You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Economic Advisory Council: 'Ihe mbụ ha ga-eme bụ ịgwa Buhari ebe ọ dajọrọ - Ezekwesili
Economic Advisory Council: Ugbua ka Buhari biara - Ezekwesili
Oby Ezekwesili etoola onyeisiala Muhammadu Buhari maka ihiwe ngalaba ndị ndụmọdụ nhazi akụnaụba nke ndị ọkachara mara n'okwu akụnaụba so n'ime ya ma rịọ ndị ọ họọ ọrụ ka ha gwa ya eziokwu na "ọ kụdara akụnaụba Naijiria n'afọ anọ gara aga."
Na mbido izu a, Buhari hiwere otu ndụmọdụ ọhụrụ maka akụnaụba a kpọrọ 'Economic Advisory Council' nke onye bụbu onyeisi ụlọakụ etiti bụ Charles Soludo na onyeisi 'Financial Derivatives Co. Ltd' bụ Bismark Rewane, so na ya.
N'okwu o depụtara n'akara 'Twitter' ya, Ezekwesili, kwuru na ọ ga-adị mma ma ndị a ụbụrụ ha na-acha ọkụ Buhari họrọ n'ọrụ "hapụ ikpọ isi ala na ndị otimkpu, gwaa Buhari nke bụ eziokwu nke ọ ga-abụ a gbasoo ya, akụnaụba Naijiria agawa n'ihu".
Ezekwesili, onye rụburu ọrụ dịka onyeisi ngalaba nhazi mmefu ego na gọọmenti a kpọrọ 'Due Proces', kwuru na nhọpụta ọhụrụ a chịkọtara ihe atọ;
1. Ndị ọchịchị kachasị
2. Ndị ọkachamara imeụlọ
3. Nakwa ndị ụburu ha na-achọ ọkụ n'o n'ama, ọnụna ndị ụbụrụ
Ezekwesili gara n'ihu gwa ndị na-ata osote onyeisiala Yemi Osinajo ụta maka etu akụnaụba Naijiria siri kpụọ afọ n'ala na ọbụghị Osibanjo nyụrụ ihe na-esi.
Otu a bụ nke onye bụbu onyeisi ụlọakụ etiti bụ Charles Soludo so na ya ga-anọchi anya otu Economic Management Team nke osote onyeisiala Osinbajo bụbu onyeisioche ya.
Onyeisioche otu a bụ ọkammụta Doyin Salami, ndị ọzọ bụ Mohammed Sagagi osote onyeisioche, Shehu Yahaya, Iyabo Masha, Bismark Rewane, Mohammed Adaya Salisu.
Femi Adesina bụ onye ndụmọdụ pụrụiche Buhari na mgbasaozi sị na ndị a ga-enye onyeisiala ndụmọdụ banyere ime iwu akụnaụba Naịjirịa.
Ndị uweojii anwụchiela mmadụ abụọ
Ndị uweojii na Port Hacourt anwụchiela mmadụ abụọ maka ogbugbu a na-egbu ụmụ agbọghọ n'ụlọ oriri na nkwari na Potakọt.
Na nsonso a, a tọgburu opekatampe ụmụagbọghọ asatọ na ndịda Naịjirịa kemgbe ọnwa Julai.
N'otu aka ahụ ndị uweojii kwukwara na akụkọ ụmụ nwaanyị abụọ ọzọ atọgburu n'ụlọoriri abụghị eziokwu
Ha kwuru nke a dịka ụmụnwaanyị mere ngagharị iwe gbasara oke ogbugbu a na-egbu ụmụ agbọghọbịa n'ụlọoriri n'obodo ahụ.
Ọsọ Saụt Afrịka
Ụgboelu Airpeace kwesiri ịga bulata ụmụ Naịjirịa ọzọ site na mba Saụt Afrịka na mgbede taa bụ Tuzde efenyighizi oge a tụrụ anya n'ihi Saut Afrịka enyeghị ha ikike ifebata.
Mana Onyeisi Airpeace Allen Onyema gwara BBC na ha enwetala ya bụ ikike nakwa na ha ga-aga mba Saut Afrịka nata n'ụbọchị Wenezde.
N'ofesi,
Peter tabichi bụ onye nkuzi Kenya ritere nzere "onye nkuzi ọkaibe na mbaụwa na 2019 " ezutela onyeisiala mba Amerịka bụ Donlald Trump n'obi gọọmentị mba ahụ
Tabichi onye chiri Franciscan Brother' na-eji pasentị iri asatọ n'ụgwọ ọnwa ya akwado ụmụakwụkwọ ya
N'egwuregwu,
Otu ICPC ejichiela akụnaụba Amaju Pinnick na ndị ọrụ NFF ndị ọzọ dịka ha na-enyocha ha maka nrụrụaka
Rasheedat Okoduwa na-ekwuchitere ICPC kwuru a na-enyocha ndị a n'ihi na ihe ndị ha nwere karịrị ụgwọ a na-akwụ ha.
Gee Nkeji ebe a
Gọvanọ Ugwuanyi agbapela okporoụzọ ọhụrụ
Gọvanọ Enugwu Steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi agbapela okporoụzọ si Ikem gawa Eha Amufu nakwa Nkalagu dị n'okpuruọchịchị Isi-Uzo Enugwu steeti.
Okporoụzọ a dị kilomita asatọ na ụma bụ ebe e si a ga n'ụlọọrụ Sịmentị Naịjirịa bụ Nigercem nakwa gawa mpaghara ugwu.
N'ofesi:
Mba Izrel na-eme ntuliaka ha nke ugboro abụọ n'ime ọnwa ise ebe Pati ndị kachasị obere nwereike ikpebi ihe ga-eme.
Onyeisiala ha Benjamin Netanyahu kpọrọ oku ka e me ntuliaka ọzọ makana ọ hụghi ndị ya na ha ga-eso hazie gọọmentị dịka o merichara ntuliaka n'ọnwa Eprel
N'egwurgwu
Asọmpi bọọlụ kachasị na Yurope bụ Uefa Champions League nke afọ 2019/2020 ga-atabiri ọkụ taa n'elekere asatọ nke abalị a.
Cheta na otu egwuregwu Liverpool maburu iko asọmpi a n'afọ gara aga.
Nkeji:
Ihe nkiri: