You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Prominent Igbo deaths in 2021: Chike Akunyili, Ndubuisi Kanu, Ada Jesus na ndị Igbo a ma ama nwụrụ na 2021
Ebe ụfọdụ na-asị "afọ gbarakwa aka laa", ụfọdụ ndị ọzọ nọ n'iru uju ndị nke ha so afọ 2021 a laa mmụọ.
N'ime ndị so afọ 2021 laa, ụfọdụ n'ime ha bụ ndị a ma ama ọnwụ ha metụtara ma ndị abụghị ndị ezinụlọ maọbụ agbataobi ha.
Ọnwụ ndị ahụ wuru ewu na Naịjiria, ọkachasị n'Ala Igbo.
Lee mmadụ ole a ma ama nwụrụ n'afọ a:
Chike Akunyili:
Ọkammụta Chike Akunyili (di Dora Akunyili nwụrụ anwụ) zutere ọnwụ ya n'aka ndị ekperima wakporo ụgbọala ya ma gbuo ya n'ụbọchị Tuzde, abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Septemba afọ 2021.
O si emume e hibere maka ncheta ndụ nwunye ya na-alọta mgbe ndị omekome ahụ zutere ya n'Ọnịcha, Anambara steeti.
Akunyili bụ onye Agulu, n'Anambra Steeti, bụ dọkịnta na-agwọ ọtụtụ ndị mmadụ ọrịa (ụfọdụ ka ọ gwọrọ n'efu) mgbe ọ dị ndụ.
Ọnwụ ya wutere ọtụtụ ndị mmadụ na Naịjiria, nke bụ na Onyeisiala Muhammadu Buhari so na ndị zigarala ezinaụlọ ya ozi iti aka n'obi.
Ọ dị afọ 72 mgbe ọ nwụrụ.
Ndubisi Kanu
Ọchịagha Ndubuisi Kanu nwụrụ ka ọ rịaturu obere ọrịa, n'ụbọchị iri na atọ nke ọnwa Jenụwarị 2021.
Ọ chịburu Imo steeti na Legọs steeti n'oge ọchịchị ndị agha.
Ọ dị afọ 78 mgbe ọ nwụrụ.
Ada Jesus:
Mercy Mmesoma Obi a ma dịka Ada Jesus nwụrụ dịka ọ rịachara ọrịa akịrị, n'abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Epreelụ 2021.
Obi bụbu ọkpaọchị tupu ọ rịawa ọrịa butere ọnwụ ya, wuru na soshal midia n'ihi okwu dị n'etiti ya na onye ụkọchukwu Chukwuemeka Ohanaemere e ji Odumeje mara nakwa Rita Edochie bụ onye ejije Nollywood.
Ọ dị naanị afọ 23 mgbe ọ nwụrụ.
Victoria Aguiyi-Ironsi:
Victoria Aguiyi-Ironsi nwụrụ n'abalị iri abụọ na atọ nke ọnwa Ọgọst, 2021.
Ọ bụ nwunye onye agha mbụ chịrị Naịjirịa bụ Johnson Aguiyi-Ironsi.
Ọ bụ ya bụ onye mbụ nọ n'ọnọdụ dịka "First Lady" nke abụọ na Naịjirịa.
Ọ gaara agba afọ 98 ma ọ bụrụ na ọ dị ndụ ruo abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Nọvemba 2021.
Lady Adanma Okpara
Adanma Okpara nwụrụ n'abalị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Ọgọstụ, 2021.
Ọ bụ nwunye aka chịbụrụ Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa bụ Michael Iheonukara Okpara.
Odoziakụ Okpara bụ nwaanyi ajadụ kemgbe afọ 1984 di ya nwụrụ.
Ọ dị afọ 96 mgbe ọ nwụrụ.
Ernest Asuzu:
Ernest Asuzu nwụrụ n'abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Jenụwarị 2021 ka kubiri daa ma ghara ibilite ọzọ.
Ọ nọ na-arịabu ọrịa, mana ọ gbakere tupu ọdachi a emee.
Ọ bụ onye na-eme ejije Nollywood, otiegwu, onye na-emepụta ihe nkiri nakwa onye a na-ekiri n'onyonyo tupu ọ nwụọ.
Ọ dị afọ 50 mgbe ọ nwụrụ.
Bruno Iwuoha:
Bruno Obinna Iwuoha nwụrụ ka ọ rịachara ọrịa, n'abalị iri nke ọnwa Epreelụ 2021.
Ọ rịara ọrịa shuga mgbe ọ dị ndụ.
