Economic Advisory Team: Ọ ginịdị ka Soludo ha ga na-arụ?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ka Onyeisiala Muhammadu Buhari hibere otu ga na-agba izu maka akụnaụba obodo Bekee kpọrọ "Economic Advisory Council" (EAC), ọtụtụ mmadụ na-ajụ ihe ga-abụ ọrụ ha.

EAC bụ nchịkọta ndị mmadụ kacha mara maka akụnaụba ga-arụ ọrụ dịka nke otu akpọrọ Economic Management Team (EMT) nke Osote Onyeisiala Yemi Osinbajo nọbụ n'isi ha.

Nhọpụta otu ọhụrụ a mere ka nke Osinbajo bụrụ ihe achọghịzị nke mere eji sị ha "ga-anụ nke ọma".

Dịka gọọmentị siri kwuo, otu ọhụrụ a ga na-ezute Onyeisiala Buhari na ngwụcha ọnwa anọ niile, ma ha ga na-ezute onwe ha ọnwa niile.

Ọkamụta Doyin Salami bu onyeisi otu a ka Dọkịnta Mohammed Sagagi bụ osote ya.

Ọkamụta Ode Ojowu, Ọkamụta Chukwuma Soludo, Dọkịnta Shehu Yahaya na Iyabo Masha bụ ndị sokwa n'otu a.

Kedu ọru otu a?

Ọrụ otu a nke kachasị bụ inye gọọmentị ndụmọdụ maka mbulite akụnaụba Naịjirịa.

Ha ga-enwe ntị Onyeisiala Buhari, nke bụ mgbanwe n'ihe e mere ka ọ malitere ọchịchị n'afọ 2015. Mgbe ahụ, ọ bụ Osote Onyeisiala Osinbajo ka a na-agwa okwu a.

Bashir Ahmad bu otu n'ime ndị na-enyere Buhari aka kọwara mpụtara atụmatụ a na Twitter.

Na Twitter Oby Ezekwesili na-akụrụ ndi a ahọputara aka ma na-enye ha ndụmọdụ ka ha gwa Onyeisiala Buhari ihe ọ si na ọ bụ eziokwu.

Ndị nọ n'otu a

Doyin Salami bụ ọkamụta n'ihe banyere akụnaụba ma bụkwara onye nkuzi na mahadum ojiego achụ ego di na Legọs.

Chukwuma Soludo bụ Ọkamụta n'ihe banyere akụnaụba ma bụbụrụ onyeisi ụlọakụ ọha nke Bekee kpọrọ "Central Bank of Nigeria" site 2004 ruo 2009.

Mohammed Sagagi na-arụ ọrụ metụtara ihe Bekee kpọrọ "Political Economy and Conflict Analysis Manager" na MAFITA. Sagagi bụbụ Ọkamụta na ihe banyere akụnaụba ma rụọ ọrụ dịka onyeisi ụlọọrọ akpọrọ "Jigawa State Investment Promotion Agency (InvestJigawa)".

Bismark Rewane bụ onyeisi ọlụọrụ akpọrọ "Financial Derivatives Company Limited". Ọrụọla ọrụ ihe ruru afọ iri atọ na ngalaba metụtara ụlọakụ, akụnaụba na ego.

Ode Ojowu bụ ọkamụta na ihe banyere akụnaụba ma bụbụrụ onye ndụmọdụ Olusegun Obasanjo site 2004 ruo 2005.

Shehu Yahaya bụ Ọkamụta n'ihe banyere akụnaụba ma bụrụ onyeisi ndị nhazi "Development Bank of Nigeria Plc"

Iyabo Masha bụ onye na-anọchite ngalaba akpọrọ "International Monetary Fund" (IMF) na mba Sierra Leone.

Akụkọ ga-amasị gị