You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Child Abuse: Ndị uweojii enyeghachila nwa a pịara n'ala ndị mụrụ ya
Obere nwatakịrị nwaanyị ahụ dị afọ asatọ bụ Peace Goewan nke nne ya ukwu buliri ka ndị na akụ ọkpọ were kụọ ya ukwu na-ala abụrụla onye ndị uwe ojii nyefere n'aka nne na nna mụrụ ya.
Nna peace bụ Nicodemus Goewan na nwunye bụ Jane kwuru na ọ bụ nwanne ya nwoke bụ Jonathan Goewan ka ya dunyere nwa ya n'ihi nkwa o kwere na ya ga azụ ya n'ụlọakwụkwọ.
Ọ kwara arịrị na mmegbu nwa ya gabigara na-aka nne ya ukwu bụ Amaka Otolehi ma kelee Chukwu na nwa dị ndụ.
Nne nwata ahụ kwuru na ọ bụ ihe isi ike mere ya jiri kponye nwanne di ya nwa ya.
Cheta na ihe onyonyo na-ata anya arụ nke gosiri nwaanyị ebe ọ pịara nwatakịị n'ala wuru na soshal midia izuụka ole ma ole gara aga.
Kọmishọna ndị uweojii n'Enugwu bụ Ahmad Abdulrahman gwara ndị ntaakụkọ nke a ma gosi na ọ hanyela nne na nna nwa ahụ n'aka ha.
Abdulrahman kwuru na ịtụ mgbere nwa ma ọ bụ iji nwa mmadụ mere ohu megidere iwu obodo Naịjirịa.
Ọ dọrọ aka na ntị na onye ọbụla aka ya dị na ya bụ ihe ga-enweta ntaramaahụhụ dịka iwu si dị.
O kwuru na ndị uweojii n'Enugwu akpụpụla nwaanyị ahụ bụ Amaka Otolehi n'ụlọikpe tinyere ndị niile aka ha dị na ya bụ iji ụmụaka eme ohu ma ọ bụ ịtụ mgbere mmadụ.
Ndị uweojii anwụchiela nwaanyị pịara nwaodibọ ya n'ala
Nwaanyị pịara nwaodibo ya isi n'ala akwaala arịrị ma rịọ ka a gbaghara ya.
Nwaanyị ahụ aha ya bụ Amaka Otolehi kwuru na ọ bụ iwe ọkụ tinyere ya n'ọnwụnwa.
Aka ndị uweojii kpaara nwaanyị ahụ oge ihe onyonyoo ebe ọ na-akụ nwata ahụ a kpọrọ 'Peace' ihe gbasara na soshal midia.
Iwe juru ọtụtụ ndị mmadụ afọ oge ya bụ ihe onyonyoo gbasara.
Mana n'ihe onyonyo ọzọ nke gosiri ebe ndị uweojii na-agba nwaanyị ahụ ajụjụ, o kwuru na ya abụghị ajọ mmadụ.
"Mụ na Peace ebiela ihe karịrị afọ abụọ, ọbụghị etu a ka m si emeso ya."
"A hụrụ m ụmụaka n'anya nke ukwu. A na m eme Peace ka nwa m."
"Ọ bụ oke iwe mere m ji kpaa ụdị agwa ahụ. Biko gbagharanụ m."
Kọmịshọna ndị uweojii n'Enugwu steeti bụ Ahmad Abdulrahman, kwuru na ha na-enyocha okwu ahụ ebe ha ga kpụpụ nwaanyị ahụ ụlọikpe ma ha mechaa nke a.
Ọ gara n'ihu kwuo ha ga na-elekọta nwata ahụ ganye oge ha ga-enyefe ya n'aka ụlọrụ gọọmenti.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị: