Amaka Igwe: Ihe iri ị na-amaghị maka nwaada Igbo a larala mmuọ

    • Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Taa ka Amaka Igwe gaara agba afọ iri ise na asaa, mana ọnwụ ekweghi.

Amaka bụ nwaada Igbo ji eme ọnụ, onye e ji ime ihe nkiri wee mara.

Ọ bụ otu onye n'ime ndị mere ka mmepụta ihe ejije na Naịjirịa kwụrụ chịm dịka ọ dị taa.

Ụlọọrụ 'Google' tinyere onyonyoo Amaka Igwe n'ihu ọba ozi ha na Naịjirịa n'ụbọchị Tọzde iji kwanyere ya ugwu.

Lee ihe ndị pụtara ihe maka ndụ ya bụ agbara nwaanyị:

  • Ezigbo aha ya mgbe ọ nọ n'agbọghọ bụ Uzoamaka Audrey Ene mana aha di ya bụ Charlse Igwe. Ha lụrụ n'afọ 1993
  • Ọ gụrụ akwụkwọ sekọndịrị n'Enugwu wee gaa mahadum na Mahadum Ile-Ife nke e ji 'Obafemi Awolowo University' mara ugbua
  • Tupu ọ malite ide nakwa ịhazi ejije, ọ kụrụ ọkpọ, tụọ bọọlụ nkata ma gbakwaa egwu atịlọgwụ
  • Ọ chọburu ịgụ akwụkwọ ndị ọkaiwu, mana ka o lechara ule 'Jamb', ihe ọ gụziri bụ Nkuzi Okpukperechi (Education/Religious Studies). O mechara gaa Mahadum Ibadan wee nweta nzere 'Masters' na nhazi ọba akwụkwọ (Library and Information Science)
  • O bụ ezigbo onye ụka Kraịstị. Oge ọ na-efe ala nna ya, ọ bụ ode akwụkwọ otu 'Scripture Union'
  • Ọ bụ Amaka Igwe wepụtara ihe ejije 'Rattle Snake' na 'Violated'
  • O mepụtakwara ihe nkiri 'TV' dị icheiche nke gụnyere 'Checkmate' na 'Fuji House of Commotion'
  • N'afọ 2011, o ritere nzere 'Member of The Federal Republic' (MFR) bụ nke a na-enye ndị tozuru etozu na Naịjirịa
  • Ọ nwụrụ n'ihi ọrịa 'asthma' n'afọ 2014
  • Ọ mụrụ ụmụ atọ tupu ọ laa mmụọ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị: