Chelsea vs Newcastle: Chelsea ji otu ọkpụ goolu gbalahụ ihere n'aka ndị Newcastle

Ebe foto si, Chelsea/Twitter
Chelsea ji otu ọkpụ goolu gbalahụ ihere n'aka Newcastle United n'asọmpi mbụ ha kemgbe gọoment UK chụpụchara onyeisi ha bụ Roman Abramovich.
Ya bụ goolụ ha nyere bụ nke nzọpụta dịka ya bụ egwuregwu fọrọ nwa ntịị ka o mechie mgbe Kai Havertz jiri tinye ya n'azụ neetị na nkeji 88.
Ya bụ asọmpi tara akpụ nke bụ na otu egwu bọọlụ abụọ ahụ kwechiiri rụọ mgbe Chelsea nyere goolu ahụ.
Dịka ọ dị mgbe Chelsea gbara Norwich ọkpụ atọ n'izu gara aga, ụfọdụ ndị nsonso ha gụwaara Abramovich egwu nwa mgbe nta tupu ha mechie ọnụ.
Chelsea ka yikwa uwe 3 ha gbaa bọọlụ taa.
Kedụ ebe ụgbọ bu Chelsea aga?

Ebe foto si, Getty Images
Thomas Tuchel bụ onye nkuzi otu Chelsea ekwuola na enweghi ebe ọ na-aga maọbụghị ma 'season' o bu ụzọ gwụ.
O kwuru na ọ bụ ọrụ dịịrị ya na ndị ọgbabọọlụ Chelsea ịlụtara ndị klọb ahụ ọgụ dịka Roman Abramovich bụ onye nwe ya na-agabiga nsogbu n'aka gọọmentị Briten.
Isi Chelsea ọ ga-apụta taa?
Anya niile dị ebe Chelsea nọ dịka ha ga-anabata Newcastle n'ọgbọegwuregwu Stamford Bridge n'ehihie Sọnde a.
Nke a na-abịa dịka a ka na-akpa nkata maka orire otu egwu ahụ.
Ka ọ dị ugbua, Premier League ekwuola na Roman Abramovich, onye nwe Chelsea etozughi ịbụ onye nhazi otu egwu ahụ, ka gọọmentị mba UK tụkwasịchara mmachi n'isi ya.
Anya niile na-ele ịmata uwe Chelsea ga-eyi agba ya bụ bọọlụ na ihe a ga-ebi na ya, dịka ụlọọrụ 3 bụ ndị na-akwụ ụgwọ uwe ha kwuru na ha ga-akwụsịtu nwa mgbe nta.

Ebe foto si, Getty Images
Hyundai bụkwa ndị aha ha dị n'uwe ha sokwa kwụsịtu nkwekọrịta ha na Chelsea nwere.
Gọọmentị Briten kpachikwara ngwongo niile bụ nke Abramovich (gụnyere Chelsea), nke a kwụsịrị atụmatụ o nweburu ire otu egwu ahụ.
Premier League kwuru na etozughi oke Abramovich "agaghị egbochi otu egwu ahụ ime ọzụzụ nakwa ịgba asọmpi".
Iwepụ onye nwe otu egwuregwu n'ọnọdụ ntozu oke na-ebutekarị orire oke onye nwere - bụ ihe Abramovich chọburu imalite n'abalị abụọ nke ọnwa Maachị o kwuputere mmasị ya ire Chelsea dịka ndị omeiwu bu ụzọ na-ekwu okwu itinye mmachi ndị ha mechara tinye.
Mmachi niile a na-abịa n'ihi na gọọmentị mba Briten na-enyo Abramovich dịka onye nwere ike iso na ndị na-akwado mwakpo Russia wakporo Ukraine.
Etu ọ kwụ n'etiti Chelsea na Newcastle:
Chelsea ji pọịntị 56 nọrọ n'ogogo atọ na tebulu Premier League, ebe Newcastle United ji pọịntị 31 nọrọ n'ogogo 14.
Chelsea meriri ugboro asatọ n'ime iri ikpeazụ ha zutere Newcastle.
Naanị otu ugboro ka Newcastle meriri Chelsea n'ime ugboro 27 ha zutere na Stamford Bridge (nke bụ n'ọnwa Mee 2012).










