Bruno Iwuoha: Ihe ị kwesịrị ịma maka ya

Dịka otu jikọrọ ndị ejije na Naịjiria bụ Actors Guild of Nigeria (AGN) si kwuo n'ozi ha zipuru, Bruno Obinna Iwuoha bụ ome ejije a ma ama anwụọla ka ọ dị afọ 68, ọ rịara ọrịa tupu ọ nwụọ.

Iwuoha nwụrụ n'ụtụtụ ụbọchị Satọde, 10 nke ọnwa Epreelụ 2021, ka ọ rịachara ọrịa shuga.

Ndị otu ya gụnyere Emeka Rollas bụ onyeisi otu AGN, tiri ezinaụlọ ya aka n'obi, dịka o kpekwara ekpere ka chukwu nwee ike ịgba ha ume.

Emeka Rollas gwara BBC Igbo na Iwuoha banyere 'coma' kemgbe izu atọ gara aga, tupu ọ nwụọ; ma kwukwaa na ọnwụ ya na-ewute ha nke ukwuu.

O jikwa ohere a na-akpọku ndị otu ya na Nollywood ka ha gbaa mbọ hụ na ha sonyere n'atụmatụ AGN nwere iji kwado ahụike ndị mmadụ, nke ọ sị ga-eme ka ndị mmadụ nwee ike na-achọpụta ọrịa na-arịa ha tupu ọ bụrụ nnukwu nsogbu.

Rollas kwuru na enweghi mgbe ọbụla o ji ụgwọ ụtụ a na-akwụ dịka ndị otu AGN.

O kwukwara na ọ bụ otu onye na-enyekarị ya bụ Rollas ndụmọdụ dịka onye nna, na-asị ya na ọ ma na ọrụ na-ejukarị ya aka, mana ọ ma na Chukwu ga-enye ya amara ịrụ ya bụ ọrụ.

Ihe ndị ị kwesịrị ịma maka Bruno Iwuoha

  • Iwuoha bụ onye Umunumo Umuanunu dị n'okpuruọchịchị Ehime Mbano nke Imo steeti
  • Ọ hapụrụ nwunye ya na ụmụ isii ha wee gakwuru ndị nna nna ya n'ala mmụọ.
  • O mere ọtụtụ ejije gụnyere 'Magic cap', Sins of the Flesh, Circle of Lives, Fire Dancer nakwa ndị ọzọ.
  • O ritere ihe nrite gụnyere 'Best Supporting Actor' nke ndị Africa Movie Academy Awards (AMAA) nyere ya maka ejije Sins of the Flesh, n'afọ 2007.