-akpọ ugiri, na a na-eji mkpụrụ anọ nke na-egosi Eke, orie, afọ na nkwọ.

"E nwere ndị satara ugiri n'ehihie ma n'abalị nke bụ na ha na-agba afa mgbe ihe dị maọbụ mgbe chi jiri. (ịsata ọnwa na anwụ)

"ebe ndị satara ugiri n'ehihie nwere ike ịgba afa naanị mgbe ihe dị mma maka na ha agaghị ahụnwu ụzọ n'abalị".

Kedụ uru ịgba afa baara

Ihu arụsị

Igbo kwenyere na uru dị icheiche ịgbafa bara n'ala Igbo. Ugoezu sị na ịgba afa bara uru nke ukwuu, nke gụnyere;

  • Inye aka ịmata ụdị chi lọọrọ mmadụ ụwa nakwa ebe mmadụ si lọ ụwa - ihe mbụ a na-eme ma a mụọ nwa ọhụrụ bụ ịgba afa ka a mara ebe o si lọ ụwa nakwa chi lọọrọ ya.
  • A na-esi n'ịgbafa ahụ ọdachi cheere mmadụ n'ihu ma gbanahụ ya n'oge tupu o mee.
  • E ji ya achọpụta ihe mere mmadụ ji nọrọ n'ọnọdụ ọjọọ (ọrịa, ụbịam, ụkpa dgz) nakwa ụzọ mgbapụta.
  • A na-ejikwa ịgba afa achọpụta onye agwụ maọbụ arụsi ji nakwa ebe arụsị ahụ si.
  • Ịgba afa na-enyere mmadụ aka ịsụ ụzọ ya ka ihe ọbụla bụ ihe ọjọọ ghara ịnọchiri ya ụzọ.

Ugoezu gbarụrụ ihu ma kwuo na ọtụtụ ndị Igbo leghaara omenala Igbo anya nke gụnyere ịgba afa, na nke a na-emetụtakwa ha.

Ọ sị na a na-ahụzị ndị na-agba afa ka ndị na-agwọ ọgwụ kama na ọ bụghị etu ahụ, na o so n'ihe mere e ji eleghara ya anya.

Na nchịkọta, Ugezu kpọkuru ndị Igbo ka ha gbaa mbọ laghachị azụ n'ọtụtụ omenala Igbo ha gbahapụrụla.