You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Saudi Arabia attacks: Nigeria ga-erite uru na mbuli ọnụego mmanụ agbịdị
Ala adịghị mma bụ uru ndị nze ka ọ dị ugbua n'okwu banyere mmanụ agbịdị na mbaụwa niile.
Ọnụego mmanụ agbịdị arịala elu nke kachasị ibe n'ime ọnwa anọ n'ihi ogbunigwe a gbara n'ụlọọrụ mmanụ agbidi mba Saụdi Arebia n'ụbọchị Satọde.
Dịka ọ dị ugbua, Saụdi Arebia akọwabeghị nke ọma etu mwakpo a si mee mana ha kwuru na onweghi onye merụrụ ahụ.
Kedụ etu ọ ga-esi metụta Naịjirịa?
Ndị ọkachamara n'okwu akụnaụba na Naịjirịa kwuru na nke a bụ ezi ihe nye Naịjirịa na akụnaụba ya dịka mmanụ agbịdị bụ ụzọ kachasị ha si enwete ego.
Ugo Obi-Chukwu kwuru na nke a ga-emetụta Naịjirịa n'ụzọ dị mma dịka ha ga-etinyekwu ego n'ọnụ mmanụ ha, nke bụ dọla iri isii kwa otu ite mmanụ ugbua
O kwuru na ọzọ bụ Naịjirịa ga-enwe ohere ire ite mmanụ agbịdị karịa ite ole ha na-ere ugbua nke bụ nde abụọ kwa ụbọchị.
Onye ọzọ bụ Chinwe Egwim sị na ihe a mere na Saụdi Arebia nwereike ime ka onụego ite mmanụ rue otu narị dọla ($100/barrel) nke bụ ihe ọma nye Naịjirịa.
N'otu aka ahụ ọkanmụta Boniface Chizea sị na Naịjirịa kwesiri iji ohere a rite ezigbo uru tupu ọnụego mmanụ adaa maka na mbuli a agaghị anọte aka.
Kedụ ihe ọghọm dịrị Naịjirịa?
Ugo Obi-Chukwu sị na dịka ọ dị ugbua ọ na-ara Naịjirịa ahụ ịmịpụta mmanụ agbịdị etu ha kwesiri kwa ụbọchị ka ọfọdụzie ịmịpụta karịa.
Ọzọ bụ na ọnụ ego Naịjirịa na-eji ebubata mmanụ ga-arị elu nke nwereike ibuli ọnụego mmanụ ụgbọala na Naịjirịa.
Ọ gara n'ihu kwuo na Naịjirịa ga-eri nnukwu uru ma ọ bụrụ na ha nwee ike welite aka n'ite mmanụ ole ha na-ere kwa ụbọchị.
Akụkọ ga-amasị gị: