You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nigeria Economy: Gịnị mere o ji ara ahụ ịkwụ ụgwọ ụtụ isi?
Naịjirịa nwereike ịbanye na nsogbu maọbụrụ na o weliteghị ụgwọ ụtụ isi ya dịka gọọmentị si kwuo.
Mmefu ego gọọmentị na ịkwụghachi ego mbite na-arị elu mana ego dị n'akpaego obodo ejirila pasentị 45 ghara iru ihe o kwesiri kemgbe afọ 2015.
N'agbanyeghi nke a, onyeisiala Naịjirịa ebunyela ụlọọrụ na-elekọta ụgwọ ụtụ isi ukpa ekele maka iwulite ọnụ ọgụgụ ndị na-akwụ ụgwọ ụtụ isi kemgbe afọ 2015.
Ndị mmadụ hụrụ ya bụ ihe n'ịntanetị malitere ịjụ ajụjụ ihe mere ya bụ ọnụọgụgụ anaghị egosi n'iwulite ihe ndị dịka agụmakwụkwọ, okporoụzọ nakwa ahụike.
Etu esi enwetakwu ndị ga-akwụ ụgwọ ụtụ isi.
Ngụkọ gọọmentị etiti mere gosiri na nde iri na itoolu kwuru ụgwọ ụtụ isi n'afọ 2018.
Nchọpụta ụlọakụ mbaụwa mere gosiri n'afọ ahụna n'agbanyeghị na ndị ji ego na-arị elu, o rughi pasentị 30 ndị na-akwụ ụgwọ ụtụ isi.
Gọọmentị na-achụ ndị ha chere ji ha ụgwọ ụtụ isi ma anaghị akwụ ya.
N'afọ abụọ gara aga, gọmentị etiti nyere ndị mmadụ ohere n'ọnwa iri n'abụọ ịkwụpụta ụgwọ ụtụ isi ha ji ma kwụọ ya iji gbalahụ nha.
Nchọpụta ụlọakụ mbaụwa kwuru na ọ mịtagaghị mkpụrụ dịka sọsọ pasentị asatọ ka e metụtara n'oge ahụ.
Mana ọtụtụ ndị Naịjirịa anaghị ekwe akwụ ụgwọ ụtụ isi n'ihi na ha chere na a ga-eri ego ahụ kama ịtinye ya n'ebe dị mkpa n'obodo.
Ọnụ mmanụ agbịdị agbadaala
Nsogbu kachasị che gọọmentị Naịjirịa n'ihu bụ ọnụ mmanụ agbịdị na-ada ada nakwa nsogbu akụnaụba obodo mere n'afọ 2016.
Ọnụ mmanụ agbịdị si na dọlla 113 n'afọ 2012 darue dọlla 54 n'afọ 2017.
Naịjirịa bụ mba kachasị arụpụta mmanụ agbịdị n'Afrịka ya mere na n'etiti afọ 2012 na 2014, gọọmetị si ebe ahụ nwete pasentị 57 ego banyere n'akpaego ha. Ọ daruru pasentị 41 n'etiti 2016 na 2018.
Gọọmentị sị na ụgwọ isi akpọrọ VAT na nke ndị ụlọọrụ na-akwụ na-arị elu kemgbe 2015.
Mana otu nchọpụta UN mere n'afọ a gosiri na n'afọ 2018, nkewa n'etiti VAT ya bụ ihe ekwesiri ịnata na ihe anatara na Naịjirịa so na ndị kachasị n'Afrịka.
Naịjirịa na-agbasị mbọ ịchọpụta ụzọ ọhụrụ ha ga-esi nata ụgwọ ụtụ isi dịka azụmahịa ịntaneti. Ha kwuru na ha ga-agwa ụlọakụ niile ịtinye pasentị 5 dịka ụgwọ ụtụ isi n'azụmahịa ịntaneti niile ma na Naịjirịa ma na mba ofesi site na Jenụwarị afọ 2020.
Ọzọ, nchọpụta Mahadum Oxford mere n'afọ a gosiri na ụzọ akụnaụba ndị ọzọ na-arị elu mana iri elu nke ọnụ ahịa emebisiela ya bụ ihe.
Kedụ etu ya na nke mba ndị ọzọ siri ha?
Dịka ụfọdụ ngụkọ si gosi, ọnọdụ ụgwọ ụtụ isi na Naịjirịa so na ndị kachasị dị ala.
Ya bụ ịgụkọ ọnụ ụgwọ ụtụ isi anatara dịka ihe so na akpaego obodo - ya bụ ọnụ ahịa mba ahụ.
N'afọ 2016, ọ bụ pasentị 6 dịka Organisation for Economic Co-operation and Development (OECD) ya bụ ngụkọ akụnaụba obodo dị icheiche si kwuo .
Ya bụ ngụkọ kachasị ọhụrụ enwereike ịnweta.
Na mba Sawụt Afrịka ọ bụ 29%, na Gana 18%, na Ijipt 15% na Kenya 18% ka OECD gosiri.
Ọkara mba ụwa niile bụ 34%.
Ụlọakụ etiti ji usoro dị iche agụkọ ụgwọ ụtụ isi nke n'anaghị agụkọ ụgwọ enyemaka gọọmentị.
Nke a ga-eme na ngụkọ Naịjirịa n'afọ 2016 ka pee mpe - pasentị 3.4.
N'afọ 2017, ọ rịrịelu rue pasentị 4.8 dịka ọnụọgụgụ gọọmentị wepụtara gosiri.
Anyị ahụghị ndekọ nke afọ 2018 mana ọ dị mma ịmata na pasentị 15 bụ ọnọdụ Ụlọakụ mbaụwa wepụtara iji wulite akụnaụba obodo ma wetuo ụbịam.
Kedụ etu e si awụlite ụgwọ ụtụ isi?
Ọtụtụ mba ndị ọzọ ka na-etolite nwere ụgwọ ụtụ isi dị ala ebe ngụkọ ọhụrụ pụtara gosiri na ihe ruru mba 60 erughi pasentị 15 eji agụkọ ya bụ ihe.
Bernadin Akitoby bụ osote onyeisi na IMF kwuru na mba ndị tozuru na-enwekarị ọnọdụ ụgwọ isi ihe ruru pasentị 40.
O kwuru na o nweghi otu ụzọ na-arụ ọrụ a ga-eji wulite ọnọdụ ụgwọ ụtụ isi - mana o nwere ụfọdụ ihe mmụta si n'aka mba ndị merela ya na mbụ.
- usoro doro anya a ga-eji buso akwụghị ụwgọ ụtụ isi agha
- usoro ịkwụ ụgwọ ụtụ isi dị mfe
- ịmanye ụwgọ ụtụ isi n'ahịa niile
- iwụlite ụgwọ ụtụ isi site n'iji teknụzụ ọhụrụ