'Armed Forces Remembrance Day' 2022: Lee etu Naijiria si kwanyere ndịagha ugwu pụrụiche taa

Ebe foto si, Hope Uzodinma
Taa bụ ụbọchị ncheta ndịagha na Naịjirịa, bụ nke a na-eme n'ụbọchị iri na ise nke ọnwa Jenụwarị afọ ọbụla.
A na-eme emume a iji kwanyere ndịagha ugwu, ma ndị dị ndụ ma ndị nwụrụ anwụ, ndị lụrụ agha ụwa nke mbụ na nke abụọ nakwa ndị lụrụ agha Biafra.
Kwa afọ, taa bụ ụbọchị 15 nke ọnwa Jenụwarị na-abụ ụbọchị ezumike. N'oge mbụ, dịka mba Briten chibụrụ ala Naịjirịa a ma eme ụbọchị ncheta a n'ụbọchị 11 nke ọnwa Nọvemba e ji cheta ngwụcha agha ụwa nke mbụ.
Mana ugbua ehighariri ya ka ọ bụrụ ụbọchị 15 kwa ọnwa Jenụwarị, dịka Naịjirịa ji ya echeta ma kwanyere ndị agha lara mmụọ na ndị ka dị ndụ lụrụ agha ahụ.
Lee ka o si aga n'akụkụ Naịjịrịa dị ịche ịche:

Ebe foto si, Bashir Ahmed/Twitter
N'Abuja
Dịka Abuja bụ isiobodo Naịjịrịa, Onyeisiala Muhammadu Buhari awụchịela na ọdọ egwuregwu nke National Arcade, Eagle Square, Abuja ebe o so mee mmemme nkwanye ugwu nye ndị agha Naịjirịa. O zipụrụ ndị agha izi agba mume ma tịe ha aka n'obi maka ọrụ ha na-arụ.

Ebe foto si, Bashir Ahmed/Twitter
Onyeisiala Buhari gara n'ihu kwee nkwa ikwado ha, ma donyere ha ukwu n'ọrụ nchekwa ha na-arụ dịka nchekwa na-echere Naịjirịa aka mgba ugbua.

N'Ebonyi Steeti
Ndị agha Naịjirịa na-eme usoro ngaghari pụrụiche dịka hi yi ejiji agha pụrụiche ma kpọpụta ndị egwu ha i ji kwenyere ndị nke ha ugwu.
Gọvanọ Steeti ahụ bụ David Umahi werere ọnọdụ n'oche ọrụ ya n'ebe a na-eme emume bụ ọdọ egwuregwu nke Unity Square, Abakalili, Ebonyi Steeti.
O zipụtara ndị agha ozi iti aka n'obi ma gba ha ume maka ọrụ ha na-arụ na ichekwa ala Naịjirịa ugbua.
O gara n'ihu kwee nkwa ikwado etu ọbụla ha si chọọ n'ọrụ nchekwa ha na-arụ na steeti ahụ nakwa na gburugburu Naijirịa niile.


Ebe foto si, Louis Amoke
N'Enugu Steeti
Dịka e mere emume ncheta ndịgha n'ama egwuregwu nke Okpara Square, Enugu steeti, gọọmentị Enugu nakwa ndịagha Naịjirịa mara ụzọ n'isi ụtụtụ ebe elekere asaa mee ya bụ emume iji hụ na ha kwadoro nchekwa maka ọrịa Covid-19 ma hapụ ịkpọkọta ọtụtụ ndị mmadụ.

Gọvanọ steeti ahụ bụ Ifeanyi Ugwuanyi wuchiri ebe ahụ ma nye gbaa ndịagha ume. Ozi ya bụ ozi ekele na ozi nkwanye ugwu pụrụiche nye ndị agha.
O tikwara ndị nwunye ndịagha nọ ebe aka n'obi ma nye ha onyinye ekele pụrụcihe.

Ebe foto si, Hope Uzodinma
N'Imo Steeti
Gọvanọ Hope Uzodinma kwanyere ndịagha Naijiria ugwu pụrụiche taa n'ọdọ egwuregwu nke Heroes Square dị n'isi obodo steetị ahụ bụ Owerre.
Ozi ya tiri agha aka n'obi dịka o kwuru na ọrụ ọma ha bụ ihe weghachitere udo na steeti ahụ ebe ọtụtụ ọgbaghara na ogbugbu ndị mmadụ mere n'afọ 2021.

Ebe foto si, MirrorPix
Gịnị bụ Agha Biafra?
Agha Biafra nke a na-akpọkwa agha Naijiria na Bịafra malitere n'ụbọchị isii nke ọnwa Julaị n'afọ 1967 ma bịe n'ụbọchị iri na ise nke ọnwa Jenụarị 1970.
Agha a dapụtara n'etiti gọọmenti Naijiria na ndị agha mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ebe akpọrọ Biafra n'oge ahụ.
N'afọ 1967, akụkụ Ọnwụwa Anyawụ Naịjirịọ́ (ebe kpọrọ onwe ha Biafra) malịtere chọwa nwereonwe n'aka mba Naịjirịa dịka ha kwuru na ala Naịjirịa na-emekpa ha ahụ ma na-emegbu ha.
Dịka akwụkwọ ihe mere n'oge gara aga si kwuo dere,
Ihe ndị butere ya bụ agha gụnyere okwu ịkpọ oke agbụrụ (nke ekwuru dị n'etiti ndị ọnwụwa anyawụ Naịjirịa na ndị Ukwu oge ahụ),
okwu esomekwu dị n'etiti okpukperechi kraịstị na ndị alakụba, nweghara ọchịchị mere n'afọ 1966 nke ekwuru na ndị agha ndị Igbo kpara nkata ya,
okwu ọzụzọ mmanụ agbadị na ihe ndị ọzọ so ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
Dịka agha si dapụta ndị agha Biafra nke ọchịagha Odumegwu Ojukwu bụ onyeisi ha mgbe ahụ na ndị agha Naịjirịa nke ọchịagha Yakubu Gowon bụ onyeisi ha mgbe ahụ luru ya bụ agha ruo afọ atọ.
Taa bụ ụbọchị 15 n'afọ 1970 bụ ụbọchị agha biri dịka ndị Biafra na ndị Naịjirịa nwere nkwekọrịta na ekweghi onye meriri ma kpee udo ịbịkọ dị ka otu mba.










