Chike Akunyili: Lee etu akwamozu di Dora Akunyili si aga
Nkọwa foto, A ga-eli Dkt Akunyili na be ya n'AguluAkwamozu di Dora Akunyili bụ Dkta Chike Akunyili na-aga n'ihu n'obodo ya bụ Agulu n'Anambara Steeti.
Ọ bụ n'ụbọchị 28 nke ọnwa Sepụtemba ka ndị omekome ji egbe gbagburu Dkta Akunyili na onye uweojii nakwa onye enyemaka ya na Nkpor.
Dkta Akunyili si emume ebe e nyere nwunye ya bụ Dora Akunyili nturuugo n'Ọnicha ala oge e gburu ya.
A ga-eli ya na be ya n'Agulu ma e mechaa akwamozu ya.
Lee foto ndị si n'emume ahụ pụta:
Nkọwa foto, Ọ bụ n'ụbọchị 29 nke ọnwa Sepụtemba ka e gburu Dkt Akunyili na NkpọrNkọwa foto, E bu ozu DKt Akunyili gaa be nna ya iji kwanyere ya ugwu ikpeazụNkọwa foto, Ozu Dkt Akunyili na be nna yaNkọwa foto, Dkt Akunyili bụ di Dora Akunyili bụbu onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọgwụ a kpọrọ Nafdac n'ịchafụNkọwa foto, Ọ bụ emechaa nkwanye ugwu ikpeazụ a ka a ga-eli DKt Akunyili na be ya n'AguluNkọwa foto, Onye bụbu gọvanọ Anambara bụ Peter Obi na a sị, Nkechi Akunyili bụ onye tọrọ Chike Akunyili, ndoNkọwa foto, Ụmụ Dkt Akunyili lọtara Naịjirịa maka akwamozu nna haNkọwa foto, Dkt Akunyili bụ onye agha ndi ụka nke Bekee na-akpọ 'Knight' n'ụka KatọlikNkọwa foto, Dkt Chike Akunyili bụ Dọkịta Oyibo na-enyere ndị ogbenye aka maraNkọwa foto, Peter Obi na nwa Dkt Akunyili na-akwamozu yaNkọwa foto, Akamozu AkunyiliNkọwa foto, Akamozu AkunyiliNkọwa foto, Ezinaụlọ Chike Akunyili na-etinye aja n'ili ya dika a na-eli ya na be ya dị n'AguluNkọwa foto, Ụkọchukwu na-ekponye aja n'ili Chike AkunyiliNkọwa foto, Peter Obi na ezinaụlọ Chike AkunyiliNkọwa foto, Ụka ikpeazu n'ili Chike AkunyiliNkọwa foto, Ụmụaka na ụmụ ụmụ Dkt Chike Akunyilu na ndị ụkọchukwu kara ụka ikpeazụ ya