You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Child abuse: Ihe mere Saụt Afrịka jiri machie ịpịa ụmụaka ụtalị
Akụkọ dị mkpa:
A machiela ịpịa ụmụaka ọtalị na Saụt Afrịka
Ụlọikpe na mba Saụt Afrịka amachiela ịpịa ọtali ma kwụọ na ida ya bụ iwu nwere ike iduga mmadụ mkpọrọ.
Ha kwuru na iwu a bụ iji kwado ikpe ụlọikpe ukwu chabiri n'afọ 2017 banyere nke a.
Iwu a ebutela ọgbaghaara na nkewa n'etiti ndị nne na nna na mba Saụt Afrịka.
Abaribe emeriela n'ụlọikpe ntuliaka
Sịnetọ Enyinnaya Abaribe na-anọchite anya Abia South n'ụlọomeiwu e meriela n'ikpe ntuliaka e kpere n'Umuahia.
O meriri Chris Nkwonta nke APC bụ onye kpọpụrụ ya n'ụlọikpe dịka ọkaikpe Wasiu Animahun si kwupụta.
N'egwuregwu:
Asọmpi Uefa Champion ga-aga n'ihu n'abalị a ebe otu egwuregwu ndị dịka Tottenham, PSG na Real Madrid ga-anwa ike ha.
Man City, Bayern Munich, Juventus na ndị ọzọ ga-eso kwa ha.
Nkeji:
Mụ na Ipob bụ ji na mmaụ:
Onyeisiala Muhamadu Buharị ekposala nzụkọ na-ahụ maka nyocha na nnapụta ihe onwunwe gọómentị nke onye isi ya bụ Okoi Obono-Obla.
Cheta na Onyeisiala machịrị Obono-Obla na ọnwa ọgụstụ maka ebubo nrụrụaka n'ihe gbasara ndekọ na ego.
Minista na-ahụ maka ihe gbasara ọrụ bụ chris Ngige ekwuola na mwakpo ndi IBPO na awakpo ndi ndorọndoro ọchịchị n'ala bekee abụghị maka ya.
O kwuru nkea n'Obosi ma kọwaa na IPOB agaghị awakpo ya maka na ọ chekwara ma nyere ha aka mgbe ọ bụ Gọvanọ Anambra steeti.
Ngige kwuru na ọ bụ onye chiburu Ohaneze Ndigbo bụ Dozie Ikedife hibere IPOB dịka otu na ekwenyeghị na ọgbaaghara.
O kwukwara na mgbe ọ gara mba Amerịka nsonso, na ọ bụ ndi Ipob nabatara ya ma lekọta ya anya.
Onyeisiala Muhamadu Buharị ekposala nzụkọ na-ahụ maka nyocha na nnapụta ihe onwunwe gọọmentị nke onye isi ya bụ Okoi Obono-Obla.
Cheta na Onyeisiala machịrị Obono-Obla na ụbọchị 14 nke ọnwa ọgụstụ maka ebubo nrụrụaka n'ihe gbasara ndekọ na ego.
Ọ bụ onyeisiala Yemi Osinbajo hibere ya bụ nzụko ka ha nyọchapụta nrụrụ aka na ndị na echi ụloọrụ ha eme ihe na ezighi ezi.
N'Ofesi
Ndị otu Taliban ekwuola na ha dị njikere inwe nzụko maka iweta ụdo na mba Afghanistan ma ọ bụrụ na onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ka chọro ka ụdo chia.
Trump na ndị Taliban hibere inwe nzụkọ maka udo nke Trump kagbụrụ mgbe ogbunigwe ndị Taliban gbụru onyeagha Amerịka nsonso a.
N'Egwuregwu
Ndị otu egwu boolu Napoli ji ọkpụ goolu abụo asataghi ma ncha were chụụla ndi Liverpool ebe ndị Valencia jị otu goolu were gosi ndị otu Chelsea na dike dị na mba.
Akụko ga-amasị gị
Ihe nkiri ga-amasi gi ikọ