Chike Akunyili: Lee etu akwamozu di Dora Akunyili si aga

Akwamozu di Dora Akunyili bụ Dkta Chike Akunyili na-aga n'ihu n'obodo ya bụ Agulu n'Anambara Steeti.

Ọ bụ n'ụbọchị 28 nke ọnwa Sepụtemba ka ndị omekome ji egbe gbagburu Dkta Akunyili na onye uweojii nakwa onye enyemaka ya na Nkpor.

Dkta Akunyili si emume ebe e nyere nwunye ya bụ Dora Akunyili nturuugo n'Ọnicha ala oge e gburu ya.

A ga-eli ya na be ya n'Agulu ma e mechaa akwamozu ya.

Lee foto ndị si n'emume ahụ pụta: