Ebonyi market closure: Ihe mere e ji mechie ahia Abakpa dị n'Abakiliki

Ahịa Abakpa nke dị n'Abakiliki, isi obodo Ebonyi steeti mechiri nwa mgbe nta ụnyaahụ n'ihi ọgbaaghara.

Ọgbaaghara a bidoro mgbe ndị ọrụ gọọmentị na-anakọ ụtụisi gara ịrụ ọrụ ha.

Akụkọ kwuru na ọgụ suru n'etiti otu onye na-ere ahịa na otu onye ọnakọ ụtụ nke mere ka e gbuo onye na-ere ahịa.

Nke ahụ kpataziri nnukwu nsogbu mere ka ndị uweojii bịa gbalie egbe elu ma gbakwaa anwụrụ anya mmiri.

Mana dịka Emmanuel Uzo - bụ ọnụ na-ekwuru aka na-achi Ebonyị steeti, David Umahi - si gwa BBC Igbo, onweghi onye ọbụla nwụrụ na ọgbaaghara ahụ.

O kwuru na ọtụtụ ndị bi n'Ebonyi steeti anaghị achọ ịkwụ ụgwọ ụtụisi ha na agbanyeghi na ha na-ahụ ihe gọọmentị ji ego ahụ arụpụta.

Ọ kọwakwara na ọ bụ naanị ụnyaahụ ka e mechiri ahịa Abakpa, ma kwukwaa na ahịa ahụ na-azụ ugbua.

Uzo gakwara n'ihu kwuo na e nwere ụzọ ndị ọzọ dị mfe gọọmentị wepụtara ka ndị mmadụ wee kwụọ ụgwọ ụtụisi.

Ha gụnyere ịga n'ụlọọrụ ndị nnakọ ego a kpọrọ "Board of Internal Revenue" na bekee, maọbụ ịga n'ụlọakụ ọbụla dị onye nso.

"Ọ bụrụ na ọhịaa mmadụ ahụ ịga ebe ndị a, gọọmentị ga-enyere onye ahụ aka site na iziga ndị ga-aga n'ụlọ ahịa ya iji nata ya ụtụisi ya."

Mbọ BBC gbara ịjụta ndị uweojii etu ihe si kwụrụ ugbua, amịtaghị mkpụrụ.

Loveth Odah, bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ebonyi, azaghị oku anyị kporo ya n'ekwentị.

Ọ zaghachikwaghị ozi "SMS" anyị zigaara ya.

Uzo kwukwara na gọọmentị arụọla ahịa ọhụrụ bụ ọkacha mma, ebe a chọrọ ka ndị mmadụ kwafee.

Mana ndị ahịa ekweghi ịkwafe n'ahịa ọhụrụ ahụ.

Okwu ahụ ka dị n'ụlọikpe ugbua.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị: