You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Actress Ify Onwuemene: Ihe ị maghị maka onye ihe ejije lara mmụọ
Onye ihe ejije a ma ama bụ Ifeyinwa Onwuemene, bụ onye ama dịka "Ify".
Agbara nwaanyị ahụ a ma maka ihe ejije 'Everyday People', bụ ebe o mere agwa nwunye 'chief' (Sam Loco Efe) nwụrụ site n'ọrịa kansa nke Bekee kpọrọ 'endometrial cancer'.
Onye nhazi ejije bụ Teco Benson bụ onye gbaara BBC ama n'ekwentị.
Ọ sịrị, "Ọ bụ ezie na Ify Onwuemene nwụrụ site n'ọrịa 'endometrial'cancer'."
N'aka nke ọzọ, onyeisi otu Actors Guild of Nigeria bụ Emeka Rollas gwara BBC Igbo na e ziteghịrị ya ozi na Onwuemene nwụrụ.
O kwuru na e nwere ndị na-eme ihe ejije mana ha anọghị n'otu jikọrọ ndị ejije nke pụtara na otu ahụ enweghị ozi ọbụla banyere ha.
N'afọ 2019, Gloria Anozie Young na Dolly Unachukwu bụkwa ndị ihe ejije Nollywood so na ndị gbaara Onwuemene ọnya ego iji nweta ego maka ịkwado ya n'ịgwọ ọrịa kansa.
Onwuemene kwuru na a hụrụ ọrịa ahụ n'ahụ ya n'afọ 2019 a gwọcha ya ọ laa mana o mechara selie isi ọzọ n'afọ 2020.
Ihe i kwesịrị ị ma maka Ify Onwuemena
- Nwa ya nwaanyị nyere ya aka inweta agwa mbụ ya na Nollywood site n'aka onye mmepụta ihe ejije a ma ama bụ Tajudeen Adepetu
- O sonyere n'ihe nkiri 'Everyday People' afọ iri na atọ
- Ọ bụ onye ejighị okpukperechi ya egwu egwu dịka onye ụka Ama Jehovah