Ọ bụ ome ejije a ma ama na Nollywood, o ritere ihe nrite gụnyere 'Best Supporting Actor' nke ndị Africa Movie Academy Awards (AMAA) nyere ya maka ejije Sins of the Flesh, n'afọ 2007.
Ọ dị afọ 68 mgbe ọ nwụrụ.
Dan Nkoloagu:
Dan Nkoloagu nwụrụ n'abalị iri abụọ na abụo nke ọnwa Jenụwarị 2021.
Ọ bụ onye e ji ime ejije dịka ichie nakwa dibia, mara na Nollywood.
Ọ dị afọ 83 mgbe ọ nwụrụ.
Jim Lawson Maduike:
Jim Lawson Maduike nwụrụ n'abalị iri itoolu nke ọnwa Jenụwarị afọ 2021, ka o kwuputechara maka ahụ mgbu.
Ọ bụ onye ejije Nollywood e ji ime onye ichie, Igwe maọbụ ide ji ego mara.
Ọ dị afọ 69 mgbe ọ nwụrụ.
Charity Maduka:
Charity Maduka nwụrụ n'abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Nọvemba 2021, rịachara obere ọrịa.
Ọ bụ nwunye otu okeosisi Ala Igbo bụ Cosmas Maduka e ji Coscharis mara.
Tupu ọ nwụọ, ọ bụ osote onyeisi ụlọọrụ Coscharis bụ ụlọọrụ ya na di ya so hibe.
Ọ dị afọ 63 mgbe ọ nwụrụ.
Grace Ifeoma Adichie:
Chimamanda Adichie/Instagram
Grace Adichie bụ nne mụrụ odeakwụkwọ a ma ama bụ Chimamanda Adichie nwụrụ n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Maachị.
Ọ dị afọ 78 mgbe ọ nwụrụ.
Ossy Prestige:
Ossy Chinedu Prestige nwụrụ n'abalị asatọ nke ọnwa Febrụwarị 2021.
Ọ bụ onye nnọchiteanya Aba Nọt na Saụt nke Abịa steeti n'ụlọomeiwu nta, ebe ọ nọ na-ọchịchị agba nke abụọ ya tupu ọ nwụọ.
Ọ dị afọ 56 mgbe ọ nwụrụ.
Stanley Okoro:
Stanley Okoro nwụrụ n'abalị iri na otu nke ọnwa Ọgọst, 2021 ka ọ rịachara ọrịa obere oge.
Ọ bụ onye na-eme ihe ejije na Nollywood tupu ọ nwụọ.
Ọ dị naanị afọ 29 mgbe ọ nwụrụ.
Doris Chima:
Doris Chima nwụrụ n'abalị iri na isii nke ọnwa Ọgọst 2021, ka ọ rịachara ọrịa kansa.
Dịka aka ochie ọ bụ, o so na ndị hibere otu jịkọrọ ndị ejije bụ "Actors Guild of Nigeria (AGN)", ma bụrụkwa osote onyeisi AGN nke Legọs steeti.
E nwere mgbe o wuru ewu dịka otiegwu, mgbe o so mee asọmpi ndị na-agụ egwu nke ndị ụlọntaakụkọ Nigerian Television Authority (NTA) haziri n'afọ 1991.
Ọ dị afọ 63 mgbe ọ nwụrụ.
Sam Obiago:
Sam Obiago, nwụrụ ka ọ rịaturu obere ahụ, n'abalị iri abụọ na atọ nke ọnwa Disemba 2021.
Ọ bụ onye Nollywood na-emekarị ejije ebe ọ bụ eze maọbụ onye ichie, tupu ọ nwụọ.
Tupu ọ nwụọ, ọ bụ onyeisioche otu jikọrọ ndị na-ede ejije Bekee kpọrọ 'Screen Writers Guild of Nigeria (SWGN)'.
Ify Onwuemene
Ifeyinwa Tessy Onwuemene e ji Ify mara nwụrụ n'ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Mee 2021, ka ọ rịachara ọrịa kansa a kpọrọ 'endometrial cancer'.
Ọ bụ onye ejije na Nollywood; e si n'ejije a kpọrọ 'Everyday People', ebe ọ bụ nwunye Sam Loco Efe, mara ya.
Ọ gaara agba afọ 62 taa bụ abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Disemba, 2021.
Rich Oganiru
Rich Oganiru nwụchara ka ọ rịchara ọrịa ogologo oge, n'abalị iri nke ọnwa Ọgọst 2021.
Tupu ọ nwụọ, ọ rịara ọrịa mere ka ọ rịọ ndị mmadụ ka a gbatara ya ọsọ enyemaka na soshial midia.
Ọ bụ onye ejije na Nollywood tupu ọ nwụọ.