Dr Chike Akunyili: 'Ọ bụrụ na IPOB chọrọ iweta udo n'ala Igbo, ha kwasaa ESN' - FCC Jones Onwuasoanya

Onyeisi nchereoge nke ngalaba ndị ntorobịa Ohaneze Ndigbo bụ Onwuasoanya FCC Jones akpọkuola ndị IPOB ka ha kwasaa ESN.

FCC Jones kpọrọ oku a na mkparịtaụka BBC Igbo na ụfọdụ ndị ntorobịa Igbo nwere gbasara ọnọdụ enweghị nchekwa n'ala Igbo.

Na mkparịtaụka a nke e nwere n'ịntaneetị n'ụbọchị Tọzde, ha kwukwara na ndị niile aka ha dị n'ogbugbu mmadụ n'ala Igbo, ala ga-akụgbu ha.

Lee ihe ụfọdụ n'ime ha kwuru:

Kwasaanụ ESN ka udo wee chịa n'ala Igbo - Onwuasoanya FCC Jones

FCC Jones Onwuasoanya kwuru na ihe a na-ebe ugbua n'ala Igbo bụkwa ndị Igbo jia aka ha eme ya onwe ha.

O kwuru na ọ baghị uru ịtụ aka na-ekwu na ọ bụ ndị Fulani, maọbụ ndị DSS na-egbu ndị mmadụ.

Ọ gara n'ihu bụọ ndị niile aka ha dị n'ogbugbu mmadụ n'ala Igbo ọnụ, ma kwuo n'ala Igbo ga-akụgbu ha.

Iji kwụsị oke ogbugbu a n'ala Igbo, FCC Jones kpọrọ ndị IPOB oku ka ha kwasaa otu nche ha bụ 'Eastern Security Network'.

O kwuru sị: "Ọ bụrụ na akwasaghị ESN, o gosiri na IPOB ka bụkwa otu na-eyi ndụ egwu."

"Ha kwasaa ESN ma sonyere otu nchekwa Ebube Agu nke ndị gọvanọ ala Igbo kwadoro."

Ndị be anyị bi ofesi so awụnye mmanụ n'ọkụ n'ewu n'Ala Igbo- Charles Ogbu

Charles Ogbu kwuru na ụfọdụ ndị ntorobia Igbo nọ Ala Bekee so amụnye ọkụ n'ala Igbo site n'ihe ha na-ede na soshal midia.

Ọ rụtụrụ aka na ọ bụ ndị Igbo na-ebute ọgbaghara n'ala Igbo ugbua.

"Onye sị na ọ bụghị ndị be anyị bụ ndị achọghị ka anyị gwa onwe anyị eziokwu."

Ọ tụrụ arịrị na ọtụtụ ndị mmmadụ gụnyere ndị ndọọndọọ ọchịchị ekweghị ekwu okwu n'ihe na-eme n'ala Igbo n'ihi na ha chọrọ ka ahụ han'anya.

Charles Ogbu dụrụ ndị ntorobia ọdụ sị, "Ihe obula ị na-etinye na soshal midia, etinyela tigbuo zogbuo."

Ọ kọwara na ọ bụ ndị Igbo ka ụdị ihe a ga-aka metụta, n'ihi na ndị niile nwere ụlọọrụ n'ala Igbo ga-eburu ụlọọrụ ha pụọ n'ala Igbo.

Ogbu kwuru sị: "Ọ bụ eziokwu na ndị ọchịchị anyị anaghị emeta ọfụma, mana ọ gaghị abụ ihe anyị ga-eji gbuo onwe anyị.

Ihe na-eme si n'aka ndị ọchịchị - Paul Achalla

"Ihe mbụ bụ na e nweghị ọchịchị n'Ala Igbo."

"Onye ekwughị ihe adịghị mma, ndị ọchịchị akpọ onye ha."

"Ihe na-eme na-eme n'ala Igbo adịghị mma, mana o si n' aka ndị ọchịchị."

Mana gbasara ọnwụ Dkt Chike Akunyili, Paul Achalla kwuru na "onye ọbụla aka ya dị n'ọnwụ Chike Akunyili ọ gaghị adịrị ya mma."

Achalla kọwara Akunyili dịka ọchịagha n'oge a lụrụ agha Biafra, ma kwuo na ọnwụ ya bụ nnukwu ihe mwute.

'Community policing' bu ihe ga-ebi okwu nsogbu nchekwa-Ijele

Ofoegbu bụ onye e ji Ijele mara kwuru na ndị ọchịchị anaghị eme ihe ha kwesịrị ime.

O kwuru na ihe ga-egbo ọgụ n'ala Igbo bụ obodo niile nọ n'ọwụwa anyanwụ ihibe otu nche ga-ana-echekwa obodo ha.

Ijele kwukwara na ọ bụ ndị otu IPOB bụ isi a hụrụ kwaba okpu n'ọnọdụ enweghị nchekwa n'ala Igbo.

Ọ gara n'ihu kwuo na ụdị ọnọdụ a ga-eme ka ndị mmadụ ghara ịlọta ụlọ ekeresimesi nke afọ a.

Nke a ga-emetụtakwa ọnọdụ azụmahịa, nakwa ọnọdụ akụnụba nke mpaghara ala Igbo.